Go Back
Communicating for Change

Document Body Page Navigation Panel

Pages 1--16


Page 1 2
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio
November, 2000

Mmepe
NKANUZU
Ido Aka Na Nti gbasara Nkanuzu 5mins. 6secs. 6
Oburu N'Afrika elehara oru sayensi anya ogaghi erite uru

sii na nkanuzu aputa.

MGBASAOZI
Akwanyerele Ndi isi Edemede Mgbasaozi ugwu maka 12mins. 9secs. 3
oru inye Mgbasaozi ohere Nwere onwe ya
The world press review akwanyerele ndi edemede mgbasaozi niuspepa ato di
na Sierra Leone bu ndi jiri ndu ha chuo aja maka nkwagide nwere onwe nke
oru mgbasaozi na oke ruru mmadu n'ime obodo ha nke ogba-aghara mebisiri.

Ndi oru Atumatu Mgbasaozi ehiwele Pan African Network. 9mins. 8
Ulo oru Mgbasaozi abuo bu okaibe n'uwa dum ehiwele Pan African e-mail
exchange Network ohuru iji kwado oru nwere onwe nke mgbasaosi. Kama nke
ahu ka bu mbido

Worldspace Enyele Ndi oru Mgbasaozi N'ikuku 6mins. 5secs. 5
N'Afrika Usoro ohuru n'oru Nkanuzu
Ulo oru mgbasaozi n'ikuku di n'ala Afrika nwere ikike ugbua igbasaozi gafee
oke o na-agarube nakwa gburugburu ebe enyeburu ha ikike igbasaozi ruo ndi
na ege ha nti n'uwa dum, ekele na agara usoro mgbasaozi oloro ohuru nkanuzu
nke zuru uwa onu.

NDI INYOM
I ghota Onodu ibi umunwanyi ugwu (Editorial) 10mins. 11
Inwere ike ikwufe otu okwu oke? Maa o bughi okwu mekutara ahuike, oke ruru
mmadu na omenala. Na agbanyeghi otutu akuko anyi na anu gbasara FGM, o bu
ihe itunanya n'ihe anyi matagoro enwegbi etu oha ma oli.

Akuko ohuru na-akowa maka ikpa oke na-etiti nwoke na nwanyi. 12mins 8secs. 10
Akuko si n'aka United Nations ka na-ekwu n'onodu ahaghi n'otu di na-etiti ndi
nwoke na ndi nwanyi, ka bu ihe zuru uwa onu.

Umunwanyi Naijiria nwere ebumnuche Maka afo 2003. 10mins. 5
Umunwanyi Naijiria na-akwadosike iji soro na nme-nme nhoputa ndi ochichi oha
na eze ga-eme n'obia n'ihu.

AHUIKE
Ndi omumu ihe gbasara nje na ebute oria akatola nleda anya n'oru ime 7mins. 4
nchoputa di omimi maka ogwu eji agwo oria AIDS
A nuru n'ogbako omumuihe emere na mba Senegal na nso-nso-a katoo idamba
n'oru nchoputa umu ogwu di iche-iche eji aluso oria HIV na AIDS agha n'ala Afrika.

Gburugburu Obibi
MGBARU EBE OBIBI
Akpola oku maka nchekwa iwu ozone 4mins. 7
Otu na-abughi nke govamenti NGO n'aha mkpirisi bekee, akpokuole govamenti
mba Ghana ka o tie iwu ntuziaka maka ikuku ndu n'usoro akporo, the Montreat

Protocol, iji chekwaa ozone Layer. 1
1 Page 2 3
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio November, 2000
IHE MBEREDE
Mmadu iri na asaa ka Mbuzo gburu N'Anambra maa chupu 3mins. 8
Nari Mmadu ato ebe obibi ha
Mbuzo nke oke idemmiri kpatara aburula odachi nye otu obodo di na Naijiria.

NCHEKWA NDU
Ndi Tanzania ga-aluso mgbuji osisi noo n'ime ohia agha ubochi 6mins. 9
mbu n'afo ohuru
Ana atu atumatu ohuru na Tanzania iji kuchigharia osisi noo n'ime ohia mba
ahu e gbutusiri.

Wildlife Service Akwadole Iwu Megidere Ngwuputa Titanium. 6min. 16secs. 12
Ulo oru na-ahu maka nehekwa umuanumanu na osisi di n'ime ohia nke mba
Kenya ekwuputala nkwado ya nye Mkpebi Govamenti mere i ji kwusi ngwuputa
Titanium n'ime obodo kwale.

Ebum N'obi
Site Na-Echiche Nke Nwanyi 6mins. 6secs. 12
Ngalaba ohuru anyi lebara anya n'okwu gbasara onodu gburuburu ebe obibi na
mmepe dika onye siri huu ya. Nwada Owusua dere akuko gbasara igba-akwara.

Nkwekorita...
MGBASAOZI
Atugbariala Ntuala Ohuru Maka Voice of Nigeria 7mins. 6secs. 13
Naijiria na-agbasa ozi n'ikuku na mba ndi ozo di n'uwa site n'inye ya ezi olile
anya na atumatu ohuru.

NCHEKWA UMUIHE DI N'IME OHIA
Sweden Nyere Namibia Onyinye Maka Nchekwa Umuihe Di N'ime Ohia. 3mins. 14
Onye nochite anya Govamenti Sweden na Mba Namibia enyele Onyinye ego
di nari puku Namibian Dolla asaa na puku iri ise i ji kwado oru nchekwa ndu
umuihe di n'ime ohia.

Amawaputala otu Nari na iri Nde Dolla Ise Iji Zoputa Ndu Umuihe 1min. 5secs. 14
Noo Ebe Oke Okpomoku di

AHUIKE
Eyighariala Nnukwu Ogbako Afrikan AIDS N'onwa Dizemba 5mins. 14
Eyigbariziri ime ogbako Afrikan AIDS na Addis Ababa n'ime onwa Dizemba.
Akwadobere ime ya bu ogbako n'onwa okutoba.

OZURUWA
Ogbako Afrika Maka Nlebaghari Anya n'okwu Ntaramahuhu Ndi Mmadu. 1min. 15
Cameroon ga-ele mba ndi ozo obi maka ogbako aga eme ebe ahu i ji lebagharia anya
n'udiri ahuhu ana ata ndi mkporo etu o si emekuta uwa dum.

Ngalaba Umuaka
Mboma na Nwainyinya (the Donkey) 10mins. 7secs. 15
Hippopotamus gosiri Nwainyinya na, onye mmekwuta ihe ka nke ya kachaa afufu

Okwu Mmechi
Jiri mkpuru okwu amamihe Afrika naenweghi nchefu na ilu ncha imutara maka nchekwa 16
ndu mere ihe. 2
2 Page 3 4
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio
November, 2000

Akwayerele ndi isi oru Edemede Mgbasaozi ugwu 12mins. 9secs. maka nwere onwe nke oru mgbasa akuko
The World Press Review akwanyerele ndi isi edemede mgbasaozi Niuspepa ato di na Sierra Leone
ugwu maka iji ndu ha chuo aja n'ihi nwere onwe nke oru mgbasaozi na oke ruru mmadu kemgbe afo itolu ogbaghara di n'obodo ha. Paul Kamara bu edito for Di people, Philip Neville edito nke standard

Times na David Tam –Baryoh edito nke Punch natara onyinye nturu ugo International Editor of the year Award nke United Nations di na New York site n'aka Olara Otunnu, UN Under Secretary
General na onye nnochite anya puru iche maka umuaka ebe ogba aghara di. Otunnu siri na ya
enweghi ike icheta onye kwesiri ka enye onyinye nturugo-a karia mmadu ato a. Ha na obodo ha ahusiele anya etu onu na-enweghi ike ikotawu, maa ndi, nta akuko a juru ndu horo onwu n'ihi

odimma obodo ha gbara ndi mmadu ume ichu-pu ndi agha ahu obi fere azu n'okwa ochichi.
Edito nke World Press Review bu, Alice Chasan hunyerele aka oru ndi nwoke ato ahu. "N'agbanyeghi
onodu ojoo kacha ibe ya nke ha noo n'ime ya, Paul Kamara, Philip Neville na David Tam-Baryoh eleghi anya n'azu ikwudosi ike n'oru ha n'ozo kacha elu.

Ha jiri usoro oru mgbasaozi niile ha mara ji kewaputa onodu usoro ochichi onye kwuo uche ya, usoro iwu obodo ha ma bufee ujo azu iji chota ebumnuche ha. Ha bu akwaa akwuru" Ihe a ka o
kwuru. O bu n'afo 1994 ka Philip Neville malitere Standard Times. Otutu mgbe ka aghochiri ya ma kpochiakwa ya n'ulo itiri. N'afo 1997 ka ya na ndi oru ya zutara mmiri ma, ogakwara n'ihu na-mbiputa
akwukwo niuspepa ya. Neville mechara si obodo ya gbaga oso ndu na mba ozo. Mgbe akpohachiri onyeisi ochichi mba ahu bu, Ahmed Tejan Kabbah achupuru n'okwa ochichi azu n'afo
1998, ka Neville loghachitere obodo ya. Ndi RUF nupuru isi n'ochchi Kabbah mechara buso isi
ochichi obodo ahu bu Free Town agha. Ha gbara mbo igbari ulo oru standard Times n'ihi akuko ona-agabsa megide aka oru ndi nnupuisi a. Ha gbara ulo oru akuko niuspepa ahu oku ma gbukwaa

onye edemede akuko ulo oru ahu bu, Paul Mansaray, ha metochara nwunye ya ma gbukwaa ya na umu ha. Nke a mere ka Neville gbaa oso ndu gbagaa mba ozo ma lohachite na Sierra Leone n'afo
1999.
Paul Kamara, onye nke enweghi ike iga nme-nme ahu nwere otutu mgbe achoro igbu ya ma tuo ya ikoli n'ihi oru nta akuko ya.. Ha chechiri ya n'uzo, ndi agha-a obi ha dika nkume gbara ya egbe
n'afo 1996 nke mere ka o nwee otutu mgbu okachasi n'ukwu ya. N'afo 1997 ka o si mba ozo ebe ogara gwo onwe ya lota.

