Go Back
Communicating for Change

Document Body Page Navigation Panel

Pages 1--13 from Igbo script 36


Page 1 2
Vol. 11 No. 20(Igbo)
CHANGE Radio
September, 2000

1
Time Page AHUIKE
Enweele Olile Anya Gbasara Oria Oduru n'aja ocha 'N' ngwucha 6mins. 11 secs. 3 ogbako Emere Banyere oria ahu.
Ogbako agba nke iri na-ato emere maka oria oduru n'aja ocha nke Mba uwa di iche -iche mere na South Afrika bu ebe onyeisi ochichi Mba ahu
Mgbe gara-aga, Nelson Mandela noro choo Ka e nwee ezi mmekorita na nkwekorita abiala na ngwucha.

Nde asaa na ukara nde umuamala Zambia jisike eri otu ma obu ugboro 4mins. 43secs. 5 nri abua na-ezughi oke kwa ubochi.
Otu n'ahu maka ikpe ziri ezi na udo (CCJP) nke Uka Katoliki, emeele ka amata na, ihe Kariri Nde asaa na Ukara Nde Umu amala Zambia bu ndi nwere ike iri nri zuturu
oke otu ugbwo ma obu ugboro abuo Kwa Ubochi.
Onye Minista Sii Na, Iri puku Umunwanyi Naijiria Asato Nwere Oria VVF. 3mins. 8secs. 6 Onu ogugu umunwanyi nwere oria ughere akpa-mmiri Vesicular vagina Festula
(VVF) n'ala Naijiria ruru Iri puku asato. O bu Minista n'ahu maka odinma ndi Inyom na ntolite umuntorobia n'a Naijiria Mere Ka amata nke-a.

Ulo-obaego otu jikotara Uwa, Otu oru obiebere kwuru onwe ha n'ebuso 1min. 7secs. 11 oria mmigbu ara agha.
Ulo-obaego otu jikotara uwa, enyele MAMMOCARE Ghana, ego enyem aka iji, zuputa ndi oru nlekota ndi oria noo n'ulo ogwu maka oru nyocha ahu umunwanyi
ebe ahu n'ihi oria mmigbu ara.
NDI INYOM NA UMUNTOROBIA Nsogbu Umuaka ana Emegbu-Emegbu noo n'ime ya. 7mins. 19secs. 8
Onu ogugu umuaka ana atagbu n'ahuhu n'uwa dum di otutu, Afrika buu oke ibu maka umuaka ya ana emegbu-emegbu. Akuko a ga-atupenye gi azu
gbasara okwu-a kwesiri nlebara anya ozugbo.
Mkpochapu Ikpa Oke 4min. 7secs. 4 Ndi Inyom South Afrika Ka na-adoo oke ruru ha, Okachasi n'ime onodu oru
gbara okpurukpu
Baobab na Jazz 38 na otu n'agba mbo maka oke ruru ndi Inyom awagidele oru udo. 1min. 6secs. 11 Otu abuo di ich-iche ebidole nkuzi maka emume udo n'uwa dum nke afo-a na-etiti
Umunorobia Naijiria.
MGBASAOZI Olu mkpu Nke Nwere onwe 2000. Ihe inye oru mgbasaozi
oghere putura ebe m noo. 4mins. 7
Iji mee emume ncheta ubochi nwere onwe nke oru mgbasaozi Uwa dum nke puku
afo abua, Komiti emume-a di n'aka juru umummadu noo gburugbru uwa dum ihe nwere onwe nke oru mgbasaoi putara nye ha.

Gburu-gburu Ebe Obibi
MMGBARU IKUKU NDU Ndi mgbata oso Enyem Aka Kwere Nkwa Iruzi Leaky Chernobyl Shell 3mins. 42secs. 3
Ndi mgbatsa oso enyem aka, ekwelee nkwa ikwu onu ego ruru Nari Nde Dollar asaa, iri nde Dolar isii na asato bu, ego niile ha kwere na nkwa maka nruzi ihe mebiri
ebe ngwa agha ogbunigwe Kpara mkpa-Mkpa di egwu ahubeghi mbu kamgbe uwa. 1
1 Page 2 3
Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) CHANGE Radio Radio Radio Radio Radio
September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000

2
Mmgbaru ikuku Ndu N'echu Ndi Mmadu Ura na mba Harare. 3mins. 15secs. 6 Etu ikuku ndu sii agbaru, na Harare Zimbabwe Okachasi ahuru oku si n'ulo
oru ndia na-emeputa ngwa ahia na nke ugboala n'asuputa akariala ogo otu mba uwa oru ahuike di n'aka turu anya. Onodu-a kwesiri Ibu iri Milligram ise n'ime
otu cubic Metre oge obula.
Igwu ola-edo n'uzo na-ezighiezi bu nnukwu odachi nye gburugburu ebe ahu. 3mins. 5secs. 7 Etu ndi mmadu si egwu ola-edo n'uzo na-ezighiezi n'ime obodo Impapa di na

mpaghara ugwu Mozambique nke Niassa n'echuzi oha obodo ath ura
Mkpochasi Alammiri Eliat-Aqaba 2mins. 39secs. 10 Ndi oru ime mmiri sii Israel na Jordan jikotara aka n'oru, mkpocha ala osimiri
ufodu amara nke oma ebe Igbere mmiri ndi mmadu n'asa ahu di n'Eilat.
NCHEKWA Udiri Rhino Abuo Enwere N'Afrika N'abawanye 6mins. 9secs. 9

Ka odi ugbua, onu ogugu rhino abawanyele n'Afrika Karia Ka mgbe afo 1980 O bu otu akporo World Conservation Union na nke akporo World Wide Fund for
Nature Mere ka akuko-a puta ighe.

Onuogugu
OGUGUONU Mgbochi Nturu ime Ngwa-Ngwa N'Ghana. 1min. 7secs. 10
Nani otu uzo n'ime uzo ato ndi oru ahuike noo n'ime obodo mepere emepe N'Ghana nugoro maka mgbochi nturuime ngwa-ngwa n'afo 1997, na agbanyeghi
mbo niile ndi ochichi na, otu Planned Parenthood Association nke Ghana na-agba, iji bido usoro-a afo gara aga.

Mgbochi Nturuime Dika usoro mbikota onu? 3mins. 7secs. 10 Site na nkweta igba ogwu mgbochi nturuime, umunwanyi Southern India
na-emegharizi onodu omenala ha, iji kwalite ikike ha nwere n'ime ezinulo ha.

Nga Obidoro...
Mbufe Mpu Site Mba ruo mba ozo Gini Ka ekwesiri ime? 2mins. 8secs. 11 Mkpebi ahu emere na Vienna gbasara mpu na Ikepeziriezi, Ka aturu anya na,
oga eme ngwa-ngwa nabata nghazi nke ogbako ukwu otu jikotara Mba uwa ga-eme n'New York banyere mbufe. Mpu mba ozo.

Ngalaba Umuaka
Ihe mere Wart Hog ji eji ikpere ya aga ije. 3mins. 23secs. 12 Wart Hog na-ekwenyekari n'iwu megidere odimma ya.

Mhisi onye anyaukwu 5mins. 9secs. 12 Mhisi, hyaena Mutara otu ihe ma obu abuo gbasara iri ihe afo ya ga-ebuli.

