Document Body Page Navigation Panel
NDI INYOM NA UMUAKA
Umu nwanyi Liberia ekwuole na ha agaghi ekweta 5mins. 6secs. 3
isonye na nme mme o bula.
Umunwanyi Liberia ka kwu ebe ha kwu maka nhiwe iwu ga-akwado ha
iketa oke ruru ho.
Onuogugu umuaka di nde iri na otu n'anwu n'hi 5mins. 16secs. 5
oria nwere mgbochi.
Nchikota onu ogu Umuaka n'anwu onwu ike site n'oria n'uwa dum di ka,
ebe atulere ugboelu Boeing 747 buu nani Umuaka na erubeghi afo ise
na-enwe ihe oghom kwa hour obula.
Ndi ndu umunwanyi Afrika n'akaparita uka gbasara ihe ha 11mins. 6
ga-eme maka odimma ha
Na ngwucha ogbako ukwu umunwanyi mba di iche-iche n'uwa mere
'na Zambia. Na nso-nso a, enwere nchekube na ezigbo onodu maka mgbanwe
odimma ndi inyom ga-adi.
AKU NA UBA
Ndi ogbenye noo na etiti anyi 7mins. 5secs. 4
N'agbanyeghi oganihu ana enwe n'onodu ndu ndi mmadu, otu International
Monetary Fund sii na, odighi mfe ime ka uba zuo onye o bula onu n'uwa
mgbe na adighi anyi.
Ulo oru itumgbere ahia nta dika agalaba ji ntolite aku 11mins. 2secs. 10
na uba n'ala Naijiria
Atumatu banyere igba ndi oru itumgbere ahia ume iji nyere ha aka mezigharia
onodu aku na uba Nigeria ga aputa ighe mgbe na adighi anya.
AHUIKE
Zimbabwe ga-amalite nyocha ogwu AIDS 4mins. 3secs. 5
Zimbabwe n'atu anya I mata ogwu ndi ahu na-adaghi oke onu
ahia achoputara maka mbuso oria AIDS agha.
Gburu-Gburu Obibi
MMETO EBE OBIBI
Iji mmiri ogwu aru oru ugbo etu o na ekwesighi na 3mins. 9secs. 4
egbusi umu anumanu
Burkina Faso amachiele iji ogwu akporo Phytosanitary agwo oria
umuanumanu n'ihi otu nari umu amumanu nwuru site na nsi nke
usoro-a butere.
Okpomoku di n'uwa dum na-enye mbikota 5mins. 4secs. 7
onu ajo mmekpa ahu.
Akuko eweputara ohuru-a doro aka na nti kwuo na, okpomoku
n'abawanye n'ime uwa niile, nwere ike ibutere otutu umu anuohia na
osisi di iche-iche onwu.
Ulo oru buu akwaa akwuru maka mmeputa ngwa ahia ga-enye 9mins. 7secs. 11
aka n'oru mgbochi mmeto ebe obibi
United Nations Environment Programme, atuputala usoro o ji awagide
oru mbuso mmeto ebe obibi agha. Akuko enwetara na mbido kowara
na-enweele oganihu buru ibu n'okwu a. 1
1 Page 2 3
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
UNEP awagidele oru ngo gbasara onodu mmeto gburu-gburu ebe 8mins.
2secs. 8
obibi nke ga ewee ya otutu nde dollar
Otu jikotara mba uwa niile, di njkere iwagide oru ngo ga-ewe ya nde
dollar ise iji choputa onodu mmeto gburugburu ebe obibi noo n'akuku
uwa dum.
NCHEKWA NDU
Osisi eji agwo oria foduru obere ka Okpochapu 6mins. 6
Otu osisi di na South Afrika ana akpo Winter Impala Lily noozi onodu
mkpochapu. Nke a ga-ebutere ndi oru nchekwa ndu umu anumanu na
osisi tinyere ndi dibia mkpa akwukwo ebe ahu oke okum ahia.
Egypt n'agbasi mbo ike izoputa Mbekwu ya Noo n'onu onwu. 11mins. 9secs.
9
Otu kwuru onwe ya n'ahu maka nchekwa ndu umu anu ohia na osisi e
nwetala oganihu ahuru anya n'oru ncheka Mbekwu Egypt onodu ya noo
n'oke ihe ituegwu.
Onu Ogugu……
AHUIKE
Gini ka o ga-ewee I ji nweeta ezigbo onodu ahuike N'Afrika? 2mins. 12
Otutu mba n'ala Afrika enyebeghi okwu ahuike nlebara anya puru iche
ruo taa.
ODACHI
Nguko onu ihe oke idemmiri mebiri na Mozambique 4mins. 12
Otu jikotara uwa niile ngalaba n'ahu maka erimeri, na-egosiputa onodu
ojoo nke ajoo idemmiri butere na mba Mozambique na nso nso a.
Nkwekorita……..
AHUIKE
Ndi Egwuregwu Olympic Mba Afrika Kwadoro Atumatu 3mins. 9secs. 13
mgbochi na ogwugwo oria iba.
Otu oru ahuike Mba Uwa, ji ndi egwuregwu Afrika, n'oge Olympic a
agbasara oha na eze ozi gbasara nsogbu oria iba nke na-ebuso ala
Afrika agha.
Mbuso Oria AIDS agha enwetala agbam ume na Naijiria 2mins. 13
Otu otu enwere na mba UK ekwele nkwa ego di, Nde British Pound-asaa
iji nye aka buso oria odurunaja-ocha agha na Naijiria.
Oge akaraka…….
MGBARU EBE OBIBI
Canada ga-akwoo Mba ndi Ozo Obia N'ogbako Omumu ihe 1mins. 13
Maka Nruputa Akorongwa di ocha.
I ga n'ihu n'ogbako Earth summit emere na Rio, Canada ga-ele mba ndi
ozo n'uwa dum obia maka ogbako ukwu agba nke isii aga eme maka nruputa
akorongwa di ocha.
Ngalaba Umuaka
Mgbada, Onye ako na Uche Megidere Enyiohia na Hippopotamus 9mins.
5secs. 14
Mgbada gosiri na, ako na uche bu ngwa kachaa ike eji ebuso onye iro agha.
Okwu Mmechi Were okwu amanihe Afrika I mutara n'ufodu ilu na-enweghi
15
nchefu mere ihe. 2
2 Page 3 4
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
Akuko
Umu Nwanyi Liberia sii na ha agaghi ekweta Iso nye na nme-nme o bula
5mins. 6secs. Na Monrovia, Umu nwayi Liberia tinyere oriaku onye isi ochichi
Mba ahu bu Jewel Howard – Taylor
emeele ka amata na ndi inyom agaghi eso eme emume obula oha na eze na eme nke
akporo ha oku ya wee ruo mgbe ehiwere iwu zuru oke ga-enye ha ikike inata oke
ruru ha. Umu nwanyi Liberia mere mkpokua
n'ulo isi ochichi obodo ahu site na mkpesa isii ha kpesarala ndi otu ulo nzuko
omeiwu Liberia. Mgbe ha
meechara mkpesaa gbara okepurukpu, ha gara njeghari ikwu na ahiri iji gosiputa
idi n'otu na-etiti ha na agbanyeghi ikiti mmiri mara ha n'okporo uzo Monrovia
ubochi ahu.
Otu n'ime mkpesa umunwanyi a mere bu maka ihe di iche n'ime iwu enwere gbasara
nchekwa ikike nke iwu govamenti nyere umunwanyi noo na di na ndi nke di ha nwuru
anwu ya na, ikike nke iwu omenala nyere
umunwanyi noo na di na ndi nke di ha nwuru anwu.
Ha kowara n'iwu ndi a nwere ikpa oke na-etiti ha abuo maa megide onodu idi n'otu
di ka edere ya n'akwukwo iwu. Umunwanyi a choro ka ejikota iwu niile mekutara
umunwanyi isi-mkpe onu.
"Anyi choro ka oge nwoke kwesiri itozu oke ilu nwanyi buru afo iri abuo na
otu ebe nwanyi ga etozu oke ilu di n'afo iri na asato di ire n'iwu govamenti
na nke omenala" Nke – a ka umunwanyi a kowara. Ndi
inyom a gara n'ihu kpesa na ha agaghi akwado nhoputa ndi nwoke n'okwa oru oha
obodo obula okachasi n'okwa oru omeiwu maa oburu na, ndi nwoke ebughi odimma
umunwanyi n'uche. Oriaku onyeisi ochichi
Mba Liberia bu, Jewel Howard -Taylor siri na, obi adighi umunwanyi mma n'ihi
na, akwukwo mkpesa ha
anuola n'aka ndi ulo nzuko omeiwu karia otu afo.