O bukwa n'ime afo ahu ka akwaturu ochichi onye kwuo uche ya oha hoputara, o jiri nwayo mechie ulo oru ya ka ndi agha AFRC hara ijide ya. Ha turu ogbunigwe n'ulo oru ya. Ndi nnupuisi nochikoro
ebe obibi ya.
David Tam-Baryoh hiwere ulo oru Punch Niuspepa n'afo 1996. Oteghi aka ndi agha AFRC govamenti na ndi RUF nupuruisi n'ochichi mba ahu amalite icho uzo ha ga-esi gbuo ya. Ka ha kpochichiara ya
ugboro ato, ha kpuru ya gaa zuo. Mgbe ana achoghari ndi nta akuko ma na egbukwa ha n'ihi edemede ha gbasara etu agha si aga, o gbapuru mba ozo. O buru uzo gbaga Guinea Mechaa gbaga
Ghana. Mgbe o na-anara onyinye a, Tam-Baryoh siri na ya ji aha ndi nta akuko iri na ise nwuru
n'ogba-aghara dara na Sierra Leone ndi nnupuisi n'ochichi govamenti gburu mmadu itolu n'ime ha, ato nwuru n'ulo itiri govamenti, otu onye ka akwugburu akwugbu tinyere ndi nta akuko ozo si mba

di iche-iche n'uwa anara ihe onyinye-a. N'okwu na-emutu n'obi okwuru gbasara uzo nsogbu a siri mekuta ya dika onye nta akuko, site n'ihe o jiri anya ya huu nke mekutara ndi nta akuko ibe ya, Tam- 3
3 Page 4 5
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio November, 2000
Baryoh siri na, o were ya otutu mmasi obi ike tupu ya enwee ike ide ihe gbasara mmekorita ozo. Kemgbe afo iri ka odewere akuko gbasara agha "n'akoghari akuko ahuhu ahu kwa mgbe kwa mgbe".
Ofoduru ihe ntakiri ka o chefuo etu esi ede akuko ndi ozo ma o bughi akuko agha: "Gwa m dee akuko gbasara aku na uba, a di m ka onye furuefu," bu ihe o jiri egwuregwu kwuo.

The World Press Review Magazinu na-enye ndi oru edemede akuko na anoghi n'U. S onyinye nkwanyere ugwu kwa afo maka igba ezigbo mbo, igba-ume na ibu onye ndu n'uzo o ga-eweta nwere
onwe nke oru mgbasaozi, ibulite onodu oke ruru onye na ime ka aka oru ndi mgbasaozi buru kpoo na igba. Umu Afrika etunyere abuba ugo-a mgbe gara aga gunyere Dapo Olorunyomi nwamala
Naijiria oge o bu Edito nisupepa The News in Lagoosi. Onye ozo bu Fred M'membe nke The Post in Zambia. O bu n'afo 1995 ka enyere ha mmadu abuo onyinye a. O bu Stanley Foundation nke
Muscatine, lowa na-ebiputa Magazinu a na New York kwa onwa obula. Magazinu-a na-elekwasi
anya n'okwu udo, nwere onwe na ikpe ziriezi site na mgbasa akuko na nkuzi ihe.

Ndi omumuihe Gbasara umunje n'ebute oria Akatola Idamba 7mins. n'oru ime nchoputa maka ogwu eji agwo oria AIDS
Onyeisi nke otu West and Central Afrikan AIDS Research Network, Okanmuta Souleymane Mboup
nke mba Senegal katoro nleda anya nke ana eleda oru nchoputa ogwu eji aluso HIV na AIDS ogu n'Afrika. Onu ogugu mmadu ruru nde iri abuo na ano na uma ato ka oria AIDS ji aka n'Afrika.

Onyeisi omumuihe gbasara umunje ndi ahu na-ebute oria, gwara ndi biara ogbako omumuihe mkpuru ubochi ato ahu, mgbe ana emepe ogbako ahu emere maka ndi nchoputa ihe omimi gbasara AIDS si
mba iri na ano di n'odaanyanwu Afrika bu nke emere na Dakar na, o siri ike inweta otu Percent n'ime
ego niile amawaputara eji egbochie oria AIDS dika ego eji eme nchoputa ogwu ogbugba maka mgbochi oria AIDS.

Mboup, onye amara dika otu n'ime ndi Sayensi na-achoghi mmekorita udiri HIV abuo na mbu, bu nke gbara kasaa na mpaghara odaanyanwa Afrika na India kwara ariri maka mgbanyere azu nke ulo
oru ndi ahu kwuru onwe ha gbanyerele mbo niile ana agba iji choputa ogwu aga agba mmadu o wee gbochie ya ibute oria AIDS. O siri na, ihe butere agaghi n'ihu-a bu na, ndi Sayensi achoputabeghi
ogwu bu igba iji egbochi oria AIDS, abia n'udiri nje na ndi nke dika ya na-ebute oria n'Afrika. Ka osiladi, enwere ihe kariri uzo ogwu iri abuo eji egbochi oria AIDS nke ana enyocha onodu ha ugbua.
Aga eweputa ihe achoputara maka ha n'usoro nke mbu tupu otu afo agaa.
Banyere ogwu akporo anti retrovirals, o nyele aka benata onwu an anwu site n'oria AIDS ihe dika otu uzo n'uzo ato n'ime mba mepere emepe na mpaghara ugwu. Mboup siri na ogwu a di uko

n'Afrika n'ihi oke onu ahia o na-ada na-agbata puku U. S. Dolla iri na puku U. S. Dolla iri na ise iji gwoo otu onye oria ji kwa afo.

O nabatara nkwekorita nke ulo oru ise amara nke oma maka mmeputa ogwu mere, iji budata onu ego ha na-ere ogwu ha ala maka mba ndi a dara ogbenye. O kelere U. S. Rockfeller Foundation
wetara ego eji hazie ogbako omumuihe-a ekele maka mmasi o nwere iji muta ihe site n'aka ndi nchoputa ihe di omimi otutu uzo na mpahara Afrika iweputa atumatu o ji adabata na, ngalaba oru
HIV na AIDS n'ala Afrika. Minista okwu oru ahuike di n'aka na Senegal bu, Abdou Fall, n'ozi ya, kpoputara ubiam na aghara dika umuihe na-akwalite mfesa HIV na AIDS. Minista-a gwara mba
obula ka ha choputa uzo ha ga esi kpochapu onodu ojoo chere aku na uba na odimma umu mmadu aka mgba n'ihu. O kporo Senegal na Uganda aha dika mba nwere usoro mgbochi oria AIDS putara
ighe. Fall siri na ekwesiri itinyekwu uchu na mbo niile ana agba iji kpochapu oria a n'ogo obula
n'ime mba niile di n'Afrika. Pan African News Agency. 4
4 Page 5 6
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio
November, 2000

Worldspace Enyele Ndi Mgbasaozi N'ikuku Usoro 6mins. 5secs. Nkanuzu Ohuru
Ndi Mgbasaozi n'ikuku nweziri ike ugbua igbasaozi gafee ebe ha na-agbasaru ozi mbu nakwa okirikiri ebe ndi na-ege ha nti noo n'uwa dum, ekele diri usoro mgbasaozi nkanuzu ohuru nke otu ulo oru di
n'Afrika akporo Worldspace Corporation meputara, nke esi n'ikuku enweta kpom kwem.
Dika onye Director of Technical Operations nke ulo oru ahu Daniel Obam siri kwuo, Worldspace bu usoro mgbasaozi mbu n'ikuku ana enweta n'otutu ebe otu mgbe. Emere ya maka mba Afrika site na
mbido nani n'ime obodo ka mgbasaozi Redio na-agarube. O gwara PANA Wednesday na, ebu mba Afrika n'uche wee meputa Worldspace n'ihi onodu ino n'ishi na enweghi ngwa oloro ohuru eji
enyere ndu aka n'ala Afrika. "O masi gi gwuo ala biri n'ime ya I ga-enwetarila ozi site n'ikuku ma gi gbanye Redio n'ulo oru nke ichoro ige nti na ya, anyi di njikere ime ka oha obodo Afrika banye
puku afo abuo na otu na abia n'ihu dika ndi mepere anya" ' bu ihe Obam kwuru.
Ulo oru-a bu nke Noah Samora hiwere n'afo 1990 dika Afrispace ga-eleba anya na nsogbu mekutara
Afrika okachasi oria HIV na AIDS. Ulo oru a na agbasazi-ozi n'ikuku ugbua n'usoro mgbasaozi ana enweta ebe obula otu mgbe nke obuladi ime-ime obodo na-enweta na-agbanyeghi usutu ebe

obodo ahu noo.
Mgbe o na-akowa etu ngwa nkanuzu ahu si aru oru, Obam siri na, usoro ohuru a ji nke ndi bekee
n'akpo global satellite audio agbasaozi n'ikuku n'uzo nke ya, ebe eji ngwa akporo digital format, tinyere mobile audio, narrow-band video na Multi-Media enweta ozi site na obere ulo oru mgbasaozi

di n'ime obodo.
Obam gwara ulo oru Redio di na mpaghara obodo na nke govmenti etiti nke mba obula, ka ha soro
usoro nkanuzu oloro ohuru ji gbasaa ozi gafee oke ha na-agarube iji nweta kwuo ndi na-ege ha nti: Obam mere ka anyi mata na, enweghi otutu nsogbu di n'usoro mgbasaozi di n'oge a ana agbasa ozi

gburugburu uwa. "Nke a ga-enye Afrika ohere ima mba ndi ozo n'uwa aka n'ihu n'uzo kwesiri ekwesi n'ihi na mgbasaozi bu ike", nke a bu ihe okwuru. Ihe omume ana akpo Afristar nke na-agazu
mba Afrika niile, enyele ndi na ege nti ohere inweta uzo ulo oru Redio iri ano na abuo n'Afrika mgbe
obula emere ya. O na-abawanye uzo abuo ma o bu ugboro ato ma atuta ya site n'ulo oru Redio di na Benin, Egypt (Egyptian radio and television Union), Ghana, Kenya, Senegal, na South Africa. Ebe

ozo ana atuta ya bu n'Australia China, France, Germany, Indonesia, Singapore, na U. K. Pan African New Agency.