Okwu Mgbasa
Were okpurukpu okwu amamihe ndia na-enweghi nchefu mere ihe imutara n'Afrika. 13 2
2 Page 3 4
Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) CHANGE Radio Radio Radio Radio Radio
September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000

3
Akuko Ndi Mgbata oso Enyem Aka Ekwele Nkwa Irughari Leaky chernobyl Shell. 3 min. 42secs.
Oru nrughari Leaky Chernobyl nke ogbu n'igwe kpochapuru, nwere ike imalite ugbua ndi mba bekee kwegoro nkwa ikwu ego di Nari Nde Dollar asaa, Iri nde Dolla isii na nde Dolla asato bu ego ga-ezu iji
rugharia ya.
Minista oru onodu odimma gburugburu ebe obibi di n'aka na mba Germany bu, Juergen Trittin Kwuru na ngwuchaa ogbako nke ihe kariri otu enyem-aka iri ano sii mba di iche-iche mere na Berlin; na ha nwere
ike Imalite mgbe na adighi anya itinye mbo ha niile n'oru-a.
Chernobyl, Otu ngwa agha Soviet nke di na Ukraine. ebe ahuru ahubegi ka mgbe uwa, ihe oghom mere, mgbe otu ngwa agha puru oku ebe adowara ya n'onwa April 1986 wee fesaa Oke Okpomku n'ime otutu

Mba bekee.
Ndi Okachamara Si na, Mkpuchi ohuru a, bu nke ga anochizi nke ndi Soviet jiri gbalu -gbalu ruo-ka achoro iji gbochie oke okpomoku ohuru oga achisa. Kama, mbo Ukarine ka na-agba iji nwehachite

onodu aku na uba ya otu okwesiri ka Soviet Union dachara n'afo 1991 emeele ka Ochoo enyem aka site mba ndi ozo maka Ikwu ugwo oru-a. Minista mba Germany n'ahu maka oru ihe na-eme na mba ozo, bu,
Joschka Fisher siri na, ya nwere olile anya na aga atutazu Nde Dolla iri-ise na ato bu ego foduru iji ruo oru-a n'ogbako nke ato otu mgbata oso enyem aka ga-eme mgbe di n'ihu.

Ukarine adichaghi njikere inakweta mbo Germany na-agba iji manye ya ka o hapu atumatu nruzighari ngwa agha ahu mebiri emebi site n'iru udi ngwa agha ohuru abuo nke ndi Russia.
President Leonid Kuchma na-achi Ukraine kwere nkwa ebe mbido onwa June ikwusi oru ikpeazu aga aru na chernobyl ma onwa December gbaa abali iri na ise, maa choo enyem aka nke mba di iche-iche n'uwa
iji rugharia ngwa ndi ahu. CNN. Com

Enwetara olile anya na ngwucha ogbako ukwu emere maka oria oduru N'aja-Ocha 6mins. 11secs.
Ogbako ukwu agba nke iri na-ato maka oria oduru n'aja ocha biara n'ngwucha ubochi Friday abali iri nke onwa July bu nke malitere na akpom oku nke ndi ndu ochichi obodo jiri choo ka ekpochapu oria AIDS na
HIV n'ala Afrika.
President Thabo Mbeki na-achi Souh Afrika ugbua Welitere okwu butere esim agugo n'ogbako-a ebe President Nelsom Mandela buu buru onyeisi ochuchi Mba South Afrika Kwadoro ka enwee usoro ohuru

ga-eweta ezi nmekorita na nghota.
"Anyi Choro usoro chara-acha aga eji gbochie ndi ntorobia ibute oria-a ohuru na mbo bu kpoo iji gbochie nwanyi di ime Ibufe oria-a n'ahu nwa obu n'afo". Mandela gwara igwe mmadu biara ogbako-a na, anyi

Kwesiri ichefu adighi n'otu di na-etiti anyi maa jiko aka gbaa mbo izoputa umu-nne anyi n'ime onodu ojoo-a nke oria HIV na AIDS chere anyi aka mgba n'ihu. Amamikpe ga-adiri anyi maa, oburu n'anyi
emeghi nke-a ugbua.
Ihe Kariri ndi Science puku iri na abua, ndi Dokita na ndi ndumodu gbasara oria AIDS biara ogbako-a were ogologo izu-uka. Ogbako-a bu nke izizi ana eme n'ala Afrika, bu ebe enwere uzo asaa n'ime uzo iri

ekere Nde mmadu iri-ato na ano buu oria AIDS n'uwa niile bi. 3
3 Page 4 5
Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) CHANGE Radio Radio Radio Radio Radio
September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000

4
Site n'olile anya nke enwere gbasara nsogbu mfesa oria-a mgbe di n'ihu n'uwa dum ga -ebutere otutu umummadu, aku na uba tinyere onodu odimma oha na eze, atulere n'ogbakoa, ndi nchoputa ihe omimi
kwuputara ufodu nchoputa di mkpa ha mere na ihe ha jiri nwee olile anya.
"Anyi, ga-enweta ogwu eji agwo oria AIDS n'ime afo asaa di n'ihu", nkea ka Dr. Seth Berkley nke otu Inernational AIDS Vaccine Initiative Kwuru. Ana eme nchoputa di omimi ebe ogwu ohuru eji agwo oria
AIDS noo, ogwu a bu nke emere etu oga enwe ike kujuo nje na ebute oria ka owee kwe mkpachapu n'ahu mmadu.

Ogwu ahu na-ejidotu ndu adilari na mbu nwee mgbanwoju anya n'uzo osii aru oru na mba United States nakwa obodo oyibo. Ulo oru di iche-iche na emeputa ogwu ekwele nkwa inye ogwu ogwugwo oria-a
n'onu ego di ala n'ime usoro ntule onodu ogwu-a n'ala Afrika.
Isiokwu nke ogbako maka oria AIDS nke afo-a bu, "Agbala Nkiti". Ndi isi Kwetara na, onodu-a na-aditu mma nwoyo-nwayo. Usoro nmuta ziriezi Site na mkparita uka di na-etiti ndi nwoke na ndi nwanyi na
ule n'amita ezigbo mkpuru.
'Ndi mmadu anaghi ezozi-ezo ekwu okwu banyere oria HIV' Dokita Saadiq Kariem nke Mahadum Capetowu Siri na, "ndi Inyom na akparita uka gbasara onodu ha, ndi nwoke na-agbakwa mbo ugbua
Iputa ighe n'okwu-a". Otutu Mmadu n'ala Afrika noo ihe di ka, afo iri-abuo-na ise na-ebuute oria-a kwa ubochi, ndi Okanmuta si na, Nani uzo aga esi benata onu ogugu ndi mmadu n'anwu n'ihi oria-a bu,
itinyekwu ego na onu ego ana amawaputa maka mbo ana-agba maka Mgbochie oria-na, ime ka umuntorobia Afrika kpom kwem mata eziokwu di na, etu nwoke na nwanyi ga-esi nwee mmeko na-agaghi ebutere ha
nsogbu." N'ihi enweghi ogwu ogwugwo oria AIDS enwere ugbua, anyi ga na ahu otutu mmadu ka ha n'ala n'iyi n'ihi oria-a tupu anyi achoputa ihe anyi ga-eme", etu-a Ka Sandy Thurman onye ji okwa Ntupata
usoro oru AIDS n'ulo nzuko White House, siri kwuo ya.
Imakanihu enwere ugbua, Mandele gwara ndi biara ogbako a na mmechi nzuko ha bu, ihapu otutu okwu mee ihe ahuru anya.

