Go Back
Communicating for Change

Document Body Page Navigation Panel

Pages 1--14


Page 1 2
1
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
Mmepe
AHUIKE
Umu Akwukwo Ndi Nwanyi Malawi Ga-Elerila Ahu Maka HIV 9mins. 12secs. 3
Mkpebi ulouka mere gbasara nyocha ahu umu nwanyi ndi choro inweta
oghere agum akwukwo na-efu n'ulo akwukwo ha obula nke nani ndi nwanyi
na-aga ebutele esimagugo.

Mgbasaozi Gbasara Condom Bu Ihe Putara Ighe 7mins. 6secs. 5
Uloru Mgbasaozi n'ikuku nke mba Zambia akwusila mgbasaozi gbasara
condom. O putara ihe doro anya nke ukwuu nye govumenti.

NDI INYOM NA UMUAKA
Iji nkiakaramanya edinye umuaka na-abawanye na mba Zimbabwe 10mins. 5secs. 6
I ji aka-ike edinye umuntakiri na-abawanye na mba Zimbabwe, Mba South
Afrika ekwekoritabeghi n'ihe butere onodu-a nakwa etu aga esi hu maka ya.

ORU-UGBO NA NCHEKWA ERIMERI
Oke Unwu Ga-Adaa Ozo Ma Igurube Buo Aghara Ha. 5mins. 8
Ka Tanzania sichara n'oke uko erimeri puta, mba ahu noo na nsogbu nke oke
unwu ozo n'ihi aghara nke igurube di iche-iche choro ibuso ya.

Gburugburu Ebe-Obibi
UBOCHI
Onodu Ubochi Ga-Adiwanye Mma Ebe Dum Na Mba Kenya N'ime Afo 2002 6mins. 6secs. 3
Aga arunyere Kenya ngwa oru bu igba maka nlekota onodu ubochi n'afo
na-abia-abia, i ji mee ka aka oru maka agugu onodu ubochi buru kpoo ma

kwalite usoro ido-aka na-nti ngwa-ngwa.

IRUNYI
Akwa Ibom Steti Di Na Naijiria Na-eme Nchoputa Banyere Mmanu Fesara Ebe ahu 3mins. 8secs. 4
Govumenti Akwa Ibom Steti di na, mpaghara anyanwu Naijiria ehiwele
Komiti mmadu irinabuo ga-eme nchoputa gbasara mmanu fesara na Steti
ahu n'onwa Novemba 2000.

Mmanu Si N'ime Ngine Suputa Na-Ebute Nsogbu Di Iche-Iche 6mins 7secs. 7
N'ime Obodo Mmepere
Mmechi emechiri uloru British Petroleum Zambia Plc ebutele odachi nye
mkpofu mmanu ndi nke ejigoro ruo oru bu nke na emenye gburugburu ebe

obibi egwu na Zambia.

NCHEKWA NDU
Akpufele Inyinya N'ugwu Kenya 5mins. 4
Akpola oku maka ikpupu otutu inyinya aka ngwa-ngwa site Ugwu Kenya
forest i ji gbochie odachi ebe obibi ha.

Wetland World-Uwa Nke Aga Achoputa 9mins. 11
Ka iri afo ato gachara kemgbe emechara ogbako maka Wetland, Ramsar
ekwuputala abali abuo nke onwa Feburuwari 2001 dika ubochi emume
Wetland.
1
1 Page 2 3
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
2
Seychelles' Nature Reserve Aputala Ighe Na-Etiti Mba Di Iche-Iche N'uwa 5mins. 5secs. 7
Dika uloru nchekwa ihe okike nke izizi n'Afrika soro mee emume
International Biodiversity Observation year, Cousin Island di na Seychelles
enwetala ihe nribama zuru uwa dum maka oru ebe ihe nkiri ndi njem na nke ala

gbara oke osimiri okirikiri.

Uche Onye
NDI INYOM
Iha Nhatanha Na-Etiti Ndi Nwoke Na Ndi Nwanyi Di Mma Maka Usoro 17mins. 6secs. 8
Ochichi Onye Kwuo Uche ya
Yvonne Malhunge, Onye Okeiwu mba Zimbabwe kwuru okwu gbasara onodu
ndi Nwanyi n'usoro ochichi onye kwuo uche ya mgbe di n'ihu, ma gbakwa
ha ume itinye aka n'okwu ochichi.