Ebumnuche Ndi Inyom Naijiria Maka Afo 2003 10mins. N' onwa Seputemba abali iri na ano ruo abali iri na ise nke afo 2000, otu akporo Community Partners
for Development (CPD) n'aha mkpirisi bekee haziri ogbako omumuihe mkpuru ubochi abuo maka umunwanyi ntinye aka n'okwu ndoro-ndoro ochichi n'ala Naijiria. Ogbuko-a bu nke emere maka
nkwado nme-nme ntuliaka oha na eze ga-eme n'afo 2003.
Isi okwu enyere ogbako omumihe a bu Women Agenda 2003. Otutu mmadu biara ogbako a gunyere, ndi isi oru govamenti, ndi ndoro-ndoro ochichi, ndi ulo. Oru obaego, umunwanyi ndi o ji
ego acho ego, ndi ntaakuko, ndi okaiwu na ndi nnochite anya ulo oru kwuru onwe ha.
Onyeisi ochichi otu CPD bu Nwada Ime Essien Udom siri na, ihe ejiri maka ya kpoo ogbako-a bu, iji gbaa umunwanyi ume itinyekwu uchu n'okwu ndoro-ndoro ochichi na inoo onodu n'okwa ukwu. 5
5 Page 6 7
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio November, 2000
Otu n'ime ihe gbara okpurukpu emere n'ogbako ahu bu ilere unyunyo ahu akporo. Against the odds. O bu ulo oru Communicating for Change meputara ihe ngosi ahu dika otu ihe ngosi Televishon
ji atule nke bu eziokwu gbasara imaka n'ihu chere umunwanyi aka mgba n'okwu ndoro-ndoro ochichi.

Umunwanyi ndi ji okwa oru ndoro-ndoro ochichi ugbua n'ulo oru govamenti etiti na nke steti kowara ihe ha ghotara dika ndi oru ndoro-ndoro ochichi noo na-etiti ebe ndi nwoke nochiri onodu niile. Otu
onye n'ime umunwanyi ndi ahu bu, Ichie (oriaku) Josephine Anenih, onye ndu umunwanyi otu ndoro-ndoro ochichi People Democratic Party (PDP) n'ala anyi kowara etu okwu siri anaghi adabara
ya na ndi nwoke nke otu-a. O bu ihe mgbagwojuanya ihu na, umunwanyi ibe ya bu ndi kachaa aru ya abaa n'okwu. Oriaku Anenih duru ndi nwanyi odu ka ha tinyekwuo aka n'oru ndoro-ndoro ochichi,
ma hara ichere ka akpo ha oku tupu ha abanye n'otu ndoro-ndoro ochichi. O choputara na umunwanyi
ga-agbasi mbo ike ugboro ato ebe ndi nwoke gbara otu ugboro iji nweta ihe ha choro, nke a agaghi eme ka ike gwu ha wee ruo mgbe ha nwetara ihe ha na-acho. Ichie (oriaku). Nkechi Nwaogwu nke

otu ndoro-ndoro ochichi All Peoples Party (APP) bu onye kowara nsogbu ndoro-ndoro ochichi na-ebutere ndi na eme ya dika, igbu mmadu n' uzo nzuzuo na onye noo n' otu ozo itupuru onye na
anoghi n'otu nke ya aka onwu.
Ndi gara ogbako omumuihe a nyere ochichi noo ugbua ekele maka oru o nyere umunwanyi n'okwa di mkpa n'ogo govamenti etiti na nke steti. Onodu ndi nwanyi n'okwa ochichi ugbua gosiri na, ha
abawanyele n'oru ochichi obodo site n'inwe ndi nwanyi abuo ji okwa minista ukwu, ano ji okwa minista nta, ato bu Senator, iri na ise noo n'ulo nzuko omeiwu nta ala anyi site n'ime steti iri ato na
isii enwere n'ala anyi, ebe opere mpe aga enwetarila otu nwanyi ji okwa Kimishona n'ime Steti obula. Na agbanyeghi na onu ogugu enwere ugbua na agba ume, otutu mmadu kwenyere na o ka
pere mpe. N'okwu o gwara ndi biara ogbako ahu, Minista nta n'ulo oru n'ahu maka odimma ndi inyom na ntolite umuntorobia Naijiria bu, Dokita Bekky Igwe, kwuru na, otutu umunwanyi esoghi
mee nme-nme ejiri hoputa ndi ochichi emere n'ala anyi n'afo 1998/ 99. Oduru ndi nwanyi odu ka ha
jiri ohere a usoro ochichi onye kwuo uche ya nyere ha mee ihe ga eweputa ha ighe. Onye ozo kwuru okwu n'ogbako ahu bu, Dokita Reuben Abati; onye nta akuko. O siri na ndi oru nta akuko nyere aka

imegide umunwanyi site n'iko akuko banyere ha. O duru otu umunwanyi di iche-iche odu ka ha nwee ike ijikota aka onu ha na ulo oru mgbasa ozi noo ebe dum maa nwee mmekorita na-etiti ha na
ndi oru nta akuko umunwoke na umunwanyi. O gwakwara ndi nwanyi ka ha kawa ahu na-abanye
n'otu ndoro-ndoro ochichi n'oge karia ichere mgbe oge gachara. Okwuru na ndi nwanyi ga na etinye aka n'oru ndi okaiwu na ndota oke ruru onye.

Na ngwucha ogbako mkpuru ubochi abuo a, ndi gara ogbako ahu kpebiri usoro di iche-iche aga eji mee ka onu ogugu umunwanyi ga-eso mee nme-nme na-abia n'ihu nke mmadu niile ga-eji hoputa
ndi ochichi bawanye. Ufodu usoro a gunyere izu nwata nwanyi n'akwukwo n'oge, umunwanyi ichikota umunwanyi ibe ha na ikuziri ndi nwoke na ezinulo ha ka ha kwadoro umunwanyi nwere
mmasi n'okwu ndoro-ndoro ochichi. CFC

Ido Aka na Nti Banyere Nkanuzu Oloro Ohuru 5mins. 6secs. Afrika o gaghi erite uru nkanuzu na-eweta? Otu ogbako mkparita uka emere na mba South Afrika
na nso-nso a gbasara erimeri nkanuzu oloro ohuru, kwuputara na-aga eweputa usoro eji echekwa erimeri. Usoro ndi ahu ga-adaba na-atumatu sayensi, ha ga-abu usoro putara ighe maa nwekwa ike
igbanwe agbanwe. 6
6 Page 7 8
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio
November, 2000

Atumatu nkanuzu ohuru a akporo Biotechnology n'aha bekee nwere ike ime ka aka oru ndi oru ubi bawanye n'iko ugbo na nchekwa erimeri, Kama, ufodu ndi oru sayensi noo n'Afrika adola aka na nti
ka ndi na-emejuputa atumatu-a kpachapu anya nke oma n'oru ha.
Biotechnology bu usoro omumuihe sayensi gbasara ndu iji wulite ihe di iche-iche site na nchikota otutu ihe mmuta mekutara iji ihe di ndu eme ntule. Ogwu ndi ahu emeputara nwere ike idimma
n'oru itumgbere ahia. Ihe ndi ahu gunyere usoro esi enweta ihe site n'ahu nne na naa fee na nwa nke
ihe o nwetara na-egogiputa ihe di iche n'ikpe azu. Ufodu usoro amara karichaa bu, Odinala gbasara ihe di n'ime onu ahu, mkpokota na-enweghi etu nke oke na nwunye siri mekorita na usoro iji mmiri

ogwu gbanwe onodu ihe erimeri, ntikota umuihe nwere ndu ana ejighi anya nkiti ahuru, na itife nwa ebu n'afo site n'usoro nkanuzu a, oke
na-nwunye emeghi nmeko muta nwa. Ejikwa Biotechnology emeputa ogwu mgbochi oria osisi ndi
ahu na eto ngwa-ngwa.

Ndi sayensi gara ogbako mkparita uka maka "Food Biotechnology: nke bu eziokwu na odinihu" emere na Midrand, South Afrika, bu nke Africabio, otu na-enweghi ihe jikotara ya na govamenti
haziri, ruturu aka na mkpa o di i nwe usoro nchekwa ndu n'ogo mba niile, Ndi sayensi a kpebiri
n'usoro nchekwa ndu na-aru ezigbo oru nwere, atumatu nke mekutara odimma ndi mmadu, usoro ntughari echiche na nzahachi okwu. Ebe o bu na otutu mba n'ala Afrika amalitebeghi ,usoro bio-safety-

a, ogbako mkparita uka-a kwekoritara na atumatu a ga aga n'usoro sayensi, uzo kwuruoto na inwe ike mgbanwe. O di mkpa ka e nwee ntukwasi obi ebe ndi n'aru oru-a noo. Mgbe o na agwa ndi
biara ogbako a okwu, Dokita John Kilama onyeisi nke Global Biodiversity Institute di na U. S. siri
na, "Afrika ga esorila n'oru nleba anya nke biotechnology n'ihi obughi n'ogaghi enweta uru si n'oru nkanuzu aputa" .