Na nzahachi okwu ya n'aha ndi ulo nzuko omeiwunta, onye-isi-oche ulo nzuko
a bu Nyudueh Morkonmana na onye isi. Oche nke ulo nzuko omeiwu senate buu, pro
Tempore keikura kpoto kwere umunwanyi ndia
nkwa na ha ga-eme ihe obula ha puru ime iji debaa mkpesa ha n'akwukwo iwu mgbe
n'adighi anya. Nme
nme njeghari na mkpesa-a bu agba nke abuo ejiri cheta ubochi ime ihe ekwuru
na ime ka oha na eze mata oke ruru umumwanyi. Isi okwu ejiri mee emume a bu
"Oke ruru onye o bula iha n'otu"
Eu enyele Nde Euro iri na ato maka Atumatu Oru Erimeri Uwa N'Afrika 3mins.
7secs. European Commission ekwuputala na ya eweputa kwuole nde Euro iri
na ato maka atumatu oru erimer
uwa World Food Programme (WFP) N'ime Mba di iche-iche n'ala Afrika. Di ka okwu
ulo oru a kwuru unyaahu, Nde Euro iri na ato-a bu nke agbakwunyere na Nde Euro
iri itolu o weputara n'onwa Julai.
European Commission nyekwara ego onyinye gbara okpurukpu maka erimeri site n'aka.
Channels karia I site n'aka WFP. N'abali iri na asato nke onwa Julai 2000 ka
ulo oru a kpebiri inye WFP Nde Euro iri
itolu iji nwee erimeri ga ezuru ndi Afrika ugbua. Ego a bu nke aga eji zuta
erimeri mkpuru osisi di, otu nari
puku tonne na tonne iri ise na ano, puku tonne asaa na nari tonne mmanu eji
esi nri ise na otu puku tonne sugar tinyere ngwa ndi ozo di iche-iche.
Akuko a gara n'ihu kowaa na, ulo oru-a e nyele ego kariri Nde Euro ato na
uma kemgbe afo gara aga ruo taa site n'aka United Nations High Commission for
Refugees di ka oru enyem aka obiebere maka ndi
gbara osondu site Mba Democratic Republic of Congo n'Angola gbagaa Zambia. Ego
a ga-enyere UNHCR aka ikwudosike n'oru ahuike mmri onunu tinyere njeghari ndi
a gbara oso ndu
The Post of Zambia. 3
3 Page 4 5
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
Iji mmiri ogwu aru oru ugbo n'uzo na-ezighi Ezi na-ebusi umu anumanu
3mins. 9secs. Ndi isi ochichi mba Burkina Faso amachiele iji ogwu akporo
phytosanitary agwo anumanu oria. O bu n'ihi
onwu umu anumanu di otu nari nwuru site na nsi na-agbata onwa Junu na Julai
n'ime obodo Mouhoun mere ka ndi ochichi magide ogwu a iwu. Di ka onye regional
Director n'ulo oru n'ahu maka odimma umu
anumanu na mpaghara Central Western Zone Alexandre Sawadogo siri kwuo, phytosanitary
bu ogwu emere maka nani oru ubi, o doro aka na nti kwuo na, onye obula gbara
isi akwara n'iwua ga-ata ahuhu diri ya.
N'ime akuko agbasara n'ikuku site a'ulo oru Radio di n'ime obodo, onye ngalaba
oru nlekota umu anumanu di n'aka na mpaghara obodo ahu siri na, umuanumanu ejiri
ogwu emeputara site na phytosanitary gwoo
oria na anwuyupu anya. O siri na, ndi n'azu umu anumanu n'ulo jiri ogwu-a gwoo
anumanu ha oria na igbu akuru na-akwu anumanu ndia n'akpukpo ahu.
Ngalaba ulo oru-a mere ka ndi-a n'azulite umu anumanu mata nsogbu ogwu a na-ebutere
ahuike umu anumanu na mmadu. Di ka onyeisi oru nlekota umu anumanu ebe ahu siri
kwuo, anumanu onu ogugu ha di
iri ano na itolu nwuru n'obodo kossi, nari kilometer ato na iri kilometer isii
na mpaghara Odaanyanwu nke Ouagadougou, iri anumanu abuo na ise nwuru na Bale
(nari kilometer abuo na iri kilometer ise nke
odaanyanwu Ouagadougou) mgbe ejiri ogwu 'Cypercal 50', mmiri ogwu emere maka
osisi owu gwoo ha oria .
Na mpaghara obodo Sourou (ihe dika nari kilometer ato n'akuku odaanyanwu Ouagadougou),
iri anumanu abuo na asato nwukwara ebe ahu n'ihi nsi-a ka enyechara ha ogwu
Bazudin 600".
Ndi Ogbenye Noo na -na etiti Anyi 7mins. 5secs. N'agbanyeghi mbawanye
onodu odimma nke umu mmadu ihe kariri otu nari afo gara aga na mba niile na
mpaghara uwo dum eketabeghi oke na mbawanye okwu aku na uba, dika. World Economic
Outlook kwuru n'akwukwo nke International Monetary Fund biputara. Oganihu e
nwere ebe onodu odimma umu
mmadu noo sitere n'usoro nka-na-uzu gbara mgborogwu na Mbughari onodu okwu aku
na uba di ugbua. Akuko a mere ka anyi mata na, ihe ana aruputa n'uwa dum foduru
ntakiri ka o jiri uzo ato karia ihe ana
aruputabu mgbe gara aga site na mbido ruo ukara otu nari afo gara aga maa, bawanyekwuo
uzo itolu
mmalite n'ukara otu nari afo gara aga wee karia onodu onu ogugu mmadu. Ozokwa,
odimma maka ndu ndimmadu, mmuta nakwa ihe ndi ozo na-egosi ihe idiwanye mma,
Okachasi n'ime Mba dara ogbenye.
Kama usoro nkesa ugwo oru n'uwa dum maa atuo ya n'isi n'uwa dum ka gbagoro
agbago dika akwukwo ahu ebiputara siri kwuo. E nwere ike ihuta odida n'okwu
a maa onodu a teekwuo aka: Iri Percent asaa
na percent ise mba na-etolite-etolite ka onu ego onye o bula n'akpata n'isi
n'isi kachaa pee mpekaria na mba mepere emepe kemgbe iri afo ato gara aga. O
kowara na, ihe onye n'akpata na-adahachi azu n'ime
mba iri ato na abuo ebe nani mba asaa na emepe emepe tolitere, ngwa-ngwa ibenata
ebe o buru ibu, oke di na-etiti ihe onye di iche-iche na –akpata-maa gbakota
onu dika otu mba na-emepe emepe n'oru itumgbere
ahia. O gbakwunyere na, orughi percent iri nke onu ogugu ndi na-emepe emepe
n'uwa bi na ,mba ebe ihe,
onye na-akpata na-ada mbaa, ebe percent iri asaa bi na mba ebe ihe ha na akpata
n'isi n'isi kariri nke ndi bi na mba mepere empepe n'erite. Maa ka osiladi,
ndi ogbenye ka noo na-etiti anyi. Akuko a kowara na,
onu ogugu mmadu noo na mba na-emepe emepe esile na iri ise na otu kwa ubochi
gbadata site na percent iri ato ruo percent iri abuo na ano n'ime afo iri gara
aga (nke gosiputara mbenata ubiam na East Asia na
South Asia). O gbakwunyere n'onodu ubia mka di elu. IMF ka na-ekwu sike na odibeghi
oganihu o bula
enwetara na mbenata ubiam n'ime Afrika na Western Hemisphere. O kwenyere na,
ubiam kachaa abawanye n'ime mba ndi ahu noo n'onodu mgbanwe ochichi "o bu ihe
doro anya na, ubiam buu nnukwu ihe zuru uwa
onu, o bughi nani uko ego na ngwa aku na uba, kama ogunyere e nweghi ezi nchekwa
maka ndu na aku na uba, uko oru di mkpa nke gunyere ahuike, mmuta na inwe usoro
ido oru ahuike ocha (Ijimaatu, Olile anya 4
4 Page 5 6
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
ndu mmadu) ihe ndia abiakotala onu karichaa n'ime otutu mba, onodu a
kazi ihe onye kpatara n'isi n'isi n'onu ogugu, n'ihi mgbasaa usoro oru nka na
uzu ahuike loro ohuru.