CNN/ The Associated Press/ Reuers.
Mkpochapu Ikpa Oke 4min. 7secs. Obughi nani ikike nke ulo oru ka enyere umunwanyi Kama, ha nwere ikike n'oru itu mgbere ahia, Onodu
umunwanyi South Afrika n'oru ndoro-ndoro ochichi na itumgbere ahia. abawanyele nke ukwu Ka mgbe afo 1960 oge umunwoke ndi isiocha wekoro onodu n'isi oru niile. Mmejuputa atumatu inye umunwanyi
oghere n'oru etu enyere ndi nwoke emeele ka umunwanyi-mepee anya. Atumatu ndi oru South Afrika enyeele aka n'onodu mgbanwe otutu ulo oru inye umunwanyi ezioghere inaa ugwo oru ha oge ha noo
ezumike omugwo nakwa ndi nwoke. nwunye ha noo omugwo, ma nye onodu ndozi okwu banyere iji ikike maanye nwanyi, na mmekorita ya na nwoke.

Otu nwanyi onye oji ego acho ego (na-achoghi ka akpo ya aha) si na, "onodu-a ndi isi ulo oru chere na, ndi oru niile nabatara nke oma abazighi uru maka umunwanyi okachasi umunwanyi ndi nke na-achoghi ka
enwee ihe di iche na-etiti ha na umunwoke) na-edughe onwe ha site n'ime ka ndi ozo kweta na, ihe niile na-agazi nke oma. Mkparita uka gbasara ilebara uzo aga esi meezie ondou ndi nne na nna anya ebe ha na
aru oru nke kachaa buru umunwanyi, abughi ihe ana atunye onu. Umunwanyi cheziri na-enwere nghotaghe gbasara etu esi achikota maa ebulite mmuo ha nke mere na, enweghi ike Iruputa ihe zuruoke maa oburu
na, emezughi ochucho ha. 4
4 Page 5 6
Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) CHANGE Radio Radio Radio Radio Radio
September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000

5
Dika Felice Schwarts, Onyeisi ma burukwa, onye hiwere catalyst, otu kwuru onwe ya maa na-eme nchoputa na, inye ndumodu siri kwuo, omume-a na-emekpa umunwanyi ahu maa dikwa njo n'onodu ntumgbere
ahia.
"Imeso umunwanyi omume dika ndi ntumgbere ahia di mkpa, agaghi abara nani umunwanyi uru kama, obu nani uzo aga esi mee ka Itumgbere ahia rara ume".

Ka osiladi, otutu ndi okachaa mara n'inye ndumodu maka ndi oru kwenyere na, otutu ulo oru noo na South Afrika enwebeghi ezi onodu ga-agba umunwanyi ume inosike n'oru ha. Iri mpe enwere n'usoro
nkwu-ghachi ugwo, enweghi ozuzu na ezi atumatu iji labara odimma umunwanyi anya bu ihe eji mara otutu ulo oru ebe ahu.

"Otutu ndi-ntuzi-aka oru ebe dara ala n'okwa bu, umunwanyi ndi n'aru oru n'okpuru umunwoke ndi na-amaghi nke ha riri", o bu ihe otu nwamyi oji ego-acho-ego na-achoghi ka akpo ya aha kwuru. "Ihe na-ewutechaa
Karia bu, na, ulo oru ndia, na-ewee umunwanyi nwere oguguisi n'ulo akwukiro omumu ihe itumgbere ahia n'oru maa, nwa nti-nti oge, ahapu ha, ka ha noro ebe ahu laa n'iyi, ya mere ahia ji aga nke
oma ma umunwanyi nwee mmasi iru oru dika ndi okacha mara n'inye ndumodu n'oru". The Mail and Guardian (Johannesburg)

Nde Asaa n'a Ukara Nde Umuamala Zambia jisike eri otu ma obu ugboro nri abuo Kwa ubochi. 4min. 43 secs.
Ihe Kariri Nde assaa na ukara Nde umuamala Zambia na-ejisike riee otu ma obu, ugboro nri abuo ditu mma kwa ubochi, obu, otu Catholic commission for Jusice and Peace (CCJP n'aha mkpirisi bekee) gbara
amaa. Obu n'akuko nke ngalaba otu, CCJ na-elekota atumatu oru usoro mgbado ume weputaru n'onwa August ka anyi siri mata na, onu ogugu mmadu assaa na uma maa ekee onu ogugu ndi Zambia di nde-iri
uzo iri, enweghi ike Ikpata ihe ha ga-eri ebe ahu.
Akuko-a ruturu mgbanwe onodu aku na uba site na mbuda onu ego ugwo onwa, oke onu ahia ebuliri ngwa ahia, Inyefee ulo oru gomenti n'aka ndi kwuru onwe ha na, Ichupu ndi mmadu n'oru dika, Ihe mere
ka onu ogugu mmadu nwere ike izutapu ihe oriri di mma maka ahuike zuru oke pee mpe. Obu eziokwu na-enwere ike ihu ezinulo ndia, dika ndi na-eri otu ugboro nri n'ubochi, ma, nri ha na-eri ezughi oke n'ihi
na umu ihe ndia na enye ndu adighi n'ime ya.
Otu CCJP mere ihe nchoputa na ngalaba ulo uka ha di iche-iche n'a gburugburu Mba ahu gbasara uko nri malite n'onwa October 1999 ruo February 2000. Akuko-a kowaakwara na uko nri di na Zambia
egosiputala onwe ya site na oria, mbawanye onwu umu-ntakiri na umuaka ikwusi agum akwukwo na-erughi-eru.

"Ikwu eziokwu Zambia si mba ndi ozo atubata ihe oriri kariri uzo assaa maa eke ihe ana eri ebe ahu uzo iri bu, ihe doro anya na nruputa erimeri adahachiele azu nke ukwuu n'mba ahu. Nke-a gosikwara n'uko
erimeri ga-adaa." guo akuko-a na mpeji.
Frida Luhila ji okwa director n'oru Mbuso uko erimeri na-azulite onu ahu agha, n'okwu okwuru gbasara akuko otu CCJP weputara, Katoro ndi ochichi maka ebughi uzo mata okuma-ahia di na-atumatu SAP
tupu O. wagide atumatu-a. O siri na, nke-a emeele ka usoro nruputa ihe n'ime obodo na-emepebeghi emepe daa mba nke mere ka uko erimeri di n'ime obodo mepere emepe bu nke butere ngwa ahia idi oke
onu. Luhila mere ka amata na, onu ogugu umuaka na-anaghi etopuzi etopu ugbua na Zambia di uzo assaa 5
5 Page 6 7
Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) CHANGE Radio Radio Radio Radio Radio
September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000

6
ma ekee onu ogugu umuaka Zambia uzo iri. "Anyi kwesinri itinye uchu n'oru ugbo karichaa, ka nhazighari ihe ndi ozo site n'oru ugbo gbaa mgborogwu," etu-a ka okwuru.
The Post of Zambia
Nsogbu DINA Mgbaru Ikuku Ndu Na Harare 3mins. 15 secs. Mgbaru ikuku ndu okachasi ahuruoku si n'ulo oru ndia na-emeputa ngwa ahia di iche-iche na ahuroku si

n'ugboala aputa akariala ogo nke ulo oru Mba Uwa n'ahu maka Ahuike tuputara bu nke na-ekwesighi ikari, iri milligram ise kwa cubic metre na Harare. Otu onye-isi oru ahuike, Fidelis Jaravani, gwara ogbako
omumuihe maka oru nchekwa gburugburu obibi ndi mmadu. Nari puku ugboala ano enwere na Harare bu Ihe kachaa agbaru ikuku ndu ebe ahu, tinyere ahuruoku si n'ulo oru ndi ahu na-emeputa ngwa ahia di iche-Iche,
Kama, Okpoghi Onuogu Ogo mgbaru ikuku ndu noo na Zambia, Obodo ulo oru mmeputa ngwa ahia hiri udu na Zimbabwe.