Newslink Africa

Akpom Oku Maka Nchekwa Iwu ikuku ndu (Ozone) 4mins.
Otu akporo Friends of the Earth (FOE), Ghana na otu jikotara ndi oru ntuoyi, National Association for Refrigeration and Air Conditioning Workshop Owners NARWOA n'aha nikpirisi bekee akpokuole

govamenti ka o tie iwu ga elekota ozone anya n'usoro a akporo Montreal Protocol iji chekwaa ozone Layer, N'akwukwo mgbasaozi ha weputara, ha siri na, iwu ndi ahu ga enye ulo oru nchekwa
gburugburu ebe obibi di n'aka ikike imejuputa atumatu mkpochapu umuihe na ebute ikuku rere ure
na mba ahu. FOE siri na ya choputara na, nmasi nke ufodu mmadu nwere iji onodu-a tuo mgbere ahia mere ka itinye okwu-a n'iwu obodo hara inwe isi.

O mere ka anyi mata na edeputalarii iwu ahu kemgbe afo ato gara aga. FOE si na, ndi na-agbachi ndeba iwu-a n'akwukwo iwu obodo kwenyere n'iwu ahu ga-egbochi ha i si mba ozo tubata Fridge
na deep freezer ndi ahu eji goro ruo oru. FOE siri na, govamenti natara ego enyem aka kariri Nari puku Dolla ano na puku dolla iri ise iji ruputa onu ogugu ngwa ahu ga-ezuru ha, ka o wee nwee ike
imejuputa atumatu ahu kama, atumatu ahu kuru afo n'ala kpam-kpam. O wutere NARWOA na govamenti egosiputabeghi njikere o di na ikike o nwere maka ochichi bu nke o ga eji gboo nsgogbu
niile-a na oru diri ya nke ejiri mara Montreal Protocol. Otu abuo-a gwara govamenti ka o ruo oru
kwesiri ya site na mmezighari usoro niile di mkpa ga-enye aka iji deba atumatu-a n'akwukwo iwu. The Montreal Protocol gwara mba na-emepe emepe n'afo 1999 ka ha tinye ihe ndi ahu ha ji eme

ikuku ndu n'ime ntuoyi ebe oga akpukodo ma wedatatu ya wee ruo mgbe o ga agwucha kpam-kpam n'afo 2010 .
Accra Mail 7
7 Page 8 9
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio November, 2000
Mbuzo Gburu Mmadu iri na Asaa N'Anambra chupu Nari 3mins. Mmadu ato N'ulo Obibi ha
Mmadu iri na asaa nwuru pii ebe ihe ruru nari mmadu ato ka Mbuzo chupuru n'ulo obibi ha n'otu obodo di na Naijiria. O bu oke ikiti mmiri ozuzo na ide-mmiri rugidere ebe ndi mmadu bi butere oke
odachi ahu. Mbuzo a kpara mkpa-mkpa n'ime obodo Amakor, Nanka di n'okpuru ochichi obodo Orumba North nke Anambra Steti. Mmiri ozuzo a sakoro otutu ulo buru ha buba n'oke olulu. E
wezuga ndu mmadu lara n'iyi, nji-nji a mebikwara otutu ngwaulo onu ego ha di otutu nde Naira,
dika onye kansulo n'achi Nanka Ward II di n'okpuru ochichi obodo Orumba North, Maazi Peter Adakah siri kowaa. Maazi Adakah, mgbe o na egosi onyeisi ochichi okpuru ime obodo ahu bu, iche

Hyacinth Onwuchekwe ebe niile odachi a dara kwara ariri n'ihi oke nsogbu ajo idemmiri buterele ndi bi ebe ahu. O kowara ka onodu ndi mmadu bi ebe ahu si emetu ya n'obi. O riro onyeisi okpuru
ochichi obodo ahu ka o mee ka govamenti etiti na nke Steti tinyere otu mba uwa di iche-iche na-emepuru
onye ona-ara mata nsogbu dakwasiri ndi mmadu bi ebe ahu, iji gbatara ha oso enye m aka ngwa-ngwa. Kansulo-a chetara na, oteele anya kemgbe umuamala Nanka jiri tiwe mkpu gbasara

nsogbu nke ide-mmiri na ebuso ebe obibi ha. Ogbara ya anya gharii ihe mere ochichi niile gara aga n'ala anyi jiri enweghi ihe ha mere maka nsogbu-a. Komishona n'ahu maka owuwu ulo na gburugburu
ebe obibi n'Anambra steti bu, ichie Nkwo Nnabuchi agbaala ama gbasara nji-nji na-eji na steti-a n'ihi
idemmiri. O kwupatra nke a oge ona agwa ndi nta akuko okwu, oririo govamenti etiti ka o gbatara steti ya oso enyem aka ozugbo, n'ihi na steti-a enweghi ego ga-ezuru ya iji luso nsogbu a ogu.

All Africa Com.

Ndi Oru Mgbasaozi Ehiwele Pan-Afrikan Network 9mins.
Ulo oru mgbaozi abuo amara nke oma n'uwa dum, ehiwele ulo oru ohuru akporo Pan-Afrikan e-mail eji ezirita ozi n'uwa iji kwado nwere onwe nke mgbasaozi na iru ulo oru mgbasaozi gbara

mgborogwu kwuru onwe ya n'ala Afrika ubochi Thursday. Otu akporo World Association of Newspapers (WAN) na Reporters Sans Frontieres (RSF) siri na RAP 21 network ohuru a bu nke
izizi ana ahu n'ala Afrika, sitere na-enyem aka nke ndi Central African Union of Press Publishers
ka e jiri hiwe usoro ntukorita oguguisi na mgbasa akuko n'Afrika. Atumatu a mere ka enwee oganihu na udiri atumatu a nke ulo oru Media Institute of Southern Africa (MISA) jiri jikota Nisupepa

na ndi, nta akuko noo na Southern African Development Community. RAP 21, aha French nyere African Press Network maka puku afo abuo na otu, gunyere ndi nta akuko na ndi isi ulo oru
mgbasaozi na-aruru ulo oru mgbasaozi ndi ahu kwuru onwe ha oru nke ga-eweputa usoro njikota
nke mmekorita di na-etiti ha na ndi ha na ha noo n'otu okwa oru ebe obula n'ala Afrika. Okwu a siri na, Network a ga-abu, usoro idi njikere mgbe dum maka nwere onwe nke oru mgbasaozi ibuso mba

ahu agha ma weputa akuko gbasara nhazi oru na ohere maka ozuzu.
Timothy Balding ji okwa onye okwuchaa ogwu nke WAN siri na, "agaghi n'ihu nke enwere maka
mmasi na mkparita uka na-etiti ndi na-ebiputa akwukwo ogugu, ndi edemede akuko na ndi nta akuko n'ala Afrika, aburula oke nsogbu nyee ulo oru mgbasaozi kwuru onwe ha n'Afrika." Onodu-a

ndi mmadu ji abawanye n'iji e-mail na internet onu ego ha di ala aru oru, nwere ike ugbua mee ka enwe njikota na-agaghi agwu-agwu na etiti ulo oru mgbasaozi n'Afrika." Odee akwukwo ukwu
RSF bu, Robert Menard, gbakwunyere na, otu mgbasaozi nwere ike ime ka udo di oge enwere ogba
aghara na ume erughiala nye ndi ochichi n'Afrika site na-enye m aka ndi nta akuko Afrika na oru ndi mgbasaozi. Otu Nari mmadu bu ndi hiwere òtù RAP 21, enyefele òtù a oru nchikota ndi nta akuko

Afrika iji kwalite nwere onwe nke oru mgbasaozi site n'itinye onu ha n'okwu mkpesa o bula. O gakwa ahu maka oru inye ulo oru mgbasaozi n'Afrika onyinye agbamume iji kwanyere ufodu mmadu
ma obu, ulo oru ufodu gbara mbo puru iche n'oru ha maka nwere onwe nke oru mgbasaozi ugwu
kwa afo. Oru ndi ozo puru iche ha ga-aru bu, enyem aka na imasi ndi ntaakuko aturu ikoli na ndi nke 8
8 Page 9 10
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio
November, 2000

ana akpagbu-akpagbu obi ike, ikewaputa usoro mgbasaritaozi gbara ' mgborogwu n'onodu a ulo oru Afrika Nisupepa kwuru onwe ha ji agbanwerita akuko na-etiti onwe ha. Nke a gunyere ime ka
ulo oru mgbasaozi Afrika jikota ulo oru ya na Web sites. Ndi nlekota oru RAP 21 bu, WAN na RSF gakwa enye ndumodu n'oru Tekinikal na atumatu nhazi oru n'ulo oru Afrikan nisupepa niile kwuru
onwe ha, iji mee ka ndi na agu ukwukwo nisupepa bawanye n'onu ogugu, kwalite usoro itumgbere
ahia na mgbasaozi azum ahia, atumatu oru nchikota ego na mgbazi aka oru umu mmadu.

A ga-agba ulo oru nisupepa ume itinye aka n'oru ngo gbasara mmuta na nwulite otu , ebe RAP 21 ga-eweputa usoro mgbasaozi site na mmepe ulo oru di iche-iche maka Afrikan Press iji Weputa
atmatu ga-enye aka wulite oru mgbasaozi n'Afrika. Ndi ga-aga ogbako RAP 21 ga-anata ikike ibu
onye otu –a site na izigara onye nchikota ogbako ahu bu, Gamal Niang e-mail rap 21 e Wan asso. Fr African Eye News Service (South Africa).