Udiri mgbanwe a gbasara n'uwa niile, enyerele mba ndi ahu kachaa daa ogbenye
aka ahuru anya". All Afrika com
Zimbabwe Ga-Amalite Nyocha Ogwu AIDS 4mins. 3secs. Aga amalite n'onwa
Septemba nyochawa umu ogwu di iche-iche onu ego ha pere mpe bu ndi achoputara
na ha nwere ike ikwusi maa mgbe ufodu mee ka ike HIV nje na-ebute oria AIDS
hara iganihu na mba Zimbabwe. Ogwu ndia enwere n'ime obodo ha gunyere aspirin,
selen na ogwu ndi nwere otutu umu ihe na
azulite onu ahu. O bu otu ulo oru akporo United States – based Institute for
Alternative Medicine Choputara ogwu ndia o ji nyere ndi oria AIDS aka ikutetu
ume ndu etu nje na ebute AIDS na-agaghikwa enwechaa
ike n'ahu ha. Snorre Westgaard Onye-isi oru ngo nke Hope Humana otu kwuru onwe
ya n'uwa n'agba mbo imeputu umu ogwu ndi ahu onu ahia ha di ala na Zimbabwe
n'ime izu ukaa siri na, ngalaba omumu ihe
oru ahuike noo na University of Zimbabwe ga-ahasi nyocha ogwu ndi ahu.
Usoro nke mbu n'ime usoro ato eji eme nyochaa a ga-ewe ebe opekariri mpe onwa
ato, ebe oru niile gbasara nyochaa ga-ewe otu afo zuru oke, buu ihe Westgaard
gwara Financial Gazette. Hope Humana
nwere olile anya imeputa ogwu ndi ahu n'ime abodo Bindura ozugbo achoputara
maa nabata ego na ngwa oru-a n'ime Zimbabwe nakwa mba ndi gbara uwa gburu-gburu.
Achoputala atumatu nweta ogwu n'aka
nke ozo dika usoro bu akwaa akwuru maa atutee ya na ogwu nke amara nke oma ugbua
n'ime mba mepere emepe n'uwa maka igwo oria AIDS nke onu ego ya di uzo ato kara
onu ego nke-a.
Otu mba uwa n'ahu maka oru ahuike kwuru na. aga enwetarila otu okenye n'ime
okenye ise buu nje (HIV) na ebute oria AIDS na mba Zimbabwe otu n'ime obodo
oria-a kachaa hinye udu na Southern Afrika.
The Financial Gazette.
Umuaka di Nde iri na otu N'anwu N'ihi oria Nwere Mgbochi 5mins. 6secs.
Onu ogugu Ufodu umuaka n'anwu kwa afo obula n'uwa niile n'ihi oria enwere
ike mgbochi na erimeri
onodu ha na-ezughi oke ruru Nde iri na otu. Onu ogugu-a bu nke enyere Ogbako
omumuche otu mba di iche-iche n'uwa mere gbasara ahuike n'isi ochichi mba Mali,
Bamako. Ndi noo n'ogbako omumuihe ahu
eji enye ndumodu maka " mkpokota oru gbasara oria umuaka" (integrated Management
of Child Disease")
nuru na, enwere ike ibenata onwu ike umuaka site percent iri ruo percent iri
ise maa esoro usoro ezi ahuike ezinulo akwaliteworo nakwa nke oha obodo. Nzuko
ahu emere na Bamako bu, atumatu ngalaba ulo oru
otu mba uwa n'ahu maka ahuike n'Afrika na ulo oru okwu ahuike di n'aka na
Mali jikotara aka tuputa. Itiputa usoro buu kpoo maka oru ogwugwu oria umuaka
n'ala Afrika, site na ntuputa eromero gbara
mgborogwo nke ndi di iche-iche inyere aka n'oru a eji achikota oru mgbochi oria
ndi ahu
Ntulee onodu onwu ike kwa mgbe kwa mgbe na ajoo oria umuaka n'aria n'uwa dum
ugbua o di ka ebe, ugboelu Boeing 747 bujuru umuaka na-akaribeghi afo ise n'ime
ya nwere ihe oghom kwa otu hour. Ndi
okachaa mara n'oru ahuike kwuputara na, otu n'ime umuaka ise na anwu tupu ha
e ruo afo ise n'ihi oria nwere mgbochi di ka oyi igiga, afo osisa, iba, akpata
tinyere kwoshoka. Helen Mabu Ma Disu na-anochite
anya ulo oru WHO na mba Mali siri na, aga azoputa ndu umuaka onu ogugu ha ruru
otu Nde n'uwa niile kwa afo ma oburu na elebara oria oyi-igiga anya nke oma.
Osiri na, nkwusi oria afo osisa ga-enye aka
zoputa ndu umuaka onu ogugu ha di, Nde ato, Nari puku iri asato kwa afo n'uwa
dum ebe Nari puku umuaka ise ga-adi ndu maa elebara oria iba anya nke oma.
Abdrahmane Tounkara, Odee akwukwo ukwu nke ulo oru ahuike di n'aka na Mali
nwere olile anya na, "site na ihe emeputara n'ogbako omumuihe a, ndi mmadu ga-enwe
ike Isite n'usorogwugwo oria ndi 5
5 Page 6 7
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
ahu na-adighi ire mata uzo bu igba eji agwo oria ndi ahu n'ime usoro
oru PCIME". Ndi okachaa mara n'oru ahuike sii Senegal, Benin, Cote d'Ivoire,
Niger, the Democratic Republic of Congo, Burkina Faso
tinyere Mali Kworo ha obia, biara nzuko-a emere na Bamako Pan African News
Agency
Ofoduru Obere Ihe ka Osisi Eji Agwo Oria Kpochapu 6mins. Otu osisi
di na South Afrika nke kachaa noro n'onodu ihe ituegwu ugbua ana akpo Winter
Impala Lily,
osisis ndi dibia mkpa akwukwona mgborogwu ji agwo oria-afo, na-acho mkpo-chapu.
Ndi oru nchekwa oke ahia doro aka na nti kwuo na, ugbo na mmepe obodo choro
ikpochapu osisi-a n'ime ohia, o buru na-enweghi
ezi mbo agbara ozugbo, o ga agwucha.
Gerhard Strydom nke Mpumalanga Parks Board Conservationist gbara amaa n'ime
izu uka a na ngwucha
nyocha di omimi were onwa ano emere na mpaghara obodo onderberg di na Eastern
Mpumalang ebe osisi ahu ana emeputazi na-erughi iri na abuo "Ihe dika percent
iri asato buu lily emebiri n'ihi, mmepe
obodo ebe percent iri abuo foduru ka egburu maka iku sugar cane na iko akpu.
South Afrika bu mba nke ato n'ime mba kachaa nwee osisi noo onodu ojoo n'uwa
dum, United States na
Australia ka onodu a kachaa jide. Ebe opere mpe, osisi iri ise na ato ka amara
na ha noo onodu mkpochapu n'ime obodo ahu kemgbe otu Nari afo gara aga. Osisi
Winter Impala Lily bu otu n'ime puku osisi abuo,
nari abuo, iri osisi na ise edeputara aha ha dika osisi onodu ha noo n'oke
nsogbu na South Afrika. Obu IUCN-World Conservation Union n'ahu maka oru nchekwa
umu osisi ana amaghi ama onodu ha noo na
asogbu n'uwa dum mere ka anyi mata nke-a.
Nyocha di omimi nke Strydom mere gosiri uzo winter impala lily ga-esi di ndu
mgbe di n'ihu, nke aga-ahu nani na Eastern Mpumalanga na mpaghara Northern Swaziland
na Southern Mozambique di ntakiri karia
etu echere na mbu. Winter impala lilies nwere okoko-osisi tunwuru-atunwu na
mgborogwu buru ibu n'ime ala. Okpomoku na aja-uro na-adi ha mma n'ahu-onodu
kacha mma Sugar cane na akpu ji eto.
Amara winter impala Lily dika Swazi lily na Nunankulu nke ndi dibia odinala
mara nke oma. Mgborogwu ya nwere nsi, ya mere agbata akwara ya na ugwurugwu
osisi-a nani ka eji aru oru.
Ebe echekwara nke oma bu ebe lily a nwere ike I si nweta nzoputa, maa, ejighi
nke ahu aka kpom kwem. Nani ihe dika osisi ahu iri na abuo ka ahugoro na mpaghara
Southern Kruger National Park n'ogige
nchekwa oha obodo Mawewe. Mail and Guardian (Johannesburg)
Ndi Ndu Umu Nwanyi Afrika N'akparita Uka Gbasara Odimma ha 11mins. Ihe
ruru otu puke umu nwanyi ama-ama n'Afrika na Umunwanyi sii mba di iche-iche
n'uwa biara ogbako
emere na Windhoek isiochichi Mba Namibia n'onwa Julai. Ha mere mkpebi na ngwucha
nzuko ahu idi njikere n'oru ga-eweta ezi mgbanwe n'onodu odimma na-erughari
n'uwa. "oge ugbua abusighikwa mgbe
nwanyi agba ohuru-a ga-enwe ohere igba asiri n'isi ekwu ma o bu akuko ulo ahia.