Osiri na, onodu a otutu mmadu jizi nku esi erimeri na ikpoo ulo oku oge uguru gara-aga malitere n'onwa May ruo July nyekwuru aka mee ka mgbaru ikuku ndu bawanye n'ime obodo ahu. Otutu ndi oru, ugwo
onwa ha pere-mpe na-enweghi ike ikwupu ugwo oku Latiriki nke na-arizi elu, ji nku esi erimeri n'ikpo ulo ha oku. Ndi oru nchekwa gburugburu obibi ndi Mmadu n'ekwusike ka enwee nha gbara okpurukpu aga
ata onye obula dara iwu mgbaru ikuku ndu. Ha tara onodu enweghi kpom kwem, iwu na-achikota mgbaru ikuku ndu n'Mba ahu uta, na adighi emejuptua, usoro iwu nke enwere megidere onye gbaruru ikuku ndu.

"Enwere ihe kariri Iwu iri na asato n'ogo di iche-iche gbasara mmeto gburugburu ebe obibi bu, nke ulo oru asato di iche-iche n'ahu maka ya, ozughi ezu ma odighikwa ire", Charlene Hewat, Director nke otu
nchekwa gburugburu obibi 2000, siri na, nha Zimbabwe na-ata ndi dara iwu-a perempe, na enweghi kpom kwem, usoro eji ata onye dara iwu-a nha emeele ka ikpezi ikpe ha noofee afo isii n'ulo ikpe.
PAN Africa News Agency.
Minista si Na, Umunwanyi Nigeria Buu Oria akpa Mmiri V. V. F. DI PUKU iri Assato 3mins. 8secs.

Umunwanyi buu oria mekutara akpa-mmamiri nwanyi n'ala Nigeria ruru puku iri assato n'onu ogugu, Minista n'ahu maka odinma ndi Inyom na umuntorobia, Hajia Aisha Ismail kwupuara nke-a. Minista
gbara amaa n'Abuja na ngwucha izu ukaa, mgbe ona anabata onye Execuive Director nke ulo oru Mba Uwa na ahu maka ogugu onu umummadu UNPFA n'aha mkpirisi bekee bu, Dokita Natis Sadiq n'ulo oru
ya Akuko-a putara ighe site n'oku nke Group 77 n'aha bekee kporo ka akagbuo ugwo mba na-emepebeghi emepe n'uwa dum jii mba ozo dika usoro gbara okpurukpu iji nyee umunwanyi ikike. Ismail mere mkpokua
n'aha otu G-77 na ngwucha nzuko puru iche agba nke iri abuo na ato nke otu mba uwa mere na New York na nso-nso-a amara di ka "Beijing + 5".

Osiri na umunwanyi noo n'ime mba na emepe-emepe enweghi ikike n'okwu aku na uba n'agbanyeghi onodu mmepe na-erughari n'uwa niile. Onye Ministaa gwara ndi ochichi mba niile na-emepe emepe, ka
ha webata atumatu zuruoke nke ga-aba uru n'ime oghere niile esi ebulite onodu ndi Inyom n'uwa dum elu.
Iga n'ihu n'okwu ya gbasara oria VVF, Ismail tara onodu ubiam uta ma kwaa ariri wee kwuo na, onu ogugu ndi ogbenye umunwanyi Nigeria akariala okpukpu abua kamgbe afo iri abua gara aga, onodu-a bu

nke otutu omumu nwa butere.
O kwenyere na, "mbo niile ana agba maka mbenata ubiam agaghi enwe isi, ma obughi na, atumatu-a hidoro isi na mgbazi onodu odimma umunwanyi etu ha ga-esi nwee ike idi na-emeputa ihe bara uru na,

Ikpata ego n'onodsu nke aka ha". Ogakwara n'ihu kwuo na, umunwanyi ga-enwe ike ruo oru n'oke diri ha nke oma, maa sonyekwa n'okwu ndoro-ndoro ochichi, ime mkpebi na oru ndi ozo nani maa ha guru
akwukwo ma nweekwa ikike n'okwu onodu aku na uba obodo. This Day. 6
6 Page 7 8
Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) CHANGE Radio Radio Radio Radio Radio
September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000

7
Olu mkpu nke Nwere-Onwe 2000 Ihe Inye oru mgbasozi Putara ebe m noo. 4mins. Ezinulo m si puta bu nke ejiri oru mgbasaozi mara. Site mgbe m di na nwata, ndu m nwere mmasi ukwuu
na mgbasa akuko kwuru onwe ya nke na-aru oru n'usoro onye kwuo uche ya. Dika nwamala, onye oru mgbasa akuko n'ikuku ma burukwu onye okaa Iwu, e chere m na, usoro ochichi onye kwuo uche ya na
ikike nke iwu obodo nyere bu, Ihe bara uru maka oke enyere mmadu, n'isopuru ndu mmadu na oghere onye kwuo uche ya di oke mkpa make ihe niile a, ebe o bu na ona anochite any o usoro nwere onwe
kachasi ibe ya.
Oghere onye kwuo uche ya di mfe nweta karia ihe ndi ozo di mkpa, n'ihi ulo oru mgbasaozi di iche-iche kwuru onwe ha enwere. I nwee oguguisi na echiche yiri Ibe ya nye anyi ga-agbaa okwu oha na eze ga-eso
tunye uche ha ume na-enweghi mgbochi obula. Nani ikike mgbasaozi na-enweghi mgbochi n'usoro onye Kwuo uche ya, ga-enye onye ukwu na onye nta oghere itinye onu n'iso mee mkpebi n'okwu buru
ibu mekutara ndoro-ndoro ochichi, aku na uba, odimma oha na eze nakwa omenala mgbe obula eweputara ya. Ndi ga-erite uru na ya ma o bu ndi oga emekuta nwere ike ikowa echiche ma o bu atumatu ha na
abughi n'ke aka ha.
Enweghi oghere kwuo uche mmadu mere ka ikike mmadu nwere n'onwe ya, nwee ebe osukwara, ana ahutakari nke-a mgbe oghere-a na-adikwaghi ozo. Ya mere oji di mkpa na aga naagba mbo huu n'oputara
ighe n'uju. Ana m anyeisi nihi na abu m onye ozo na agbakeri ala n'ime otu Inernational Association of Broadcasting (IAB) Otu na-enweghi ezumike na mbo ona agba maka ohere onye kwuo uche ya kamgbe
1946. A tagom ahuhu buru ibu, ima aka n'ihu na nsogbu n'ime ndum n'ime otutu mba di na America. Mgbochi aka oru, ichughari ndi nta akuko, ndi mgbasaozi n'ikuku na ndi isi edemede mgbasaozi buchaa
nsogbu chere oghere mgbasaozi aka mgba n'ihu. Na agbanyeghi ndi iro ya, mmeri bu nke ya mgbe dum. Dr. Hector Oscar Amengual. Director General Inernational Association of Broadcasing, Montevideo, Uruguay.