Ndi Tanzania Ga-Aluso Mkpochapu osisi N'ime ohia ogu, 6mins. ubochi Mbu N'afo ohuru
Tanzania na-atuputa atumatu ohuru iji kuchigharia osisi n'ime ohia di na mba ahu ndi owaa osisi gbudasiri n'uzo na-ezighi ezi . Govamenti Tanzania amawaputala ubochi mbu n'ime onwa Jenuwari,
2001 dika ubochi akuku mkpuru osisi na mba ahu dum-National Tree Planting Day. Aturu anya na nwamala Tanzania obula ga aku osisi na iru oru ga-enye aka inweghachite onodu oke ohia na mba
ahu ubochi a akara-aka.
Minista n'ahu maka aku chukwu nyere mba ahu na onodu ebe ihe nkiri ndi njem bu, Zakia Meghji siri na, onyeisi ochichi mba ahu bu Benjamin Mkapa enyele ikike ikwuputa ubochi ahu makotara n'ubochi
mbu nke afo ohuru dika ubochi ana atu anya ya. Oke ohia di na Tanzania na-ekpochapu n'otu ntabi anya n'ihi itu mgbere ahia osisi n'uzo na-ezighiezi n'iwu obodo. Nku osisi ka bu uzo kacha mma
mba ahu si enweta okpomoku, usoro a kariri uzo itolu n'ime uzo iri ekere usoro mba Tanzania si enweta okpomoku. Igba ohia oku kwa mgbe nke ndi oru ugbo ji acho isucha ala ubi otu mgbe na-ebutekwara
ohia di na mba ahu nsogbu. Dika Meghji siri kwuo, ihe ga-agbanwe, o kwuru na, atumatu ubochi akuku osisi nke mba Tanzania bu atumatu ohuru govamenti nwere nke gbadoro
ukwu na-akuku osisi. O siri na nme-nme ubochi iku mkpuru osisi ga-akwalite mbo govamenti na-agba
iji mejuputa atumatu akuku osisi na mba ahu bu nke Mkapa turu ntuala ya n'onwa Aprelu. Aturu anya na aga aku osisi onu agugu ha di, otu nari nde n'obodo ahu tupu afo 2000 abia na

ngwucha. Kwa afo ka ihe dika nari puku hectare ato ruo nari puku hectare ano bu ohia na-efunari Tanzania ugbua n'ihi igbujisi osisi aghara-aghara. Mmebi ohia kacha njo n'ime ime obodo ebe ana
ebughari ala ubi kwa afo na ebe izu anumanu hiri udu na ndu umu mmadu. Mpaghara Central na
North-Western nke Mba Tanzania anorolarii n'onodu ojoo nke oke ozara chere ya aka mgba n'ihu.

Meghji siri na, ufodu ebe nsogbu a noo ugbua anaghi ahukwa mmiri ozuzo anya nke mere na ha noo n'oke nsogbu ibuzi ozara ma o buru na-enweghi ihe bara uru emere ozugbo, iji gbochie onodu ojoo
a. Mkapa akowala mkpa iku osisi na nlekota osisi bara dika otu n'ime uzo esi akwalite oru nchekwa
gburugburu ebe obibi. O mara ndi Tanzania aka n'ihu ka ha kuoo osisi n'ala ha. Ndi isiochichi n'otu aka ahu, amakwala otutu ndi gbatara oso ndu na mpahara Western Region nke kigoma, bu ndi jiri

nku-osisi nwee nkwado maka ihe obula ha na-esi dika ndi ha bi n'ala ha, Tanzania sikwa nwee ntukwasi obi ha na nkuosisi maka oku ha ji eme ihe obula kwa ubochi.
Pan African News Agency. 9
9 Page 10 11
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio November, 2000
Akuko ohuru Nke Isiokwu Ya Bu, Ikpa Oke Na'Etiti Nwoke Na Nwanyi 12mins. 8secs. Ahaghi n'otu na-etiti ndi nwoke na ndi nwanyi na-eme ka ndi mmadu, ezinulo, oha obodo na mba
hara imeputacha ihe niile ogugu isi ha tosiri ime. O bu otu United Nations Population Fund (UNFPA) weputara akuko a. mgbe o na-edekota ogo ikpa oke a rugoro n'onodu onu ogugu mmadu dum
n'uwa maka afo 2000, noo, UNFPA siri na, nkwusi ikpa oke na etiti ndi nwoke na ndi nwanyi bu oke ruru mmadu aga elebara anya puru iche ngwa-ngwa "N'agbanyeghi nnukwu mgbanwe ana enwe
n'ime afo 2000 a, ikpa oke na mmegbu megide ndi inyom na ndi nwanyi ntakiri gbasiri mgborogwu ike n'ime omenala mba. Omenala si n'aka otu aburu ruo aburu ozo aka nwere nkowa gbasara
"nwoke zuru oke na onodu nwanyi, nke ana akuzi n'oke oge, adighi mfe mgbanwe," ka UNFPA
kwuru.

Umuagbo na ndi inyom n'uwa dum ka akuko a siri na, anaghi enye ha ohere agum akwukwu na nlekota ahuike. Otutu n'ime ha na-anata mkpari di egwu na mmegbu, anaghi enye ha oke ruru ha,
anaghi elebara ha anya dika esi elebara ndi nwoke maka onodu ahuike ha. Ohere ruru ha n'ulo oru
anaghi erute ha aka. Ugwo oru ha na epe mpe kara nke ndi nwoke ebe ha na ndi nwoke a ruru otu udiri oru. N'okwu okwuru mgbe ana atuntuala akuko a na London, Dr. Nafis Sadik ji okwu Executive

Director nke UNFPA siri na, "State of the World Population Report" nke afo-a nwere ozi di nwa nkenke. E nwere ike ichikota ozi ahu etu a, "ugwo ikpa oke bu ihe di oke onu ahia ikwu". Sadik
gbakwunyere na, "nke a gosiri na, abia n'ime mba niile n'uwa dum, ahaghi n'otu, ikpa oke na
mmegbu, abughi nani ndi nwanyi ka o na adohachi azu kama o mekutakwara ndi nkoke. Obughi nani' ezinulo kama, oha obodo na mba ahu dum"

Ihe dika pacenti iri mmadu asaa ubiam ji aka bu ndi nwanyi, aturu anya na, n'ime iri afo abuo di n'ihu onu ogugu umunwanyi dara ogbenye n'ime mba iri ano na otu na-emepe-emepe ga eru pacenti iri na
asaa karia nke ndi nwoke. Ndi nwanyi bu itiboribo ji uzo abuo kara ndi nwoke. Ugwo oru ana akwu ndi nwanyi maka oru ha na ndi nwoke ruru jiri uzo ato ma o bu ano peempe kara nke ana akwu ndi
nwoke. Ekee Nari nde ato bu onu ogugu umuaka niile n'uwa na-enweghi ohere agum akwukwo uzo ato, umuagbo di uzo abuo. A gazuo uwa niile, ebe opekariri mpe, otu nwanyi n'ime umunwanyi
ato ka ana aku ajo ihe, manye ha inwe mmekorita nwoke na nwanyi ma o bu, nye ha mkpari di egwu
n'uzo di iche-iche, nke a ka akuko ahu kwuru. O siri na, iji iwe na onuma akpa oke na-etiti ndi nwoke na ndi nwanyi aburula nsogbu na-enweghi ogwugwu nye otutu umuagbo na ndi inyom n'uwa

dum. O gara n'ihu kowaa na, ebe o si ewutekari bu na, ndi na-ebuso umunwanyi agha a, bukari ndi ha na umunwanyi ahu na-eriko ma na anukoritakwa ma o bu, ndi ezinulo ha.

Akuko a siri na, "enweghi uta di maka ntigbu na nzogbu gbara mgborogwu site na ikpa oke nwoke na nwanyi nke na-ezighi ezi n'uche maka oru diri nwoke na nwanyi na mbikorita ha". Akuko a siri
na, ihe omumu emere gburugburu uwa dum, gosiri na o bu otu udiri ihe na-ebute ntigbu-ntigbu na nzogbu-nzogbu mgbe dum. O siri n'ihe ndi ahu bu, "nwanyi erubeghiri di ya isi, nwanyi isa di ya
okwu, ekwetaghi ka ya na di ya nwee mmekorita, enyeghi nwoke nri n'oge, nwanyi elekotaghi
umuaka ya na ezinulo anya nke oma, iju nwoke ajuju gbasara ego ma obu ndi enyi ya nwanyi na, nwanyi ipu ije na anataghi di ya ikike, i ji maatu, nchoputa emere na Ghana gosiri na iri pacenti ano

na ato umu nwoke na ihe dika pacenti iri ise ndi nwanyi siri na, agaghi ata nwoke uta ma otiee nwunye ya ihe, ma o buru na nwunye ya na anu ogwu eji egbochi afo-ime na-emeghi ka di ya mata.
Ihe eweputara site na nchikota nke UN World Health Organisation (WHO) mere n'onwa Juunu afo-a
siri na, ogu di na nwunye were onodu nke iri n'umu ihe di iche iche butere onwu ndi nwanyi noo afo iri na ise ruo afo iri ano na ano n'afo 1998. Akuko nke UNFPA weputara siri na, otu n'ime ndi

nwanyi ano bu afo-ime ka di ha kutara isi-abaokpu mgbe ha bu afo-ime. Na Naijiria umu nwanyi 10
10 Page 11 12
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio
November, 2000

snsogbu a dakwasiri n'uzo di iche-iche ruru pacenti iri ato, onu ogugu ha kariri ihe eji onu ekwu n'Uganda ebe o ruru pacenti iri ise na asaa. Onu ogugu a bu ndi nke emere ka oha na eze mata na-agbanyeghi
na, onu ogugu ndi nwanyi ana amanye-amanye iji dinye ha na-abawanye, anaghi akoputacha otutu mgbe nwoke jiri ike aka ya manye nwanyi ka ha nwee mmeko. N'ihi nsogbu na
akuko ojoo eji nke a ako na enweghi obiebere site n'usoro ikpe-ziriezi mere ka ufodu mmadu hara ime ka onye ozo mata mgbe nsogbu a dakwasiri ha. Akuko a siri na, mkpesa gbasara iji ike enwe
mmekorita nwoke na nwanyi ekwuputara na South Afrika erughi pacenti ato. O bu ihe doro anya na South Afrika bu otu n'ime mba n'uwa dum ebe aru-a na-ari ibe ya elu. E nwere ike I nweta akuko
UNFPA na: http: // www. Untpa. Org/ SNP/ swpmain. htm UN Integrated Regional Information Network