O bu oge itinye aka na nkwalite onodu mgbanwe odimma n'ime uwa" etu a ka Nafis
Sadik, onyeisi ulo oru nke UN Population
Fund siri kwuo ya. Ogabko mkpuru ubochi ano-a emere na mgwucha onwa Julai, buu
agba nke ano ndi Regional Conference of African Women Ministers and Parliamentarians
na-eme. Isi okwu ejiri mee nzuko-a
bu, "Ima aka n'ihu iji toruo ogo, mmkorita nwoke na nwanyi na mkpa o di iruputa
ihe", ogbako a chere
ndi ochichi ala Afrika aka mgba n'ihu ka ha mee ngwa-ngwa mejuputawa mkpebi
ufodu n'okwu ndi ahu di oke mkpa mekutara nwata nwanyi, ibi nwanyi ugwu, nwanyi
iru oru ndi agha, nwa nwanyi etorughi etoro
buru afo-ime na mkpa odi imawaputa ego gbara okpurukpu maka oru ahuike. Umu
nwanyi ndia buu minister na ndi ulo nzuko omeiwu sii mba iri ano na ise n'Afrika
nke ufodu umu nwanyi isi ulo oru ndi ahu 6
6 Page 7 8
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
kwuru onwe ha na otu mba di iche-iche n'uwa, tinyere ndi n'agba ezi
mbo kwadoro, gbakwara mbo n'ima ndi ochichi Afrika aka n'hu iji nye umu nwanyi
ohere ino n'okwa ochichi ukwu na, onodu mkpebi okwu.
Ha choputara na, ewepu mba Southern African Development Community nwetagoro
Percent iri na asaa na uma onu ogugu umu nwanyi nooo n'ulo nzuko omeiwu, mba
ndi nke ozo n'ala Afrika enwerubeghi
percent iri.
Abia n'okwu omenala dika ibi ugwu na nwoke idinye nwanyi na amabeghinwoke nke
na-agbakwunye ahuhu umu nwanyi na-ata na, nsogbu onodu ahu na-ebutere ha, Sadik
Siri na , Omenala di oke mkpa
maka nchekwa uru anyi na-erite na inyefe ihe mmuta ndia n'aka ndi ntrobia.
Kama emeziri omenala n'uzo ona abara obere onu ogugu mmadu uru karia ndi ozo,
"Okwuru na dika World Health Organisation siri kwuo ihe dika, nde umunwanyi
abuo noo na mpaghara sub-Saharan Afrika,
Okachasi odaanyanwu Afrika na-adabanye n'ime oke nsogbu nke ibi nwanyi ugwu
nke ana eme n'ime mba iri abuo na asaa noo na odaanyanwu Afrika. Iji mezie onodu
a, Afrika Komiti nke otu WHO
amaliteleri oru nke ya na ndi ochichi mba iri di na sub-saharan jikotara aka
n'oru iji kwusi ibi umunwanyi ugwu site n'inyere ha aka mejuputa atumatu mkpochapu
omenala-a.
Mgbe o na emepe nzuko-a, onyeisi ochichi mba Namibia bu, president Sam Nujoma
mere ka amata na, percent iri ano na ise umu nwanyi Namibia muru umu mgbe ha
ka di afo irina itolu. Onyeisi ochichi-a ruturu
aka n'ihe otu akwukwo ahuike deputara na nchoputa o mere banyere okwu a. O kwukwara
na percent abuo n'onu ogugu umu nwanyi noo afo iri na ise na-aturu ime. O tara
onodu enweghi oru ahuike zuru oke
uta n'ihi na, onaghi erute umuaka ndi-a na-etolite etolite aka. Otu n'ime ihe
onyeisi ochichi a ruturu aka buu egwu gbasara ndi oru ahuike itope ihe nzuzo
enwere n'oru ahuike, ejighi obiocha aru oru na agwa ojoo ndi
oru ahuike n'akpa, okachasi mgbe mmadu na-akosara ha ihe gbasara, onodu ahuike
mekutara omumu
nwa, condoms na atumatu omumu nwa n'ime ezinulo. O siri na, ochichi ya di njikere
ikwalite onodu nkuzi mmekorita nwoke na nwanyi na oru ahuike gbasara omumu maka
umuntorobia. N'ihi nke-a, ochichi ya
ehiwele usoro oru ahuike gbadoro ukwu n'omumu maka umuaka na-etolite etolite
na Namibia
Nzuko-a gara n'ihu katoo ndi ndu Afrika n'ihi na, ego ha na-emefu maka oru ahuike
pere-mpe nke ukwuu
maa ego ha na emefu maka izuta ngwa agha ha ji chere onwe ha n'ihi ndi iro ha
kariri etu okwesiri. Dika ihe edeputara na nzuko ahu siri kowaa, Mba Angola
n'ime afo 1997 mefuru ego di, Nde US Dollar isii rii
ise na asato nke putara percent asato na uma asato nke GDP ya maka ngwa agha
. Dika akwukwo akuko ndi agha edeputara n'afo 1998-1999 nke international Institute
for Strategic Studies di na London biputara,
Eritrea mefuru ego di nde dollar iri isii na ise nke putara percent asato na
uma ato nke GDPya, ebe nwa
obere mba dika Lesotho mefuru percent ano na uma isii GDP ya maka ngwa agha.
Minista onodu odimma ndi inyom na umuaka di n'aka na mba Namibia bu, Netumbo
Ndaitwah siri kowaa, ihe emeputara na nzukoa, O siri, "ke mgbe mkpuru ubochi
ano gara aga, anyi gara n'ihu na ntugharikota
echiche na ogugu isi n'uzo di iche-iche. Anyi ga-eji ihe anyi mutara laghachie
n'ulo nzuko omeiwu na okwa
oru di iche-iche anyi ji ruo oru karia ka anyi mara na mbu tupu nzuko-a.
Okpomoku di n'uwa dum na-enye Mbikota onu ajo mmekpahu 5mins. 4secs. Okpomoku
di n'uwa na-abawanye nke na otutu umu anuohia na osisi agaghi enwe ike idikwa
ndu n'ihi
oke okpomoku, ihe-a bu ido aka na nti nke akuko si n'aka ulo oru nchekwa gburugburu
ebe obibi doro.
Mkpocha pu ufodu umu anumanu na osisi ga-erucha percent iri abuo ebe enwere
mbikota siri ike dika na Northern Canada, Tibetan Plateau na South Eastern Australia,
dika akuko World Wildlife Fund and
Canada's David Suzuki Foundation weputara. O doro aka na nti wee kwuo na percent
iri ato na ise ebe obibi n'uwa noo ugbua ga-agbanwe n'ime otu nari afo na abia
n'ihu. 7
7 Page 8 9
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
Ndi Saynsi kwekoritara n'elu uwa na-adiwanye oku nwayo nwayo kemgbe
otu nari afo gara aga, ma ha ekwekotaghi n'ihe kpatara ya ma o bu na oga-eme
otutu oge. Otu n'ahu maka onodu gburugburu ebe
obibi n'akwukwo O nyere aka weputa n'ogbako ha na ndi nta akuko mere na Toronto
na London siri na,
o bu ihedoro anya nke oma na-aga elekota oru mmeputa green-house gasses anya
n'ihi na, o bu ya kpatara okpomoku ana enwe n'uwa taa. "Oge okopomoku a malitere
nwere ike ikari puku afo iri na ato
gara asa, mgbe sabre-toothed tiger na woolly mammoth ka na ejeghari n'uwa.
"Anyi ogaghi agbachi nkiti maa nabata ila n'iyi a" nkea ka Dr. David Suzuki
nke University of Toronto na-eme nyocha di omimi maa
burukwa onye oru nlekota gburugburu ebe obibi kwuru.
Akwukwo-a kwenyere na, ufodu anumanu na osisi di iche-iche ahu ha nabatara onodu-a
nwere ike idiwanye ndu na-agbanyeghi oke okpomoku di n'uwa, kama o siri na,
otutu n'ime ha na-ebute "mmekpahu" ndi
nke di ka, kudzu vines na Japanese honey suckle. Ndi ga-anochite anya mba onu
ogugu ha di otu nari na iri asato ga-ezuko na Lyons, France n'onwa n'abiabia
ichoputa uzo aga esi malite mmejuputa nkwekorita
emere na kyoto akporo "kyoto protocol International agreement" gbsara etu aga
esi kwusi ahuru-oku sii na green house gas aputa. Mkpebi emere n'afo 1997 ga-abu
isiokwu nke ndi minista sii mba di iche-iche
n'uwa ga-akparita uka maka ya na nzuko ha ga eme na Hague n'onwa November. Reuters.