Igwu Ola-Edo n'anataghi Ikike na-ebutere gburugburu Ala ebe ahu Nsogbu 3mins. 5secs. Igwu Ola-edo n'anataghi ikike, n'ime obodo Impapa di na Northern Mozambique nke Niassa na abuzi
nnukwu nsogbu nyee gburugburu obodo ahu dika okwu si n'onu ndi ochichi ebe ahu siri kwuo. Oteele oge mgbe iji aghugho egwu olaedo na Niassa jiri mmalite. Onye isi oru nchekwa gburugburu ebe ahu di
n'aka bu, Francisco Pangaya, gwara ulo oru mgbasaozi mba ahu mgbe ona ekwu okwu ebe ndi njem na aga nkiri di na Bilene nke Southern Province, Gaza na, aga ehiwe komiti ga elebaghariri onodu a anya
ngwa-ngwa. Komiti-a ga-enyocha etu ikpu olaedo sii emekuta obodo ahu maa, choputa usoro aga eji gbochie gburugburu ala na aku Chukwunyere di ebe ahu ila n'iyi.

Panagaya siri na, komiti-a ga agunye ndi oru ime obodo n'ahu maka onodu gburugburu obibi ndi mmadu na aku na uba di n'ime ala. O siri na, aga eme nke-a ngwa-ngwa, ebe obu na, onodu-a na adiwanyega
njo. Otu usoro aga ebido aka ugbua iji gbochie nsogbua bu, ichulasi ndi niile sii mba ozo bia wee na-egwu olaedo n'uzo aghugho ebe ahu, O siri na, aga enye umuamala Mozambique akwukwo ikike na ihiwere ha
otu di iche-iche ya na ochichi ime obodo ahu ga arukota oru nlekota gburugburu obibi ebe ahu anya. Nchoputa ola-edo n'ime obodo Niassa, emeela ka ndi okpu-ola gbara obodo ahu agbataobi na ndi sichaa
mba di anya gbata ebe ahu igwu ola-edo na-anataghi ikike. Oteeghi anya, ime obodo ndi ahu noo n'ishi malitere mepewe. Igwu olaedo n'uzo na-ezighi-ezi ebutele mbuzo, mgbughari okpo ro uzo idemmiri sii
aga na mmebi ufodu aku di n'ime ohia noo n'ime obodo Impapa. Enwere akuko anuru nke amaghi ma obu eziokwu, kwuru na, ndi-a na-egwu ola edo na-eji mmiri ogwu na egbu-egbu aru oru ha. Akuko a
mere ka egwu bia ndi mmadu na-eche na ogwu ahu ga-emebiri ha mmiri. Pan African New Agency. 7
7 Page 8 9
Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) CHANGE Radio Radio Radio Radio Radio
September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000

8
Ihe ufu Nke umuaka ana ata ahuhu na-agabiga 7mins. 19secs. Umuaka na-etolite-etolite n'uwa ka ana ata ahuhu n'uzo na-ezighi ezi. Onu ogugu umuaka eji akpaa ego
n'uwa dum Kariri akari. Afrika buu nnukwu ibu n'ihi umuaka ya ana emegbu-emegbu. Umuaka noo ihe dika afo isii ruo afo iri na ano ka nsogbu-a na echi onu n'ala okachasi n'ime ezinulo ndi ahu ubiam tagidere
eze, bu ndi jiri umuaka ndi-a na-enweghi ihe ha maa mere oru diri ha maa, meekwa ka oha na eze jiri umuaka -a kwara ngwa oru. Na agbanyeghi nkuzi ana akuzi n'uwa dum nke out ndi oru di iche iche
n'uwa jikotara ake, iji umuaka atumgbere ahia ka na-aga n'ihu.
Onu ogugu enwere ugbua, gosiri na, nsogbu a ka na-emekuta umuaka ndi ohuru. Iree umuaka n'ahia Ka na-abawanye n'ala Afrika bu ebe onu ogugu umuaka n'aru oru Karichara nke mba ndi ozo n'uwa dum.
Dika otu jikotara ndi oru niile n'uwa dum bu Inernational Labour Organisaiton ILO n'aha mkpirisi bekee siri kowaa, n'ime onu ogugu umuaka enwere na West na Central Afrika di, Otu nari nde, Iri nde ato na
nde abuo, ndi nke n'aru oru na-erughi eru di nde iri ise na ato. Dika ihe otu mba uwa ngalaba n'ahu maka odimma umuaka UNICEF Kwuru, itumgbere ahia umuaka na-adoghachi mmepe azu n'ala Afrika: ndi
kachaa ebute umuaka ana ere-ere n'ahia bu, Togo Benin, Burkina Faso na Mali. Ha na eziga umu ha Coted'voire, Gabon na Nigeria, siri mba dika Cameroon ma obu Equatoria Guinea gaa fere.

Ana enwekwa itumgbere ahia umuaka n'ime mba nwejuru ulo oru ngwa ahia afo, ebe-a ka ulo oru ndi-a zoroezo n'abawanye n'onu ogugu. Umu-agboo noo afo iri na abuo ma o bu karia ka ana amanye ibanye
oru Igba-akwara na igba odibo n'oge ha ka bu nwata ebe umuaka ndi nwoke ka ana agbazinye ndi na-achi anumanu.

N'ime otutu mba, ana esi n'ime obodo na emepebeghi emepe kporo umuaka ndi nwanyi noo afo assato gaa ime obodo mmepere ebe ha ga agba odibo. Otutu ha n'aru oru karia hour iri na abuo kwa ubochi maa
na anatakwa mkpari di iche-iche dika ipia ihe, igba onu nri na imanye ha ka enwee mmekorita nwoke na nwanyi. Ndi nke esi mba amuru ha gaa mba ozo na-ata ahuhu ahughi ikwu na ibe anya.

Na Kenya, ihe dika Nde umuaka ato noo afo isii ruo afo iri na ano na aru oru. N" ime onu ogugu-a, otu Nde umuaka ka eji n'oru n'ime onodu ojoo, na ngalaba oru nkiri ndi njem, ana eme umuaka ndia ncha
n'onodu mmekorita nwoke na nwanyi. Ufodu n'aru oru n'ugbo na ebe ana egwuputa aku di n'ime ala ma o bu ebe eji mmiri ogwu nwere ike imebi ahu ha ruo ogwugwu ndu ha. Ufodu n'aru oru igba odibo bu ebe
ana enye ha mkpari dika ipia ha apipia, imanye ha na mmekorita nwoke na nwanyi ya na igwa ha okwu na, agbawa mkpuru obi. Ndi nke foduru n'aru oru nke onwe ha di ka, ikpoko umuihe ruru unyii, ebe ha na-anata
mkpari ma na etinyekwa onwe ha n'ime ajoo onodu otutu mgbe. Ihe ndia niile na-eme na-agbanyeghi nkwekorita nke mba ahu na otu ILO binyere aka n'akwukwo maka oru "Mkpochapu Iji Umuaka Aru oru
N'erughi Eru".
Amara ulo oru ugbo eji acho ego n'Afrika di ka, ebe eji umuaka aru oru ubi nakwa ulo oru nruputa ngwa ahia ha. ILO ehiwele usoro puru iche iji wepu umuaka n'oru ndia siri oke ike, Ime ka ndi oru nwee ezi
onodu n'oru ha, nke kachaa nke wee huru ukpochapu kpam-kpam atumatu Ikwanye umuaka isi n'oru ugbo na gburugburu mba sub sahara.