Mmuta Ihe Gbasara Onodu Mgburi Ugwu Ndi Nwanyi (Editorial) 10mins. Otutu mba n'Afrika na Western Asia ka na egbujasi ihe nwanyi jiri buru nwanyi nke ndi bekee n'akpo
Female Genital Multilation (FGM) bu ihe ha n'akpo ibi nwanyi ugwu. Otu nari na nde iri ato bu onu
ogugu umu ntakiri nwanyi na ndi agboo n'uwa dum gabigara ihe ituegwu na mgbu site n'ibi ha ugwu, gbakwunyere nde abuo noo na nsogbu a kwa afo. Ibi nwanyi ugwu bu ihe ana eme n'ime ihe

dika mba iri abuo na asato n'Afrika bu ebe e nwere ihe di iche buru ibu mba na mba gbasara nke a. Mba dika Democratic Republic of the Congo na-ebi pacenti ndi nwanyi ise ugwu ebe mba dika
Somalia na Arabian Peninsula tinyere ndi Gulf Region na-ebi pacenti iri itolu na asato ugwu. Onodu
a dikwa na-etiti ufodu oha obodo pere mpe enwere na Asia nakwa umunwanyi si mba ozo bia biri n'Europe, Canada na United States. Ibi nwanyi ugwu putara, ibepucha ma o bu ibeputu anu ahu di

n'ime ihe nwanyi ji anyu mmamiri. Ndi na ebi ugwu n'uzo kachaa di omimi, na ebepu anu ahu di n'ime na nke tuputaru onu n'ime ihe nwanyi ji anyu mmamiri ma duchikota akuku ahu oghere abuo
a onu. Nke mere ka nwanyi ahu nwezie obere oghere iji nyuo mmamiri na isupu obara mgbe ona-ahu
nso ya. Ibi nwanyi ugwu na-akpata ihe dika pacenti iri na ise n'okwu nwanyi inwe oghere ntakiri ebe o si anyu mmamiri. Ihe dika pacenti iri asato ruo iri itolu ka ana enweta onodu a na Djibouti,

Somalia tinyere Sudan. Usoro ozo esi ebi nwanyi ugwu nke na-adighi enyekari nsoghu bu, ibepucha ma o bu ibepu akuko anu ahu di n'ime ebe nwanyi si anyuputa mmamiri ma obu ibepu anu ahu a di
n'ime na nke tuputara onu. Ihe dika uzo ato ma ekee umuagboo ebiri udiri ugwu a uzo ano ahusiele
anya n'udiri ahuhu a atara ha n'uzo di iche-iche. Onodu ojoo a eji anapu umuntakiri ndi nwanyi na umuagbo oke ruru ha gbakwasiri ukwu n'okwukwe ndi mmadu na, o bu maka ijilata umunwanyi ala

i nwe mmasi nke ukwuu na mmekorita ha na ndi nwoke na, ihu na nwata nwanyi amataghi nwoke tupu o luo di. Omenala ufodu umu nwoke megidere ha ilu nwanyi ana ebighi ugwu. Ha kwenyere
na, nwanyi ahu adighi ocha ya na nwoke inwe mmekorita. Otutu ugwu ana ebi na abukari n'onodu
ebe ruru unyi ka ana anoo eme ya kwa mgbe. O na egbu ajo mgbu ma nwekwa ike butere onye ebiri ya oria ojoo, obi nkupu, ma o bu onwu. O buru na nwata nwanyi ahu adi ndu, o nwere ike ime ka o

nwee mgbu oge obula ya na nwoke na emekorita, onodu-a agaghi enye ya onu na ndu ya niile.
Ibenata mmasi nwanyi n'okwu mmekorita ya na nwoke site n'ibi ugwu na-ebetere ya nsogbu nke
anu ahu na-adighi ike nke mmuo nke a ga egbochi ya inwee afo ojuju site na mmekorita ya na nwoke. Nsogbu ibi nwanyi ugwu na-ebutere ahuike, mkpukota obara nke oghere gara n'ime ihe ahu kaputara

onu ebe nwanyi si anyu mmamiri, oria, adighi ike nyuputa mmamiri etu okwesiri, nsi ibanye n'obara site na ngwa ndi ahu na-adighi ocha eji ebi ugwu. Nsogbu ndi ozo na-aputa n'ikpe azu bukari nke
mmechilaata onu oghere ihe nwanyi ji amuputa nwa na oghere ebe o si anyuputa mmamiri nke na-ebute
oria anyunyu mmariri na-anaghi akwusi-akwusi, oria omumunwa kwamgbe-kwamgbe, mgbu azu na nke ukwu. Nwanyi obula ebiri egwu udiri ndi ike na noo na nnukwu ihe isike mgbe o na-amu

nwa ma o bu inwu onwu oge o na amunwa ya. Mgbe ufodu, ibi nwanyi ugwu nwere ike I mee ka 11
11 Page 12 13
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio November, 2000
nwanyi ahu hara ituru ime. Ihe nchoputa eweputara na Sudan kowara na, umunwanyi ebiri ugwu ka onodu amughi nwa kachaa emetuta karia ndi nke ebighi ugwu. Ihe na-ebute nke a bu oria okpomoku
ukwu nke mbukota mmamiri na mkpukota obara ndi kwesiri igbapu mgbe nwanyi ha-ahu nso ya biaziri kpochie oghere ebe akpa-nwa noo. Dika omenala ufodu mba siri di, onodu nwanyi na amughi
nwa joghuru onwe ya na njo ebe o bu na, ugwu nwanyi nwere n'usoro omenala bu, umu o muru. The Independent (Banjul)

Ulo oru N'ahu Maka Nchekwa Anuohia Na-enye iwu 6mins. 16secs. Megidere igwu Titanium Nkwado
Ulo oru nchekwa umuanumanu bi n'ohia di n'aka na Kenya ma o bu The Kenya Wildlife Service (KWS) ekwuputala nkwado ya nye mkpebi govamenti mere iji kwusi ndi Kwale na-egwuputa Titanium
i gakwa n'ihu n'oru ha. N'okwu ya mgbe o gachara nwa nkenke njem o gara nime obodo Mwatate,
Kighombo dam, di na mpaghara obodo Taveta, onye ji okwa direto n'ulo oru Kenya Wildlife Service, Nehemiah Rotich siri na, igwu aku di n'ime ala nwere ike ibute oke nsogbu ga-emebi gburugburu

ebe obibi. Dr. Rotich siri ha, otu ndi ahu di iche-iche kwuru onwe ha ga-edeputa ma kesaa akwukwo n'akowa ihe nke a ga-ebutere onodu gburugburu ebe obibi tupu oru ngo ahu amalite.

"Dika atumatu iwu gbasara gburugburu ebe obibi siri kwuo, oru ngo obula nke ga-ebutere ndu ndi mmadu nsogbu, kwesiri ka elebara ya anya n'onodu obula", ka Dr. Rotich kwuru "Nke a bu onodu
KSW kwu na ya" "Ekesabeghi akwukwo nchoputa gbasara etu ogwugwu ihe a ga-esi mekuta ndu umummadu nke Tiomin Resources, ulo oru Canada nwere mmasi maka ogwugwu aku-a di n'ime ala
mere nye, otu niile nwere mmasi n'okwu a, tinyere ndi okachamara n'oru nchekwa gburugburu ebe
obibi na ndi ndu ime obodo iji lebera nchoputa a anya. Nkea nwere ike iputa, nghotaghe mmasi nke onye nwere. O kwuru na nke a akpalitele inyo okwu a enyo dika nke na akowaputaghi eziokwu di na

ajo ihe nke a ga-ebutere gburugburu ebe ahu. O siri, "E nwebeghi m ohere ileba anya n'akuko Tiomin weputara gbasara onodu a, e nweghi m ike ikwu kpom kwem ma ihe o dere oziri ezi ma
ozighi, kama o di mkpa ka ndi okachamara n'oru onodu gburugburu ebe obibi kwuru onwe ha na-adighi
mmasi ha nwere n'oru ngo-a mee omumuihe di etua. Iji nani ihe Tiomin choputara kpebie okwu-a ga-abu ihe nkocha. O dika i gwa onye ana ebo ebubo ka oburu onye oka ikpe n'okwu a

mekutara ya" onyesisi ulo oru KWS-a siri na, akowabeghi oru titanium a nke oma nye otu nwere mmasi bara uru tinyere ndi oru nchekwa gburugburu ebe obibi na ndi ndu siri na nke-a emeela ka
ana enyozi ebumnuche ulo oru a enyo. Izu uka abuo gara aga ka cabinet Minista Marsden Madoka
kwuru na govamenti ekpebiele na Ngwuputa aku di n'ime ala ahu agaghi enwe isi ugbua dika atuputara na mbido wee ruo mgbe ahazichara okwu niile na ahio ahuruoku isi. Madoka siri na ya

anabataghi iji ala a gbaziri ego n'aka ulo oru Canada n'ihi na nke ahu ga akpalitekwa nsogbu ebe ahu ndi bi ya nwegororii iwe na onuma n'obi