UNEP Awagidele oru Ngo Gbasara Mmeto 8mins. 2secs. Gburugburu obibi Ga
Ewe ya Otutu Nde Dollar
Ij matakwu nsogbu mmiri ogwu ndi ahu buzi nsi na-enye odimma gburugburu
obibi na ahuike tinyere, usoro aga eji buso ha agha, UNEP Chemicals ga-awagide
oru ngo ga-eri ya Nde US-dollar ise maka oru
oji amata ihe ndi ahu na-agbaru ikuku ndu n'akuku uwa niile. Manager oru ngo-a
di n'aka bu, Paul Whylie
Kwuputara nke a. Ihe emeputara n'oru ngo-a ga ewe afo abuo buu nke ga-amalite
n'onwa Septemba ga-enye aka buru ihe Global Environment Facility ma o bu, GEF
ga-etinye Uchu puru iche n'ime ya mgbe di
n'ihu. O bu GEF nyere nkwado ikpe azu maka mmalite omumu ihe oru ngo-a n'uju
n'ime onwa Julai. Ihe oru ngo-a ga eweputa n'obia n'ihu ga-eduzi. Mba nile di
n'uwa uzo n'oru nzoputa ahuike umummadu na
onodu gburugburu obibi n'aka nsi, UNEP kwuru nke a n'akuko o weputara.
Ana emejuputa atumatu oru GEF site na njikota aka nke UNEP, usoro oru mmepe
UN na ulo oba ego uwa. Omumu ihe a ga-abu nke mbu GEF na-eburu oru ngo n'uju
maka mmiri ogwu ndi noo n'ogo ahu.
Nchoputa a ga-agbakwu oru ndi arugoro ume tinyere mkparita uka maka nkwekorita
uwa dum ga enwe gbasara uzo oru iri na abuo ndi a na-agbaru ikuku ndu juru mgbochi
persistent organic pollutants ma obu
POPs bu nke n'abia n'ihu. Mmiri nsi ndi ahu bu ndi UNEP governing Council Mandate
Lekwasiri anya oru n'afo 1997. Atumatu oru ngo ohuru GEF ga-amata nsogbu di
iche-iche nke mmiri ogwu ndi ahu buzi
nsi noo n'ogo di otutu. O di mkpa ka enweta nkowa chara acha site n'aka ndi
sayensi gbasara ihe achoputara ebe onodu na ogo nsogbu nsi ndia ana agunyeghi
n'onu ogugu nsi iri na abuo ahu akporo
persistent rganisc pollutants n'asusu bekee nyedebere gburugburu obibi na ahuike
ndi mmadu, Klaus
Toepfer, UNEP Executive Director Kwuru Okwua.
Mkpebi niile emere n'atumatu oru ngo a, ga-enyere GEF aka ihiwe nle kwasi
anya puru iche mgbe di n'ihu, nyere, mba di iche-iche na mpahara obodo di iche-iche
aka n'oru mmepeanya iji kwudo nsogbu
niile nke ihe ndi ahu na-agbaru ikuku ndu na enye ha, nyekwaa aka n'iga n'ihu
choputakwuo pops maka
oru zuru uwa dum.
Umu nsi niile na-ekweghi mkpochapu na-ebutere umu mmadu na gburugburu obibi
nnukwu nsogbu. Ha nwere ike inote aka ebe obula ha noo, maa nwee kwa ike I sii
ebe ha noo gaa ebe ozo tere aka. Ha nwere
ike idi otutu biakota n'anu ahu site na n'usoro erimeri maa norokwa n'ime erimeri
etu ona agaghi diri ndu 8
8 Page 9 10
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
mmadu mma. Ndi mmadu na-amatazi na mmiri ndi ahu gbaruru agbaru, yiri
iri na abuo ndi nke edeputara n'akwukwo UNEP nwere ike ibutere gburugburu obibi
nsogbu maa tinye onodu ahuike ndi mmadu n'ihe
itu egwu. Ogbakwunyere n'ihe ojoo nke-a na-ebute di iche-iche n'ihi, uzo di
iche-iche eji ha eme ihe na
etu onodu gburugburu ebe adotara ha si emekuta ebé há noo uzo esi ekesaa ha.
K'odi ugbua, akuko gbasara uzo esi eji ha eme ihe nakwa ihe ona ebute ebe di
iche-iche adighi otutu. Atumatu oru ngo a ga-enye
aka weputa akuko di mkpa ekwesiri imata maka ya. Pan African News Agency
. Egypt N'agbasi mbo Ike iji zoputa Mbekwu ya 11mins. 9 secs.
Noo N'onu onwu
Otu mbekwu dooligedere wee tukpoo onwe ya n'otu osisi ogwuogwu di na ozara
kporo nku, jiri nwayo n'akuru ahihia di n'ukwu osisi ahu iji lee ma o ga-amita
mmiri ebe ahu. Ala ahu gbotoro n'efu nke osisi di
n'ime ozara a noo na nge na nge, enyeghi mbekwu Egypt a ihe etu ochoro wee
mee ka, o noro onodu o di ndu onwu ka mma n'ime ozara. Ndi mmadu na ebukota
maa na erekwa ha dika anu ulo. Umu anumanu
irife ahihia oke, Mgbatikwu aka n'oru ugbo na ebe nkiri ndi njem aburula odachi
nye ndu na-ebe obibi ha
n'ime ala gbara osimiri okirikiri n'Egypt, Eastern Libya na Isreal Western Negev
buu nke ana emebi emebi. "Onu ogugu ha na-agbada ala kemgbe afo iri ato gara
aga," buu ihe Sherif Baha el-Din, onye
ndumodu sayensi n'ulo oru Egyptian Environmental Affairs Agency kwuru. O sii
na, nchoputa akpachara anya mee n'Egypt n'afo 1994 enweghi ike ichota obuladi
otu mbekwu bi n'ohia ma oli.
Mbekwu Egypt amara n'aha sayensi dika, Testudo Kleinmanni, buu otu n'ime mbekwu
kachaa pee mpe n'uwa dum maa burukwa mbekwu kachaa ibe ya noro n'onu onwu, o
buru na – atuo ya, ebe obukarichara
ibu oburu cm iri na abuo na uma asato (inchisi ise) n'ogologo. Ndi nke nwunye
ka ndi oke ibu. Ebe ana ahukari ha buu, ebe mgbara-aja na ebe nweturu okwute.
Ucha ya dituu ka akwukwo kponwuru akponwu
na aja ala ebe ahu na achakota n'otu .
N'afo 1990 ka, otu International for the Union Conservation of Nature tinyere
aha Mbeku Egypt n'akwukawo ebe ana edeba aha anumanu ndu ha noo na nsogbu. N'afo
1996 ka ogbako maka azum
ahia di na-etiti mba, na mba ozo gbasara udiri anumanu na osisi noo n'ime ohia
ana enweta n'otu mpaghara obodo nke ndu ha noo na nsogbu maa obu Conservation
on IntenationalTrade in Endangered Species of
Wild Funa and Flora (CITES) n'aha mkpirisi bekee machiri itu mgbere ahia na-etiti
mba na mba maka udiri anuohia na osisi ndia, nani maa eji ha aru oru gbasara
sayensi. Iwu Egypt megidere ire, izuru na
mbughari uduri anuohia na osisi ndi ahu na-enwetaghi ikike, kama, mmejuputa
iwu-a siri ike.
N'onwa January 1997, ndi uweojii jidere ndi na-ere mbekwu ha siri Libya bute
n'ime ahia ana ere anu ulo
akporo Tunsi Pet Market di na Central Cairo. Ndi uwe ojii-a bukoro mbekwu ndi
ahu n'ime akpa gaa kpoturu Baha el-Din onye oru n'ahu maka odimma onodu gburugburu
obibi na nchekwa umu anumanu.
Otutu Mbekwu ndi ahu noo n'ime akpa dara oria ka ha nochara karia otu izu
uka na-anughi mmiri ma o bu riee nri n'okporo uzo. Onabatara I ji mbekwu ndi-a
mere mgbado ukwu n'usoro oru nehekwa anumanu.
Etu a ka nlekota Mbekwu siri malite n'Egypt buruzie etu mba di iche-iche n'uwa
na nke ime obodo tinyere
ndi mmadu siri biakota otu ebe iji nye nke aka chekwaa Mbekwu Egypt. Site n'ego
enye m aka nke ochichi mba Dutch nyere, otu ndi oru muru ihe gbasara anumanu
nke London nyere aka ilekota Mbekwu
ndi ahu, kama nsogbu di na nchota ohia ebe aga ahanye ha ka di.