Imanye nwata n'oru buu nnukwu ajoo ihe ahuru anya. Ndi bu umuaka taa bu okenye enwere mgbe di n'ihu nke na, enye ha oghere itolite n'usoro nwata, agum akwukwo na ezigbo ozuzu, oga eme ka uwa buru
ezigbo ebe obibi. 8
8 Page 9 10
Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) CHANGE Radio Radio Radio Radio Radio
September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000

9
Afrika okachi, choro olile anya ndia obere umuaka na-enye maka odinaihu. N'agbanyeghi otutu mbo nke uwa niile n'agba iji lekwasi usoro oru-a anya, mkpochapu imanye umuaka oru ka di anya. Onodu-a maka
Odinaihu ka bu mgba di na-etiti mmejuputa iwu siri ike megide imanya umuaka n'oru na, inu oku n'obi nke uwa niile nwere maka mkpochapu ajoo onodu-a.
Newslink Africa
Udiri Rhino Abua Enwere N'Afrika Na Abawanye 6mins. 9 secs. Ka odi ugbua, enweele otutu Rhino n'Afrika karia kamgbe abanyere afo 1980 ruo 1990 ukara, nke, a bu
akuko si n'aka World Conservation Union na World Wide Fund for Nature.
Dika nchoputa emere bu nke akowaputara n'obodo Gland di na Swizerland siri kowaa, anumanu-a di udiri abua n'Afrika nwere nke Ojii (Diceros bicornis) na nke ocha (Ceratotherium Simum) Ka na abawanye

n'ime ohia. Onu ogugu nke IUCH's Afrikan Rhino Specialist Group weputara n'akowa na, enwere ihe Kariri puku Afrikan Rhino iri na ato n'afo 1999 ebe onu ogugu enwre n'afo 1992 di puku asato, na nari
ato. Mbawanye n'onu ogugu-a kara di ebe Southern White Rhino di. Ihe di iche n'onu ogugu Afrikan Rhino ocha na nke ojii ariala elu ebe obu na, White Afrikan Rhino noo n'ohia n'afo 1999 di Percen iri asaa
na itolu ebe odibu Percen iri ato n'afo 1984, etu-a ka akuko-a siri koo ya.
"N'agbanyeghi n'onu ogugu anumanu-a n'abawanye nke oma, odighi afo ojuju ona enye" bu ihe Dr. Martin Brooks, onyeisi oche otu IUCH nke Afrikan Rhino Specialist Group kwuru. "Onu ogugu uzo abuo

n'ime uzo Afrikan Rhino isii di iche-iche anaghi abawanye ma oli, ndi nwere ako na uche n'ilu agha, jiri ike bata n'ala ndi mmadu nwee nke aka ha na Zimbabwe ugbua, nnukwu nsogbu ga adiri otutu onu ogugu
anumanu-a", bu Ihe o gbakwunyere.
Etu ndi mmadu si acho mpi rhino maka igwo ogwu odinala ndi china (obughikwa ogwu nwoke ji enwee ike idinye nwanyi dika otutu mmadu kwenyere) na iruputa obo eji etinye nma mkpa n'aka na mba Middle East

otuu afo gara-aga emeela ka itumgbere ahia mpi Rhino n'uwa niile n'uzo na ezighi ezi ria elu, nke buetre ndokpuru otutu Rhino n'uzo aghugho. Ka osiladli, mbo gbara okpurukpu agbara n'ime otutu mba di
n'Afrika, enyele aka mee ka rhino ojii bawanye n'onu ogugu site n'onu ogugu o dibu, Puku abuo, nari ano na iri-ise n'ime afo 1992 ibuzi puku abua, Nari asaa n'afo 1999 tinyere Nari Rhino ojii abua, iri ato na ano
n'onu ogugu eji-eji n'uwa dum.
Mbawanye nke onu ogugu Rhino ojii na abawanye n'ala Afrika Kamgbe afo 1995 bu ihe agbam ume, maa, onodu otu n'ime udiri Rhino ojii n'ime Rhino ojii ano enweghi olile anya ndu ebe ihe di ka anumanu iri

foduru gbaasara ebe niile n'Northern Cameroon.
Rhino ocha nke South aguputara Site n'ime nchoputa di omimi ihe dika otu Nari afo gara-aga noo ka otu n'ime akuko kachaa Ibe ya n'uwa gbasara oru nchekwa umu anumanu, site na iri abua n'afo 1995 ruo ihe

kariri puku iri na nari ato n'afo 1999. Akuku -a sii na, percent iri itolu na ano bu onu ogugu ndi noo na South Afrika ebe Nari asaa, iri abua na otu bu ndi ekere-abu n'uwa dum. N'aka nke ozo, onodu chere
udiri rhino ocha n'ihu, rhino ocha nke North, di oke egwu, taa nani ihe dika iri abua na ano ruo iri ato n'otu di ndu n'ime ohia na mba Democratic Republic of Congo. Site n'omumu amuru na nso-nso-a, enwere
rhino ochaa North iri ataburu mkporo ugbua.
Akuko a siri na, ihe nyere aka na mbawanye onu ogugu anuohia-a bu, mmejuputa usoro bu kpoo maka nchekwa ndu umu anuohia bu nke, ndi ngalaba ulo oru ochichi, oha obodo, ulo oru ndi ahu kwuru onwe ha
na ndi nwee ala nke aka ha noo n'mba dika South Afrika, Namibia, Zimbabwe, Kenya, Swaziland na Tanzania. "Otu n'ime ima aka n'ihu chere onodu rhino aka mgba mgbe di n'ihu n'ime Afrika na Asia bu, 9
9 Page 10 11
Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) CHANGE Radio Radio Radio Radio Radio
September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000

10
Igbasi Ukwu ike n'oru nchekwa umu anuohia site n'imawaputa ego zuruoke maka oru-a". Bu Ihe Brooks gbakwunyere.
Pan Afrikan News Agency.

Onuogugu
Mgbochi Nturu Ime Ngwa-Ngwa n'Ghana. 1min. 7secs. Nani otu uzo n'ime uzo ato ndi oru ahuike noo n'ime obodo mepere emepe na Ghana nuugoro maka
mgbochi nturu ime ngwa-ngwa n'afo 1997 n'agbanyeghi mbo niile ndi ochichi na otu Parenthood Association nke Ghana n'agba iji malite usoro-a afo gara aga. N'ime ndi oru ahuike di otu nari na iri na abua nugoro
maka usoro mgbochi afo ime ngwa-ngwa, iri itolu na ano n'ime ha maa na usoro inu mkpuru ogwu mbochi afoime nwere ike idi mma maka nke-a. Ka osiladi, nani ndi oru ahuike iri ise na ise mara ogwu bu kpoo iji
egbochi nutru afoime ngwa-ngwa, ano nugoro eziokwu gbasara onu ogugu mkpuru ogwu aga anu kwa mgbe, iri abua mara na, aga anu mkpuru ogwu-a nke izizi, iri hour asaa na abua site mgbe nwoke na
nwanyi nwechara mmeko, iri ano na ano mara ugboro olee aga anu ogwu ebe iri abuo na otu mara etu kwesiri iji kewasia oge aga anu ogwu-a owee di ire. Odighi onye zatachara ajuju ise ajuru ha nkeoma
Family Planning Perspectives