Nkwekorita
NDI INYOM
Onyinye Maka Ezi Nghota Akporo, Our People O! Grant for Better Understanding 6mins. 10
Ndi Nwanyi ano na-ede edemede akwukwo anatala onyinye izizi nke "Our People O!
Grant for Better Understanding".

ERIMERI
DRC Eweputala Udiri Akpu Ohuru Di Iche-Iche 3mins. 5secs. 10
Uloru National Institute for Agronomic Study and Research nke mba Democratic
Republic of Congo eweputala uzo akpu ohuru di Nari abuo di iche-iche bu ndi
eleghara onodu ha n'uloru International Tropical Agriculture Institute nke Ibadan,
Naijiria.

Ogeakaraka
IKIKE
Ikike Okpomoku Nwere Mmeghari Ma gbaa Mgborogwu 4mins.. 5secs. 11
Di Oke Mkpa N'ime Puku Afo-a
Dika onye Executive Director nke UNEP, Klaus Toepfer Kwuru, green
environmentally friendly energy, di ka ikike site n'okpomoku anyanwu,
ikiku na ike nkwoghari bu otu n'ime ihe di oke mkpa chere umu mmadu
aka mgba n'ihu n'ime puku afo ohuru a.

Ngalaba Umuaka
Onye Dinta 17mins. 12
Jamina choro ibu dinta kama oge ofuru n'ime ohia, O matere ndi enyi

ohuru nke gbanwere ebumnuche ya etu O siri huu uwa a.

Okwu Mgbake
Jiri obiuto nke oguguisi Afrika na ufodu ilu na-enweghi nchefu mere ihe. 13 2
2 Page 3 4
3
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
Akuko
Umu Akwukwo Ndi Nwanyi Malawi Ga-Elerila Ule Ahu Maka HIV 9mins. 12secs. Esimagugo daputara ugbua na mkpebi nke otu uka abuo kachaa ibe ya na mba Malawi mere gbasara ile
nwa akwukwo nwanyi choro oghere agum akukwo na-efu n'ulo akwukwo Sekondiri ndi nwanyi ahu maka HIV. Otu uka, Church of Central Afrikan Presbysterian (CCAP) siri na, onye obula choro ka ulo
ukaa nye ya ohere agum akwukwo na-efu nke gunyere ikwuru onye ahu ugwu akwukwo, ebe obibi, erimeri, na ngwa niile eji agu akwukwo ga-agarila ule ahu maka HIV. Ndi isi ulo-uka ahu nyere iwu ka
ana-eleghari ndi nke gafegoro n'ule ahu malitegoro agum akwukwo na Neno Secondary School di n'ime ochichi obodo Mwanza ahu kwa afo obula. Ndi niile achoputara na ha nwere oria HIV n'ime afo ano ha
noo n'ulo akwukwo agaghi kwa erite uru obula n'usoro agum akwukwo na-efu ahu, O buru na ha choo
inoro n'ulo akwukwo ahu, ha ga-ahuzi maka ego obula ha ga emefu maka agum akwukwo ha.

National AIDS Control Programme (NACP) akowala mkpebi a dika nlelianya na nkewa. Onye gi okwa Dareto nke NACP bu, Owen Kalua gwara ndi nta akuko na, O bu atumatu govumenti i mee ka ahara ikpa
oke obula megide ndi bu oria HIV. O siri na, "nke a ga-abu ihe ihere nye ndi niile na agaghi etozu oke
inweta ohere agum akwukwo na-efu a". Kama Reverend Daniel Gunya, odee akwukwo ukwu nke CCAP Blantyre Synod, ekwetaghi n'onodu eji enye ohere agum akwukwo na-efu a nwere ikpa oke

obula. O siri "na-ezie, aga agwa ndi na-achoghi ya ka ha kwuora onwe ha ugwo agum akwukwo ha ebe ndi choro ya ga-esorila usoro a, ya mere, nke a abughi ikpaoke obula". Kalua nke NACP ka na-ekwu na
ndi uka a na-ele HIV anya dika oria mmadu igba na-ezi na enwghi afo ojuju ebe otu nwoke ma o bu otu
nwanyi noo na-ebute. Osiri na umuntakiri nwanyi ndi ahu aka ha di ocha, nwere ike site na aka ike, mmekorita ha na nwoke ma obu site na mgbanyere obara bute oria ojoo a ga-abuzi ndi ga-ata ahuhu n'uzo