"Anyi ejile mbekwu iri ebugara n'otu ala nke osimiri gbara gburugburu n'ime
mba echedoro nke oma mee
nlegha iji bidogharia atumatu oru a ozo na imata ka mbekwu ndi ahu si akpa agwa",
buu ihe Baha el-Din kwuru. Ozugbo ahu ka amalitere usoro oru nzoputa mbekwu
ndi eji-eji. N'ime nari ákwà ato ha yiri, nari
abuo bùrù, nke gosiputara oganihu kachaa ibe ya n'udiri oru ngo di etu a.
E nwekwuole uzo ebe abuo ana 9
9 Page 10 11
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
eme nlegha gbasara ndu mbekwu nke etinyere mbekwu iri ise n'otu n'otu
tinyere nke otu onye noro onwe ya akporo Waadi Food farm di n'okporo uzo ozara
gara Cairo-Alexandria na nke Sekem Frams ndi n'aru
oru ugbo anu na mmepe oha obodo. Otu a tuputara eromero nhiwe oru ngo ndi okwaa-nka
akporo bedouin craft iji mee ka oru ngoa nwee ike ikpata ego oji aruru onwe
ya oru. Atumatu-oru –a ka umunwanyi
bedouin ji emeputa umu obere akpa ana eji n'aka, akpa eji ebuibu na akwa eji
etinye ihe eji ehinye isi n'elu àkwà, nke ha sere mbekwu n'ahu ha nke ha na-ere
maa jiri ufodu ego ha nwetara ji nyere mbekwu ndi ahu
aka. Enyem aka-a mere ka ndi Bedious nwee mmasi inye aka maka nchekwa ebe mbekwu
n'ebi maa mee ka ha mata nsogbu di okirikiri ebe ha bi. Ha nwetara otutu ego
I ji kwuo ugwo maka, nlekota
mbekwu ndi ahu kwa ubochi.
"Ebe dikwu mkpa obibi udiri anumanu-a kwesiri inoo dika ebe echedoro nke oma,"
buu ihe Tortoise Care kwuru n'ulo oru ya. "Ebe echekwara nke oma buzi nani ebe
umu anumanu na-ebi nke oma n'Egypt na-enweghi
nsogbu o bula nke mmadu na ebutere ha," CNN Com.
Ulo oru itumgbere Ahia Ndi Ntakiri Dika Ngalaba 11mins. 2secs.
ji Ntolite N'ala Naijiria Onye na aghotaghi nke oma gbasara onodu itumgbere
ahia ozuru mba onu ga-eche na, ulo oru ukwu buu
ndi kachaa ere ahia maa na –enwekwa mbara Karia. Nke buu eziokwu buu na, ihe
adighi etu esiri chee ya. Ulo oru itu mgbere ahia ndi ntakiri buu, akwaaakwuru
maka odimma aku na uba o bula. Iji maa atu,
United States of America, buu ebe e nwere ulo oru ntakiri na-emeputa ihe bara
uru di iri percent ise n'ime
ihe nii ce ulo oru kwuru onwe ha na emeputa, iri percent ise na abuo maka azum
ahia maa na –ewekwa ihe dika iri percent ise n'ulo oru kwuru onwe ha. Omumu
ihe emere gbasara aka oru nke ulo oru ntakiri na ndi
nke buturu ibu n'uwadum gosiri n'otu onye oru n'ulo oru ntakiri ndi-a, na-emeputa
ugboro abuo n'ihe otu onye noo n'ulooru ndi nke ukwu na-emeputa. Ihe omumu ozo
emere na United States gosri na, ulo oru ndi
ntakiri ahu gbara mbo puru iche iji zoputa mba ahu n'ihe ira ahu nke aku na
uba dakwasiri ya n'afo 1980.
Di ka ulo oru Small Business Administration nke ochichi U. S. ji ego ya elekota,
maka nkwalite ulo oru nta siri kwuo, ulo oru ndi ahu na-enweghi ndi oru ruru
iri mmadu abuo kewaputara ohere oru ohuru ruru ijeri
ano na otu nde ebe ulo oru ukwu di iche-iche dara nko n'ohere oru di Nari
Puku ise site n'afo 1980 ruo 1990.
Kedu etu ulo oru ntakiri ndi-a siri nwee ike Igba mbo ha gbara maka onodu
aku na uba mba America? Oganihu ulo oru-a nwetara sitere na nkwado nke otu di
iche-iche noo gburugburu America na-anaghi
acho mmbara, enyem aka site n'aka ngalaba ulo oru aku usoro na atumatu di iche-iche
nke ochichi United States hiwere maka ulo oru ntakiri nyere ha.
Na Naijiria, otutu ulo oru nta n'aru oru dika ulo oru kwuru onwe ha nke na-atuta
ego ruru ijeri dolar iri abuo n'ime ego GDP niile Naijiria na-enweta. O bu ihe
nwute n'obere ulo oru ndi-a anaghi etolite dika ndi
nke enwere na U. S. sii aga n'ihu. Ihe kachaa bute onodu-a bu na, ulo oru ndi
nke Naijiria anaghi enweta enyem aka n'oru ha. Ihe ha na-enweta buu nani obere
nkwado na nhunyere ugwu n'aka ndi ntuputa
atumatu oru. Ulo oru nta ndia enweghi ohere inata ego n'ulo oba ego ama-ama.
N'ihi enweghi ego ha ga
eji-kwuo ugwo maka ozuzu ndi oru, obere ulo oru anaghi enwezu ndi nwere aka
oru buu igba n'ulo oru ha. N'ihi na-enyem aka ha na-enweta anaghi eru ebe niile,
ya mere ihe ha na-aruputa jiri pee mpe karia etu
ha kwesiri iruputa Nsogbu ozo o na-enwe dika ulo oru ndi ahu buturu ibu na-enwekwa
bu, onodu ojoo nke ngwa ihe eji enyere ndu aka noo.
Site na nweta usoro ochichi onye kwuo uche ya, Naijiria ahuwala ntoputa ulo
oru ndi kwuru onwe ha na ndi nke oha na eze nwe, atumatu ha gbadoro ukwu na
inyere obere ulo oru aka na Naijiria. Ijimaatu, FATE 10
10 Page 11 12
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
Foundation. Otu n'ime ulo oru obiebere ohuru enwere na Naijiria etoputala.
Ulo oru obiebere-a buu odimma aku na uba ndi mmadu n'obi site n'ikwalite oru
itumgbere ahia di na-etiti umuntorobia Naijiria.
Atumatu-a gbadoro ukwu n'inye ndi Naijiria ezi aka oru, ngwa oru, mgbasa aka
n'oru na ego iji hiwe ulo oru ndi nta ga-enwe oganihu. Ebu m n'uche ya buu,
ihewe ulo oru ohuru di otu puku n'ime Naijiria n'afo
2005 na puku ulo oru ohuru ise n'afo 2015. Iji mee ka atumatu a puta ighe nke
oma, FATE na-enye ndi oru ozuzu, nlekota na mgbazinye ego iji nyere ndi Naijiria
aka. N'ezie atumatu a ana ahubeghi mbu,
abughi nani ka enyere obere ulo oru aka iganihu, kama o bu usoro eji ebuso ubiam,
uko oru na mpu di iche-iche agha. N'ihi ntoputa nke ulo oru obiebere di iche-iche
yiri FATE Foundation na-etoputa, ndunyere
ukwu n; atumatu oru site n'aka okpuru ochichi obodo, steti na govamenti etiti
na-abawanye, maa enye m
aka nke ngalaba ulo oru kwuru onwe ha, ulo oru nta ga aru oru n'uzo o kwesiri
iji kwalite ntolite na mmepe n'ala Naijiria. Ichoo Imata-kwu ihe gbasara otu
oru itumgbere ahia na Fate Foundation nke oma gaa n'ulo
oru ha di na Water House Legoosi Stati , Water Corporation, Ijora Causeway,
Ijora, Lagoosi, Naijiria. The Fate Foundation, Lagos
Ulo Oru Buu Akwaa Akwuru Maka Mmeputa Ngwa 9mins. 7secs. Ahia Ga-Enye aka
N'oru Mgbochi Mmeto Ebe obibi
United Nations Environmenet Programme (UNEP n'aha mkpirisi) enyele otu akatapo
ulo oru mmeputa ngwa ahia, oru mgbochi mgbaru ebe obibi. Otu kporo onwe ya Cleaner
Production nke nwere otutu
atumatu ya n'usoro oru na-aga aka na aka maka nrite uru nchekwa gburgburu. Nke-a
buu mgbanwe sitere n'onodu udiri gburugburu obibi zuru oke ebe ulo oru mmeputa
ngwa ahia mebigoro uru ana enweta
na ya, o bu ihe doro anya na United Nations n'agba mbo maka njikota aka-, dika
o na acho mmasi ulo oru
mmeputa ngwa ahia inabata usoro Cleaner Production, enwere obere ihe di, iche
nuzo ntuzi aka na nchikota oru ebe United Nations choro nani ka o tinye oru
n'aka ndi ochichi. Ebum n'uche ohuru maka njikota aka
n'oru-a lekwasiri anya n'onidu nrukota oru nke ga-eweta mmeri nweta uru ana
erite site n'itinye kwu uchu n'oru ndozi gburugburu ebe obibi zuru oke ana enweta
site na mbenata aka na mgbaru ebe obibi.