Mgbochi Nturu Afoime Dika Usoro Bikota onu 3mins. 7secs. Site na nkweta igba ogwu ga-ebochi afoime, umunwanyi Southern India na-emegharizi onodu omenala ha,
iji kwalite ikike ha nwere n'ime ezinulo ha omumuihe were onwa iri na ano gbasara omenala na ndu mmadu emere n'afo 1994 ruo 1995 n'ime obodo Gopalapalli, Andhra Pradesh gosiri na, umunwanyi onu ogugu
ha di percent iri ano na ano noo na Di ugbua noo agbata afo iri na ise ruo afo iri ano na itolu ka agbagoro ogwu mgbochi afoime, tinyere umunwanyi ndi di afo iri na ise ruo iri afo abua na itolu nnochiri percent iri
ato na abua na ndi di site iri afo ato ruo iri afo abuo na itolu nnochiri percent iri isi na asaa. Ebe agbata onu ogugu umu nwanyi niile agbagoro ogwu mgbochi afoime di na-etiti ato na isii, ndi nke noo agbata afo iri na
ise na afo iri abuo na itolu di na, agbata etiti abua na asato.
Umu nwanyi gbagoro ogwu mgbochi afoime ajuru ajuju onu kowara na, ha kpebiri ime nke-a n'onwe ha, obughi n'ihi ego iti aka n'obi. Mgbe nwoke na nwanyi Southern India luru Di na nwunye, ha ga ebinyere
nne na nna nke nwoke afo ise ruo afo iri na ise, nke nwanyi ga-eso iwu niile nke nne Di ya nyere ya. Umunwanyi Gopalapalli gbara ogwu mbochi afoime na-ebinyere nne Di ha karia, Ufodu mara nne Di ha
aka n'ihu wee gbaa ogwu mbochi afoime nke na-abughi ochicho nne-Di ha. Site na Ihoro usoro mgbochi afoime nke agaghi ennwe ike igbanwe mgbe nwanyi muchara umu olee ochoro imu gosiri na, nne Di
enweghikwa ikike igwa nwunye nwa ya okwu gbasara omumunwa. Mgbe nwanyi na-enweghi kwa, ike ituru afoime ozo, oputara na, onodu ibu nne Di adiwago nso ma o bu ibu, nnukwu nwanyi, ebe o bu na,
nwanyi muchagoro omumu na-enwekari ugwu. Di ka eromero ndi mere nchoputa, umu nwanyi ndi na emebeghi okenye nabatara mgbochi afoime, gosiri na ha na emeghari onodu omenala ha iji nwee ugwu.
Inernaitonal Family Planning Perspectives.

Ihe ejiri Mara.....
Mkpochasi Ala Mmiri Eliat-Aqaba 2mins. 39secs. N'abali iri nke onwa February, 2000, ihe dika ndi oru ime mmiri iri assato scuba sii Israel na Jordan jikoro
aka n'oru mkpocha ala osimiri ufodu mmiri amara nke oma ana egwu-egwu n'Igbere-mmiri Eliat. 10
10 Page 11 12
Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) CHANGE Radio Radio Radio Radio Radio
September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000

11
Oru ngo a bu, mbo nke ulo oru n'ahu maka ido gburugburu ocha na nke akporo Friends of the Earth Middle East jikoara aka onu wee ruo. Oforo ntakiri Ihe ka, Ibu aru ngwo-ngwo na ngwo-ngwo ndi oru
ime mmiri-a jiri aka ha weputa onwe ha gwoputara n'ala mmiri ruo ton ano. Ndi ozo soro ruo oru-a gunyere ndi nkuzi na ndi oru sii na otu ndi oru ime mmiri na-agbata ebe ahu nakwa ndi sii n'ulo oru, The
Nature and National Parks Protection Authoriy, Eliat Field School, Interuniversity Institute, Kibbutz Nirim, Ma'ale Shaharut Youh diving Club, ulo oriri na mmkwari noo
n'ime obodo, tinyere ndi sii otutu ulo oru, otu di iche-iche na ndi nkiti. Ihe ozo ebu n'uche maa ewepu mkpochasi ala mmiri-wee ruo oru ngo-a bu, ime ka oha na eze matakwuo ogo mkpa onodu ebe ahu noo
ya na igbatikwu aka n'onodu ezi mmekorita di na-etiti Eliat na Aqaba. Abia na mkpokota oru igba mbo maka udo n'ime mba di iche-iche n'uwa na nchekwa otu nga, oru mkpochasi ala mmiri a, ga-enwetarila
ihe bara uru.
Ulo Oba Ego-Otu Jikotara Uwa, Otu oru Obiebere N'ebuso Oria Mmigbu Ara Agha. 1min. 7 secs.
Ulo oba ego uwa, enyele MAMMOCARE Ghana, Ulo oru kwuru onwe ya, ego enyem aka iji wagide ntakiri oru ngo maka ozuzu ndi oru nlekoa ndi oria n'ulo ogwu (Nurses) bu ndi nke jiri aka ha kpoputa
onwe ha maka oru nyochaa umunwanyi nwere oria mmikpo ara n'mba ahu. Nihi nke-a, MAMMOCARE. ga -azu ndi nlekota ndi oria mmadu iri ise weputara onwe ha n'ime upper East Region, obu ha ga ahukwa
maka oru na upper West Region. Onyeisi ulo oru MAMMOCARE Ghana bu, Maazi Frank M. Ghaitey mere ka amata na, aga azukwu ndi nlekota ndi oria mmadu iri-ise ozo n'ime onwa isii iji mee ka onu ogugu
ha ruo otu nari. Osiri na, nka a ga-enyere ha aka iru oru n'ime mpahara obodo abua ahu nke oma.
Maazi Ghaitey siri na, otu-a enyele onu ogugu kariri nari, Puku umunwanyi ise onumu ihe gbasara oria-a maa nyochaakwa onu ogugu umunwanyi ruru puku iri ato. Ezi oru!
Ghanaian Chronicle.

Baobab And Jazz 38 na, otu Women's Human Right wagidere oru udo 1min. 6secs. Afo 2000 bu, afo udo n'uwa dum. Umunwanyi na umuaka kachaa ata ahuhu mgbe obula ana enweghi udo
obodo, oke ruru ha ka anapuru ha n'ike. Iji mee ka udo buru ihe gbara mgborogwu na-etiti umuntorobia ugbu-a noo, Baobab, otu kwuru onwe ya na-adota oke umunwanyi na Jazz 38, otu egwu umuntorobia
kwuru onwe ya n'ahazi iso mpi maka umuntorobia. Ihe ndi aga eji soo mpi-a bu, ide ukwe, Iruputa uwe-ahu (T-Shir) na Ide Mbem abu. Akaa oru obula nke onye ji aso mpia ga-egosiputarila isi okwu-a,
"Waging Peace with Women's Human Rights in Nigeria'' Nnabata aka oru asorom mpia ga-akwusi n'abali iri na ise nke onwa August, anyi ji ohere-a na eweliri ndi nhazi isompia aka abuo elu maka mbo dum ha
gbara iji mee ka oha na eze mata ihe ha na-eme. CFC

Oge Akaraka
Mbufee Mpu na-Etiti Mba na Mba-Gini Ka ekwesiri Ime? 2mins. 8secs. Atumatu ogbako agba nke iri, otu jikotara mba uwa niile noro na Vienna mee gbasara mpu na ikpeziri ezi
putara "nkwudosike nke ima aka n'ihu puku afo abuo chere umu uwa n'ihu. O bu na ngwucha ogbako nke ndi isi ochichi, ndi minista n'ahu maka ikpeziri ezi na ndi isi oka iwu ga-ano na ya kparita uka ka aga-ano
nyee okwu-a nkwado. Ndi ochichi lekwasiri mbufee mpu na-etiti mba na mba anya dika ajoo ihe na echu onodu nchekwa ndu oha na eze ura. Onaghi adiri ndi otu omekome mfe irite uru obula n'ihi usoro oloro
ohuru-a eji agbasaozi, ime njem na iziga ego gburugburu uwa. 11
11 Page 12 13
Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) CHANGE Radio Radio Radio Radio Radio
September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000