Okwu Nlebara Anya 'Site A'nya Nke Nwanyi 6mins. 6secs. Mgbe m hura na" nwanne m nwanyi" ejikele, yiri uwe nchabi, nyara ihe olu dika o na-acho igbadaru
ebe ukwu uwe nchabi ahu ruru, akpukpo-ukwu sogoro n'elu, techaa ihu karia ozu edoziri edozi, obi m na agwa m "gaa kporo nwa-agboo ahu" ihe a abughi okwu na-agba ume, ma agaghi m eme ka obi
loo ha mmiri ma o bu duo ha ka ha kwusi aka oru ha horola n'onwe ha ma o bu nke amanyere ha
amanye ruwa. O bu eziokwu n'ufodu aka oru bu ihe amaghi ka esi eme ya na onodu mmadu huru onwe ya kpatarala ya, enwere otutu onodu mmadu na-amaghi etu o ga-esi na ya puta taa n'ala anyi.

Ana m ahu ndi nwanyi na-amaghi uru mmuta bara ha onwe ha, ha anaghi agba ada ha nwanyi ume I ga ulo akwukwo, kama, ha na atunyere nwa ha nwanyi eromero na-ekwesighi inu na nti dika, igwa
ha sii, "gaa ka ihu otu okongwu nwoke nke a ma o bu nke ozo, o na aru n'ulo obaego." Kedu ihe 12
12 Page 13 14
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio
November, 2000

nwa gi nwanyi di afo iri na ise, onye kwusiri agum akwukwo choro n'aka okongwu nwoke nke a ma o bu nke ozo? O ga abu oru ka o na-acho? Oru eji anu ahu na abughi asambodo o bula e nweta? Naka
nke ozo? O buru na nne ya dara oria na-enweghi ngwota, nwa agboo a di afo iri na ise aburula onye na azu ezinulo a nri, o buru na nwata-a ekpebie iga ulo akwukwo odighi uzo o ga-esi nweta ego
ugwo akwukwo ya, n'ihi na nne ya hapuru ulo akwukwo buru nne nwa na-erughi eru, n'ihi nke a, o nweghi oru o na-aru (nke a o bu ezi onodu iji kwuo n'ihe akuko emekwala ka o si eme?) N'agbanyeghi
etu o ga-esi gbaa nti kitikiti, nke bu eziokwu bu na, eziokwu na-elu ilu na nti. Dika m kwuru otu ihe
m ga eme bu, i gba mbo mee ka ha ghota nsogbu di n'oru a ha na-aru, ihe ozo bu, igba mbo huu na enwere ihe m mere gbasara ya. O buru na ha puta n'okporo uzo ma o dighi onye ha nwetara? O dika

ana m aju ndi nwoke anyi otutu ajuju? Etu o siladi, okwu a aputala ighe, n'usoro onye kwuo uche ya, ya masi gi horo isoro na ndi ga-egbochi nsogbu a ma o bu ndi ga-akwa ya oku n'ukwu.
Akasua owusua in the Accra Mail.

Nkwekorita……..
Ehiweghriala Ulo Oru Voice of Naijiria 7mins. 6secs.
Ulo oru Redio Naijiria n'agbasa ozi n'ikuku na mba ozo, Voice of Naijiria abiaghachiele n'onodu ya ozo. Emume otu mkpuru ubochi a emere ubochi onwa Seputemba, 2000 gbara abali iri abuo na otu

na Abuja, isi ochichi ala Naijiria. Otutu mmadu nochitere anya ndi ochichi ala anyi n'ogo di iche-iche tinyere osoje onyeisi ochichi ala anyi bu Alhaji Atiku Abubakar, ndi oru mgbasaozi n'ikuku na. Ndi
guru oke akwukwo biara emume a.
VON weputara akara ohuru ejiri mara ya na uda egwu ohuru eji amata ulo oru a, ntuzi aka ohuru,
atumatu ohuru nke ya na mba ozo n'uwa ji emekorita usoro ihe omume ohuru o na agbasa n'ikuku nakawa onondu katu mma eji enweta ya n'ikuku gburugburu uwa. Onye okwuchaa ogwu nke ulo

oru VON bu, Maazi Taiwo Allimi siri na, atumatu maka VON ohuru bu, iji mee ka onye obula n'uwa dum nwere ezi mmasi maka Naijiria na Afrika were VON dika Redio izizi o ga na ege nti. Ihe ozo o
kwuru gbasara Voice of Naijiria ohuru bu, "i mee ka Naijiria na Afrika puta ighe nke oma n'uzo ziri
ezi site na mgbasaozi anyi, i nweta na imeta ndi na –ege nti mma, nsopuru na afoma nke ndi na ege nti n'uwa dum, okachasi Nigerians and Afrikans in the Diaspora.. Imee ka olu Naijiria daputa nke

oma na mkpukota uwa"
N'afo 1961 ka Voice of Naijiria malitere oru. N'ihi aka oru Naijiria maka odimma ala Afrika mere o jiri di mkpa i nwe usoro aga esi gbasaa ozi banyere onodu Afrika etu uwa niile ga anu ya. Nani hour

abuo kwa ubochi ka o na agbasa ozi n'ikuku n'ime odaanyanwu Afrika. N'afo 1990 ka VON kwurula
nke aka ya. N'afo 1996 ka o malitere mgbasaozi ruo uwa dum. Dika uzo o si agbatikwu aka n'oru ya, VON na ulo oru mgbasaozi dika Redio France International, Voice of America na Germany's

Deutsche Welle Redio ehiwele mmekorita na-etiti ha n'usoro ozuzu ndi oru ha na mgbanwerita ihe omume ana agbasa n'ikuku. VON na Worldspace technology ka na arutari oru iji mee ka onu ogugu
ndi na-enweta ulo oru a n'ikuku n'ala anyi nakwa mba ofesi bawanye etu o ga ekwe ruo Ijeri
mmadu ano na puku nde mmadu isii n'uwa dum.

Maazi Allimi si, "Achoputaram na o di mkpa n'uwa taa na, I ga-abarila na nkwekorita gi na ndi mgbasaozi n'uwa iji nwee ike nweta ihe m kporo nkesa ako n'uche etu oru mgbasaozi kwesiri idi

n'uwa dum. Mgbe m nabatachara nke ahu, abia. m chee na o di mkpa ka m na ndi oru mgbasa ozi n'uwa kparita uka banyere atumatu anyi nke bu na, onodu mgbasaozi anyi ga agbanwe site na mbuli
akuko agha na ogba-agbhara di n'uwa kwalitewezie okwu mmepe na udo n'ime uwa WWF 13
13 Page 14 15
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio November, 2000
Sweden Enyele Namibia Onyinye Maka Nchekwa Onodu Ebe Obibi Ya 3mins. Onye nochite anya ochichi mba Sweden na Namibia bu Gunilla Hesselmark na onye ji okwu Executive
Director n'olu oru Namibia Nature Foundation bu, Chris Brown ebinyele aka n'akwukwo nkwekorita na nso-nso maka oru nchekwa gburugburu ebe obibi nke ego amuwaputara maka ya di, Otu nari nde
na nde US dolla asaa, nari puku US dolla iri isii na asaa. Hesselmark siri na-aga enye ndi Namibia na otu niile nwere mmasi n'oru nchekwa gburugburu ha di n'obi ego a. O siri na, Swedish Local
Environment Fund choro inye ndi bi n'ime obodo ahu ego mmachi akpa iji nyere ha aka n'oru
nchekwa gburugburu ebe ha onwe ha bi site na Wild Life care and development. Onye nochite anya govamenti mba Sweden-a mara ndi mmadu bi n'ime ime obodo ahu aka n'ihu ka ha mmepe oru ngo

nchekwa gburu-gburu ebe obibi nke aka ha nke ga-eme ka ha nwee ulo oru kwuru onwe ya . Hesselmark gara n'ihu kowaa na, ihe ruru, nari puku dolla abuo, puku dolla iri ise na itolu di n'usoro
mkpata na mmefu ego nke afo 2000 ka emefugoro maka oru nchekwa gburugburu na mba Namibia.
N'afo 1999, anatara atumatu oru di iri isii na ise, Namibia Nature Foundation site naka Swedish Embassy nyere onyinye ego iji ruo oru ngo iri na asato ego niile ejiri ruo ha di puku dolla iri itolu,

nari dolla ano, iri dolla ise na itolu. Otu n'ime oru ngo ahu ejiri ego a ruo bu, irubakwu ebe ihe nkiri otu ezinulo di na Wanaheda, Windhoek, Ulo akwukwo ota akara gbasara nchekwa gburugburu ebe
obibi tinyere irulitekwu ubi ebe govamenti kuru osisi di iche-iche-National botanical gardens. Pan African News Agency.