Ogbako nke izizi emere n'Afrika maka Cleaner Production (CP) buu n'isi ulo
oru UNEP dina Gigiri Kenya, ka anoro mee ya malite n'abali itolu ruo abali iri
na otu nke onwa Ogostu. Ogbako a kpokotara ndi
oru nchekwa gburugburu ebe obibi, ndi ulo oru mmeputa ngwa ahia, ndi nyocha
ihe omimi, ndi nnochite anya ulo oru noro onwe ha na ndi oru ntuputa atumatu
oru sii mba iri abuo. Atumatu oru gburugburu ebe
obibi ga-enwenrila uru obara maka mmepe maa o buru na-achoro ka amatazuo ya
onu. O bu oru Cleaner
Prouction Centres (CPCs) ime ka ulo oru nruputa ngwa ahia mata otutu uru itumgbere
ahia n'aka CP bara ha.
Kenya Cleaner Production Centre (KCPC) buu otu n'ime CPCs iri abuo na abuo
n'uwa dum United Nations Industrial Development Organisation (UNIDO) na-enyere
aka. O bu ulo oru Kenya Industrial
Research and Development Institute n'ahu maka KCPC. O malitere oru n'onwa Julai
nke afo a, maa aga eme ka oha na eze mata aka oru ya n'onwa okutoba. Kenya buu
mba nke iri ano binyere aka n'akwukwo
nkwekorita nke International Declaraton on Cleaner Production na mmepe ogbako
omumuihe emere n'abali itolu n'onwa ogostu "CP buu onodu mmeri-mmeri maka ulo
oru mmeputa ngwa ahia na odimma
gburugburu ebe obibi", nke-a buu ihe oriaku Jane Nyakangbo ji okwa Director
nke KCPC Kwuru. "One
ogugu ulo oru ruru otu Nari anyi jigoro ruo oru kwetara na ha ritere uru di
percent iri isii na ise site na mmejuputa usoro CP okachasi n'udiri oru mkpocha
ihe ruru unyi" Maa gini ka oga-ewe iji banye na CP?
"Mgbe ufodu o nweghi ihe o ga-ewe", buu ihe oriaku Nyakangbo kwuru". Onwere
ike buru ihe na-enweghi ihe ohaa ka ya dika, ikwuchisi valve ike, imechi ebe
nwere oghere ibenata onodu mmagbaru
mmiri ma o bu imeghari umu ihe ndi ahu ruru unyi ha ruputara n'onodu iji ha
meeputa ihe ozo. Oga-abu ihe itunanya nye ndi oru nruputa ngwa ahia maa ha mata
ihe ha na-atufu n'ihi emejuputaghi atumatu CP" . 11
11 Page 12 13
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
Uru gbara okpurukpu nwere ike ibu ihe n'atupu ndi oru mmeputa ngwa ahia
anya iji soro n'usoro Cleaner Production, maa nke-a nwere ike ibu ihe mgbagwojuanya
n'ihi na, onwere ike ibukwara ha odachi maa
agbatikwuo atumatu-a ebe ndi ulo oru gbara-agba noo. Ufodu ulo oru nwetagoro
mmbara site na mmejuputa atumatu CP adighi njikere inabata mgbasa akuko-ndi
ahu. Onye nruputa ngwa ahia na ibe ya
itugharikota echiche banyere CP dika ebe mmadu na onye iro ya na-ehi ura n'otu
àkwà maka na, ana ahuta CP dika mgbakwunye ihe ulo oru ji enwee mbara nke onwe
ya na-adighi uru obarala oha na eze.
CP na-ebenata ma obu wepuchaa kpamkpam mmgbaru ikuku ndu site na mbido tupu
omee. O bu maka atumatu mgbochi karia ogwugwo nke na-adighi anakwete usoro akporo
'end-of-pipe' post pollution
mop-ups nke ga ewe otutu ego iji mejuputa ya.
Onuogugu……….
Ego olee ka ezigbo ahuike na-ewe n'Afrika? 2mins.
Nchoputa ohuru UN mere maka ihe ana emefu iji tuo ndu mmanu n'afo 1999 gosiri
na, nani mba ato n'ime Afrika buu ndi na-amawanye ihe kariri percent iri abuo
maka ego eji aru oru inye umu mmadu umuihe eji
enyere ndu aka dika, oru ahuike mmuta na erimeri ihe ndi ahu na-edozi ahu
dika atumatu eweputara na nzuko social summit, emere na Copenhagen n'afo 1995.
Nchoputa a UNICEF na UN Development Programme jikotara aka wee mee gosiri
na Namibia na emefu ihe ruru uzo ato n'ime uzo iri ekere ego mkpata na mmefu
mba ahu kwa afo maka oru inye umu mmadu ihe
eji enyere ndu aka, Mali na emefu uzo abuo na uma ato ebe Kenya na-emefu uzo
abuo n'me uzo iri. Mba ndi ozo dara ogbenye n'Afrika tinyere Cameroon na emefu
percent asato maka oru-a kwa afo Cote
d'Ivoire percent itolu, Tanzania pecent iri na Benin Percent iri na asato. Pan
African news Agency.
Ngukota Ihe Idemmiri Mebiri na Mozambique 4mins. Akuko "The UN's World
Food Programme (WFP) noo na Mozambique weputara na nso-nso a gosiri
ajoo ihe nke idemmiri mere na Northern Provinve nke mba ahu. Na Gaza, ebe nji-nji
a kachara jiee, akuko-a siri na, Nari mmadu ano na iri mmadu asato nwuru pii
ebe Nari puku mmadu abuo, puku iri ise
na abuo, na iri abuo na ise n'ime Nari puku mmadu isii na ano, Nari mmadu abuo
niile idemmiri ahu
rugidere ebe obibi ha gbapuru n'ulo ha. Oke idemmiri ahu rigidere ulo oru ogbammiri
ndi oru ubi di na chokwe ebe onu ogugu ala ubi akuru ihe lara n'iyi ebe ahu
di Nari puku hectare abuo. INGC kwukwara
na, ákwà-mmiri itolu mebiri ebe ahu, ogologo okporo uzo di, otu puku km, Nari
km isii na ato mebikwara "Ihe ruru nari abuo, iri ise na ano ebe ndi bi n'ime
obodo sii enweta mmiri onunu na olulu mmri emi ebe esi
enye umuanumanu mmiri di iri ato lara n'iyi ebe Nari ulo ahia asaa iri ano na
abuo tinyere ulo oriri-na-nkwari
iri ise na asato mebiri ebe ahu". Akuko a gbakwunyere na, ulo akwukwo di nari
abuo, iri ano na ise ka nsogbua mekutara.
N'imeya, umuakwukwo di, Puku iri asaa na ano, Nari asato na iri ato tinyere
ndi nkuzi di, otu puku, iri ato na otu ka nsogbu ahu meturu aka. Ulo akwukwo
abuo, ebe umuakwukwo biebi n'ime ha di nari itolu, iri
ise na asato ka oke idemmiri ahu mebiri. Ulo akwukwo ndi itiboribo iri ano na
isii nke umu-akwukwo noo na ha di, puku abuo, nari asaa, iri asato na isii lakwara
n'iyi. Nsogbu a kpatukwara ulo oru ahuike aka.
Otu nnukwu ulo ogwu mebiri, ulo oru ahuike ndi nta asato na ebe nlekota oru
ahuike iri na otu sokwa laa ukporo.