12
Aka oru ndi omekome na abawanye; na ngwa agha, ogwu, ngwa ogbara uwa gharii, asarasa ego nakwa ire mmadu. Otu ndi omekome-a na elekwasikari anya ebe umu nwanyi na umuaka noo, iji ha kpaa ego
dika ohu na igba-akwara, ma obu bufee ha mba ozo n'uzo na ezighi ezi. Ndi ogbu mmadu juputara ebe miile, otu aka ahukwa ka iri ngari siri buru ejiri mara ndisi oru oha obodo, ndi ndoro-ndoro ochichi na ndi
ndu oji ejo acho-ego.
Aturu anya na, mkpebi nke Vienna, ga-enye ikike na mkpebi nke otu jikotara uwa niile ga-enwe maka nkwusi isi mba mere mpu fee mba ozo nke ndi omekome n'ahazi. O gakwa etinye uchu n'oru diri mba

obula ihiwe maa lekota oru diri ya anya ebe usoro ikpeziri ezi maka ime mpu na aburu ya noo. Aga, ezigara ogbako UN aga eme na mba New York, abali isii n'ime onwa itolu nke afo 2000 akporo "UN
Millennium Summit" akwukwo-a. The Courier

Ngalaba Umuaka
Ihe Mere Wart Hog ji eji Ikpere ya aga ije 3mins. 23secs. Wart hog emegoro onwe ya ebe obibi mara mma n'ime okpu ulo ochie. O wuliri ulo ya elu maa mekwaa

ka onu uzo ya saa mbara nke oma, maa chee n'obu ulo kachaa Ibe ya mma ebe ahu. Otu ubochi, Wart hog leepuru anya wee huu agu ebe o n'abia n'ike n'ike n'ime mkpuke ya. Egwu utru ya nke ukwuu.

Ngwa-ngwa, o mee ka ona eji azu ya di ike adulite elu ulo ya, jiri odu ya kwaa ya. "Nyere m aka, aga m adaa", etu a ka osiri bekue agu. Elu ulo-a na -agbawa-agbawa. Oga akakwa mma ka igbafuo-Agu.

Ka odi e nweele mgbe ejiri uzo aghugho di etu-a ghogbuo agu mgbe gara aga (I Chatara nkita-ohia okenye nzuzu) ogaghi ekwe ka aghogbuo ya ozo. O mere mkpotu n'oke olu nke mere ka Wart hog tuo
oke egwu sekpuru ala na-ario ka emere ya ebere. O nwere ihuoma maka na-aguru ejighi agu oge ahu. Nke ozo bu na, o turu ya n'anya na, Wart hog sokwara udiri aghugho ahu nkita-ohia jiri ghogbuo ya mgbe
gara aga. O wee gbahara Wart hog gawara mkpa ya, maa kwuo sii "kwuru n'ikpere gi, anu ohia 'dika gi'.
Wart hog jizi nke-a mere iwu enyere ya, ruo taa, ya mere mgbe abula i huru Wart hog ebe o na-eri nri, ona eji ikpere ya kwuru n'onodu na-eme ihere, bulie ike ya elu maa na ama imi n'ala.

When Hippo was Hairy
Mhisi onye anya ukwu 5mins. 9secs. Otu ubochi, dinta abuo buu anu ha gbagburu na alota n'ulo ha, ha dariri anu ndi-a iriri jiri akpa ejiri achaka

mee kechie ya buru nisi ha. Mgbe ha n'aga, ifirifo anu ahu ha buu wee na-adapu n'okporo uzo ha si aga.
Chingaungau na Mhisi nookwa n'ohia agba nta otu ubochi ahu. Oge ha garuru ebe ufodu ifirifo anu ahu dapuru n'ala, ha jiri anya aguu buchara ifirifo anu ahu maa sorozie okpo uzo ndi dinta ahu si aga na-eri anu

obula dapuru n'akpa ha.
Mgbe ha ruru n'ime obodo, chingaungau na Mhisi zoro n'ime ohia maa na-ele ndi dinta-a ka ha sii zeda ibu ha maa, na-edokwa ha n'ime ulo ebe odighi onye ga ezuru ha. Obere ulo-a di gburugburu nwee mmpio

di gburugburu na-etiti mgba-aja ulo-a maa, o nweghi onu uzo.
Ozugbo dinta-a siri ebe ahu puo, chingaungau sii na mmpio zoro-ezoro riba n'ime ulo-a na-enweghi nosgbu obula. Obia huu anu-a, kpowa Mhisi ka o bia ngwa-ngwa soro ya riboro ahu. Mhisi lee anya na

mmpio ntakiri-a fee n'isi. Ogwara chingaungau "Odighi, e nweghim ike iribata site na mmpio ahu. Tooro m ufodu anu n'ezi". 12
12 Page 13
Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 Vol. 11 No. 20 (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) (Igbo) CHANGE Radio Radio Radio Radio Radio
September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000 September, 2000

13
Chingaungau juru aju wee si, "agam enyere gi aka iribata n'ime". O riputra wee nyere Mhisi aka o sii na mmpio ribaa n'ime. Mhisi rigidere afo eju ya, O choozie isite na mmpio ripu, Chingaungau ekweghi ya
maa si, "enyim rie nri, I maghi oge i ga ahukwa nri efu di ka nke-a ozo".
Mhisi rikwara ozo, ruo mgbe afo ya na-achozi mgbawa, "Irijubeghi afo nke oma", nke a ka chingaungau kwuru maa lee ya anya nke oma. 'Odighi, e chere m n'inwere ike irikwu obere, I kwesighi ila ezigbo nri

ukporo".
Mhisi loro okpurukpu anu ozo. Chingaungau manyere ya ka o rikwuo otu okpurukpu anu ozo. Mgbe odoro ya anya n'afo Mhisi ejule karia maa ogbawaghi agbawa, chingaungau esi na mmpio wupu. Mgbe

Mhisi gbara mbo ka o soro wupu, afo ya afuo ntakiri ka okpafara n'oghere nta kiri ahu. O nweghi ike iga ihu maa obu azu, Mbo niile ona agba enweghi nke bara uru kama o mere ka okpafara kwuo ebe o na-ariosi
chingaungau ike ka o nyere ya aka.
Chingaungua eleghi anya n'azu maa gboro uja n'ike n'ike karia etu osi agbobu mbu siri n'ime ohia puo. Nke-a mere nkita noo n'ime obodo gbaasa oso n'iwe, na-agboo uja n'oke olu, wee buso onyeohii ahu

agha n'ime ulo ahu, ebe chingaungau jiri nwayo doro isi onwe ya laa.

Okwu Mmechi Were okwu amamihe ndia bu ihe i mutara n'Afrika dika ihe enweghi nchefu.
Maka Nnata Ugwo Okwute aturu n'iwe anaghi erukari ebe achoro ka o ruo.
Nke-a si Malawi
Onye kpara nku ahuhu kporo ngwere oriri Nke-a si Cape verde Island io

Iyi taa, anyanwu eketa ihere Nke-a si a Ghana.
Maka Amamihe Ugbo-oka ahihia na-ana eto n'ime ya, etozughi oke inwe oka n'ime ya.
Nke-a si Ghana
Metu ogu n'ala ka o nye gi erimeri buru ibu Nke-a si Sudan.

Maka Ndidi Idi nwayo abughi adighi ike
Nke-a si Elhiopia.
Ndidi bu akwa na abuta otutu akwa Nke-a si Zimbabwe.
African Proverbs/ More African Proverbs
13

Page Navigation Panel

1 2 3 4 5 6 7 8 9
10 11 12 13

 

© 2002 Communicating for Change. All Rights Reserved
Developed by George Mbuagbaw