Ego Di Otu Nari Nde Dolla Na iri Ise Ka Amawaputara Iji 1mins. 5secs. Zoo Ndu Umuosisi na Anumanu Noo Ebe Okpomoku Di Ukwuu.
Atuola ntula maka ego ohuru amawapurata di, otu nari nde dolla na iri nde dolla ise iji zoo ndu umu
ihe ndi ahu noo onodu di oke egwu n'uwa n'ime mba na emepe emepe. Nke a bu eromero Conservation International (CI) na world Bank tinyere Global Environment Facility (GEF) jikotara aka wee

tuputa. Aha akporo atumatu oru-a-bu, Critical Ecosystem Partnership Fund (CEPF) ga-agbadokari ukwu n'ihe akporo biodiversity hotspots, Ha bu mpaghara ebe kachasi noro n'ihe ituegwu ebe ihe
dika pacenti iri isii bu udiri anumanu bi n'elu ala na mmiri ana mgbanwe nani n'ihe dika otu pacente
na uma ano gburugburu elu ala. WWF

Oge Akaraka
Eyighariala Ogbako Ukwu Maka Afrikan AIDS Ibuzi Nonwa Dizemba 5mins. Nnukwu ogbako Afrika gara ime maka AIDS na Mmepe eyiburu ime n'Addis Ababa n'ime onwa
okutoba ka eyighariziri n'onwa Dizemba malite na-abali ato ruo abali asaa afo 2000. Amara ya dika Afrikan Development Forum( ADF2000) Isi okwu ya bu "AIDS; Nnukwu ihe ima aka n'ihu nye oru
onye ndu" "Ihe ejiri yigharia ya bu iji nye otutu mmadu si Afrika abia ogbako ahu ohere ibia. O bu onye ji okwa United Nations Economics Commission For Africa (ECA) tinyere aka na nhazi nzuko
a mere ka akuko a ruo anyi nti. Ogbako a nke ECA, UN AIDS, UNDP, UNICEF, World Bank na otu
ndi ozo bu ihe atuputara ntuala ya iji chetagharia oru di maka mbuso HIV na AIDS agha n'Afrika" Ihe dika otu puku na Nari ndi ndu Afrika ise, ndi atumatu usoro iwu, otu di iche-iche tinyere ndi nwere

oria HIV na AIDS na ndi guru oke akwukwo, Ulo oru ndi ahu kwuru onwe ha na Afrika development Partners ka aturu anya na ha ga abiacha. Dika ECA Kwuru, nzuko a ga-elebe anya n'oru gbara
okpurukpu ndi ndu Africa kwesiri iru iji nwee usoro Afrika ga-eji wagide nsogbu-a.
"Usoro ADF2000 ga-agbado ukwu na mbo niile nke mba di iche-iche N'Afrika kwadogoro n'usoro mmepe ha, iji luso HIV na AIDS ogu ma lebakwara ihe obula bu oke ha nwere anya" ihe a ka ulo oru 14
14 Page 15 16
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio
November, 2000

ahu gbakwun-yere. O siri n'ogbako a ga-enye mba Afrika nnukwu ohere iji uru o ritere n'ogbako ukwu uwa emere maka AIDS na Durban, South Africa wulite usoro oru mmepe ya elu. O choro I
nyere ndi Afrika aka n'uzo obula o ji ebuso HIV na AIDS agha i mee ka o muta ihe site na ezigbo atumatu gbasara oria-a na-efesa ebe dum n'ile mba di iche-iche nke o biliworo ima aka n'ihu nwere
oganihu. Pan African News Agency.

Ogbako Mba Afrika Iji Lebagharia anya Na Mgbanwe 1min.
ahuhu ndi noo ulo Mkporo Na-ata.
Ndi Mba Afrika ga-enwe ogbako ha ga-eji tugharia echiche ma nwee mgbanwe n'onodu ntarama

ahuhu ana enye ndi noo n'ulo ikoli. A ga eme ogbako ahu na mba Cameroon malite n'abali iri abuo na ato ruo abali iri abuo na ise nke onwa Novemba 2000. Isi okwu aga atule n'agbako ahu bu, 'Etu
mgbanwe ahuhu ana ata ndi mmadu n'uwa dum si emekuta Afrika" Kpoturu onye nchikota ogbako-a
Mukete Tahle Itoe site na www. geocities. com/ tmukete ma gi ichoo imatakwu ihe gbasara nke-a The Courier

Ngalaba Umuaka
Mboma na Nwainyiya (Donkey) 10mins. 7secs. Otutu afo gara aga, Nwainyinya na Mboma onye ana akpo hipopotamus bu ezigbo enyi. Ha na-erikota
nri otu ebe na igbere mmiri. Otu ubochi, mgbe iyi ahu taturu-ata, Nawainyinya-Donkey tara ahiha gafee akuku mmiri nke ozo di anya wee hu ahihia ndu nke na atupu anya. Tupu Mboma
abiakwute ya n'ututu ahu, Nwainyinya kworo mmiri gafee. Rigide nri ma rijuo afo ya mgbe o loghachiri na mgbede, Mboma lee anya n'afo ukwu ya juo si, 'ebee ka I gara? "Enyim agafere m ofe
mmiri ebe ahihia di uto na-eto! Iga-eso m gaa echi? ' Mboma zara ya "ee, ahapukwala m mgbe I na
aga echi", Mboma na nwainyinya zutere onwe ha n'ututu gafee ofe-mmiri. Nwanyinya duru Mboma odu ka o mata amata na-enwere onye na-eche ihe ndi ahu akuru n'ubi nche ututu na anyasi. "Enyim

meda obi n'ala rie nri', Nwainyinya kwere Mboma nkwa, aga m na-lepu anya, mee mkpotu mgbe obula m huru onye nche ahu. Ozugbo m bere akwa, gbapu n'ubi ahu ngwa-ngwa. Mboma kelere
Nwainyinya maka obioma ya, tara ahiha n'ike n'ike ruo mgbe o nuru akwa nwainyinya. O jiri oke
oso gbapu ebe ahu gbalaa n'igbere mmiri gbafee mmiri ahu gbaba na mmiri ntakiri ebe o na ezo isi onwe ya wee miee n'ala mmiri ahu ahukwaghi ya anya ozo. Ihe a mere ozo echi na nwa nne echi di

n'ihu ruo mgbe Mboma matara na Nwainyinya anoghi ya n'ihu ma o bu n'azu mgbe o na agbara onye nche oso. O meturu ya n'obi na enyi ya ji uzo aghugho ezo otutu nri maka onwe ya, site na ime
ka Mboma riri ntakiri, o tie mkpu iji mee ka ogbapu n'ubi ahu odighi ebe ahuru onye nche, nwainyinya
agbaghi oso obula-oh odighi-nani ya anoro eri etu o siri guo ya. Mboma ekwueghi ihe obula gbasara anya o na ele enyi ya. Ha megidere otu a ruo mgbe mmiri zoro iyi wee too ozo. Ugbua

Nwainyinya enweghi ike igafee mmiri ahu n'ihi na otojuru nke ukwuu ma dikwa omimi na akwo oso-oso ebe o bu na omaghi mmiri egwu, o norozie n'akuku nke ozo. Aguru biaziri na-agusi ya ike,
o bia tawa ahu kwa ubochi n'ihi na enweghi ezigbo ahihia na eto n'akuku mmiri ahu, onaghi atokwa
uto. Ka o di ugbua, Mboma bidoziri buwe ibu n'ihi na ona agafe ofemmiri gaa rijuo afo nke oma 'I ga abiahachite azu n'ubi ahu, Nwainyinya, bu ihe Mboma kwuru 'Lee onwe gi ka ina ata ahu n'ike

n'ike ebe erimeri gbara kasaa ma gi gafee ofemmiri' Nwainyinya maa usu sii, 'A si na m nwere ike, ' 'I maa na amaghi mmiri egwu. Nsogbu adighi bu ihe Mboma kwuru ebe o bu gi bu enyim, agam
akworo gi n'azu gafee mmiri ahu" 15
15 Page 16
Vol. 11 No. 22 (Igbo) CHANGE Radio November, 2000
Nwainyinya arigoro n'azu Mboma, ha amalite igafee mmiri. Njem ha gagidere nke oma ruo na-etiti
mmiri mgbe Mboma kwuru "ebe a di oke ime, ukwu m anaghi erukwa ala ozo" o miee n'ala mmiri ahu kworo nwainyinya n'azu Mboma zoro n'aga n'ihu igafe ala mmiri na akuku nke ozo, ma

nwainyinya enweghi ike igwu mmiri ma o bu jide obi ya aka dika Mboma, o runwuo n'ime mmiri ahu. Ruo taa, nwainyinya na hiippos emezibeghi enyi na enyi di na-etiti ha abuo.

Okwu Mmechi
Were okwu amamihe Afrika i mutara n'ufodu ilu na-enweghi nchefu mere ihe
Maka ugwo oru Onye na-ere aja dika nnu, na-anata okwute dika ego.
Naijiria
Onye wetara isi ya iji tiwaa aki oyibo, enwele olile anya na ya ga-ata aki-oyibo ahu. Naijiaria

Maka ndughe
Onye choro igba ulo ya oku, ga-anata onye iro ya okpasham Zimbabwe

Maka enyi Ihu ochi bu ngwa agha kacha ike n'ogbo ogu ndu.
Ghana More African Proverbs

Okwu ikpeazu gbasara nchekwa ndu,
E nwere esim agugo siri ike nke siri na, Ihe niile ekere eke nwere oke ruru ha ibiri onwe ya ndu eb mmadu na ejighi ya mee ihe…
E nwekwara agugo ozo gbasara mma nke ihe ekere-eke, kama mmechi okwu bu na ma omara mma ma omaghi, ihe obula elereke nwere ikike idi ndu nani inoro ebe o nuu.
Peter Kramer
WWF Conservation Director The New Road, 1988. 16

Page Navigation Panel

1 2 3 4 5 6 7 8 9
10 11 12 13 14 15 16

 

© 2002 Communicating for Change. All Rights Reserved
Developed by George Mbuagbaw