Dika ihe Minista n'ahu maka oru oha na eze na owuwu ulo na Mozambique buu
Roberto white kwuru, akuko-a siri na, oke ide mmiri napuru Mozabique nde US
dollar iri ano na ise ego ogara inweta site n'oru 12
12 Page 13 14
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
mbupu ngwa ahia na mba ozo tinyere ihe kariri Nari nde Us dollar abuo,
iri ano na ise n'oru mmeputa ngwa ahia, ebe ngwa aku na uba ulo oru oha na eze
na nke ndi noo nke onwe ha oke idemmiri mebiri ebe ahu
kariri onu ego di, Nari nde US dollar abuo, na iri asaa. Integrated Regional
Information Network
Nkwekorita
Ndi nnochite anya Afrika N'egwuregwu Olympic kwadoro 3mins. 9 secs.
atumatu mkpochapu oria iba
Ndi ndu ga anochite anya Tanzania n'egwuregwu Olympic buu Restituta Josheph
na fokasi wilbroad fullah ndi eguregwu izizi binyere aka n'akwukwo Afrika ji
eme ka oha na eze mata ihe gbasara oria iba dika otu
World Health Organisation siri kowaa. Ana agba ndi egwuregwu Afrika ume ka ha
nye oru Roll Back Malaria n'uwa nile RBM nkwado n'imaka n'ihu nke kowara uzo
kacasi mma iji gwoo maa gbochie
oria-a na-egbu ihe karriri otu nde mmadu afo obula okacasi n'Afrika.
Ndi egwuregwu Uganda kwetakwara i nye atumatu oru RBM Akwado. Ndi nnochite cinya
RBM
n'eguregwu Sydney Olympics, ga-amalite na Seputemba abali iri na ise, noo n'ozuzu
ikpe azu maka i ji gaa egwuregwu-a. Agwala ndi Olympic komiti niile n'Africa
ka ha sonye na-amam aka nihu gbasara oru eji
ebuso oria iba ogu RBM n'aha mkpirisi bekee.
Onye nruchite oru ngo RBM n'okwa Manija buu, Awash Teklehaimanot siri na, Olympcs
buu oghere
kachaa ibe ya iji gbasa ozi n'ime out afo n'uwa dum. Ana enweta ndi, nwoke na
nwanyi buu okaa ibe n'egwuregwu ndi, ana agaghi eleda echiche ha anya. Okwu
agbam ume nke ndi egwuregwu amara nke
oma nwere ikike ime ka otutu mmadu mara uru akwa mmgbochi anunta (Mosquito
Nets) na igwo oria iba ozugbo bara" buu ihe okwuru.
Pan African News Agency.
E welitekwuola aka n'ogu a na-alusi oria AIDS na Naijiria 2mins. Ogu
a na-aluso oria HIV/ AIDS enweela nkwalite kwu aka 'ACTION/ AIDS' nke abughi
otu oru Govamenti
di na United Kingdom kwuputara na Tusdee maka onyinyè di nde pondu asaa nke
enyere Naijiria. Ego a gaesite n'ime nde pondu iri abuo na itolu nke e kewaputaa
maka ndi Afrika.
Ka ona-ekwuputa maka onyinyè a n'Abujà onyeisi otu a na Naijiria bu Mazi Abi
sina otu ACTION/ AIDS hooro Naijiria dika ndi mbu ha ji anwale atumatu 'Project'
a n'ihi onuogugu Naijiria nakwa otutu nsogbu
ha nwere e nwebeghi nlebaanya. O si'ebe otu n'ime umu Afrika isi bu onye Naijiria
o putara na e nwegasiri mkpa na Naijiria nke kwesiri ilebaanya.
Post Express
Oge a kara aka….
Canada ga-edebe semina maka akorongwa e jiedewe ihe ocha 1min. Ogbako
mbu e nwere n'Afrika maka mmeputa akorongwa e ji edewe ihe ocha nke e nwere
na Kenya
n'onwa Ogostu sitere na 'Agenda 21" (isi nke ano) nke nzuko 'Earth Summit' e
nwere na Rio de Janeiro n'afo 1992 nakwa ogbako African Ministerial Conference
on the Environment (AMCEN) nke e nwere
n'April n'afo 2000. Obu ntuziaka maka semina UNEP 6 th High Level maka mmeputa
akorongwa e ji
edewe ihe ocha nke a ga-enwe na monstreal Canada n'onwa oktoba 2000. Mbunuche
bu iji gbanwee aka n'ji ihe ndi e meputera mee ihe nakawa etu esi emeputa ihe.
13
13 Page 14 15
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
Ngalaba nke Umuaka
Mgbada, Onye ako na Uche Megidere Enyiohia na Hippopotamus 9mins.
5secs. N'otu oge gara aga, Lalap nkena-azakwa 'Elephant", Nneg nke bukwa
'Hippopotamus' bidewere izum
nke a na-akpokwa 'Hare' nso. Ogo na ike Lalap the Elephant' nke bi n'ala ma
burukwa eze umuanumanu masiri nnoo izum 'the Hare' nkeoma. N'ihi ikeya kwa,
Nneg the Hippopotamus nke bu anumanu gbara
agba ma dikwa ike bi na mmiri.
Izum, the Hare, na-echeghari anu nke ka ike n'ime ha abuo. O kpebiri ichoputa
nkea. O gakwuru Lalap the Elephant wee si ya na o baghi uru obula n'anumanu
ma tuokwara ya onu si 'o buru na anyi abuo nwee
asompi ogu, m ga-emeri gi'. Lalap 'the elephant' wee dapu n'ochi. O wee si onweghi
ka m si chee na aligara anumanu dika gi bu izum ga-amanye maka n'asompi ogu.
Izum kwetara na ya ga-eme nke a nke mere na Lalap 'the Elephant' mechara si
ka o nye ya ohere. Izum weputara ogologo udo wee nye Lalap otu isi ka o jide.
O gwara ya na ya ga-eji mkpu wee gwa ya oge
o ga-ebido ido eriri ahu. Izum ewee jiri isi udo nke ozo we puo. O jere ruo
na mmiri ebe Nneg the
Hippopotamus bi.
O manyekwawa Hippotamus aka asompi ogu dika o manyere 'Elephant', Hippopotamus
lere ya anya wee si.
'Ezgbomkpari, obere anumanu dika gi bu izum biara imanyeaka asompi'.
Zum gwara ya n'afo ojuju na ya ga-emeri ya ka o gara obere oge, Nneg wee kweta
n'amamaka a. Izum wee nye ya njedew isi udo nke ozo wee si ya na ya ga-eji mkpu
wee gosi mmalite asompi ha. Owee gaa
onodu o chere di mma wee tie mkpu iji gosi na asompi ahu amalitela. Ha abuo
wee bido ido ma buru n'obi na obere ihe a ga-ado ga-eme ka e meria izum kpamkpam.
Ha abuo adoo doo ma o nweghi nke puru
n'onodu ono. Nke o bula n'ime ha jiri ike ya ichoputa ma obukwari izum 'the
Hare' n'ado ya. O
kpachapuru anya kee udo ahu n'ukwu nnukwu osisi. O wee jiri nwayo gaa n'akuku
udo nke ozo. Mgbe o gadewere mmiri nso, o huru na, Hippopotamus' na-ado eriri
ahu karia ibu izum. Lalap 'the Elephant' tie.
'A ma m na o bughi izum na-adokpu m, o nweghi ka izum ga-esi nwee ike di etu
a.
Hippopotamus elelite anya n'akuku mmiri ma nu Lalap. Ochoputara na o ghoro ya
agnugho. O zaghachiri na ya onwe ya ekwenyeghi na o bu o zaghachiri na ya onwe
ya ekwenyeghi na o bu izum na-adodo ya na
onodu 'Kwuru' n'asompi ogu. Anumanu abuo ndi a wee mee udo ma kwekorita na ha
ga-enye 1zum
ntaramahuhu na aghugho o ghoro ha mana izumu 'the Hare' jiri oso gbafue. Tarok
Folktales 14
14 Page 15
Vol. 11 No. 21 (Igbo) CHANGE Radio October, 2000
Okwu Mmechi
Were okwu amamihe Afrika I mutara n'ufodu ilu na-enweghi nchefu mere
ihe.
Maka Akparam-agwa Ele anaghi eyii akpukpo ukwu enyi
Ghana
Nwata nna ya dunyere ohii n-eji ukwu agawa Ibo-uzo
Uganda
Maka idi n'otu Umu anumau jiri otu obi biri aguru egbuo agu.
Nigeria
Otu mkpisi aka anaghi aguchi ngiga. Sierra Leone.
Maka Oge
Mkpuru osisi chara acha anaghi akwu n'elu osisi mgbe ebighi ebi Cote
d'Ivoire
Ihe Nwata buu taa ka nna ya buu unyaahu Liberia
African Proverbs More African Proverbs 15
© 2002 Communicating for Change. All Rights Reserved
Developed by George Mbuagbaw