na-ezighi-ezi.
Charles Gunsaru, dareto nke ulo akwukwo sekondiri na ulo akwukwo ukwu n'ime Ministri oru Mmuta,
Sayensi na Tekoluzu di n'aka siri na, O bu ihe ituanya nye uloru ya gbasara mkpebi nke ulo uka ahu mere. O siri, "O turu anyi na anya n'ihi O dibeghi onye O bula jiri onodu HIV mere ogbado ukwu i ji nye ihe

obula, obuladi oru na mba Malawi" uloru a noo odu dika onye nlekota oru, nwere ike inye ulo-uka a nani ndumodu. O gaghi amanye ya igbanwe mkpebi ya.

Reverend Gunya siri na, O buru ya ihe itunanya etu mkpebi ulo-uka ya siri kpalite oke mkpotu a, karia inata otito maka mkpebi ya n'oru mbuso HIV na AIDS agha. O siri na ndi ndu uka chere na nke a bu otu
n'ime uzo aga esi mee umuagbobia ka ha hara ije na nwoke ma harakwa i bute oria onwu na mfu a. O kwesiri ike na, "nyocha obara a ga-eme ka umuagbobia anyi hapu i ga piom-piom piom na-ezi ma mee ka
ha ghota ihe mere O jiri di mkpa ha igbochi ihe obula ga-eme ka ha bute oria onwu na mfu a. Malawi bu
otu mba n'ime uwa dum oria HIV na AIDS hiri udu na ya. Dika onugugu nke National AIDS Control Programme weputara na nso nso a, ihe ruru pesenti iri mmadu na ano n'ime Nde mmadu iri enwere na

mba Malawi nwere nje na-ebute oria AIDS. Africa online

Onodu Ubochi Ga-Adiwanye Mma ebe Dum Na Mba Kenya N'ime Afo 2002 6mins. 6secs. Aga arunye ngwa oru bu kpoo maka nlekota onodu ubochi ebe dum na Mba Kenya n'afo na abia-abia.
Atumatu a eji aru oru n'ime mba irinano na-emepe emepe ka aga atuntuala ya na Guyana Islands di n'ofe West Afrika Coast. Aturu anya na nke a ga –akwalite oru ogugu onodu ubochi etu o ga abu kpoo na igba
ma mee ka mmata onodu ido aka na nti gbasara onodu ubochi di mfe ngwa ngwa. Maazi Ayub Shaka na-aruchite
oru n'okwa Director of Meteorology siri, "anyi ga-adi njikere I mee ka ndi ahia anyi nweta kpom 3
3 Page 4 5
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
4
kwem akuko ziriezi ha choro". Mgbe O na-agwa oha obodo okwu n'uloru ya, Maazi Shaka siri na, ngwa tekeleuzu ohuru a eji amata etu ubochi ga-adi, ga-eme ka enwee udiri nke ka mma karia nke di ugbu a
maka oru eji amata mbanwe onodu ubochi. Ngwa ohurua zuru uwa onu ga-aru oru na mba Europe na Afrika. O ga eweputa nkowa etu ubochi di kwa nkeji irinaise obula, o bughi nke di ugbua na-eweputa
nkowa kwa nkeji iriato obula.
O bu uloru Kenya Meteorological Department ga-ahu maka oru ngo a n'ime mba di iche-iche n'Afrika, Caribbean na Pacific ji kwado onwe ha maka ya bu oru. Maazi Shaka kwuru na European Community
amawaputala ego enyem aka maka mba niile a i ji wulite uloru nlekota onodu ubochi ha nwere. Kenya ga-arunye
uloru ohuru ebe esi e amata ka onodu ubochi di ma renyegharia ngwa-oru n'ime uloru iriatonaise ebe O si achikota onuogugu onodu ubochi na mpaghara di iche-iche na mba ahu i ji mee ka onodu ha

tozuoke n'onodu ngwa tekeleuzu nke agba ohuru. Aga azuputa ufodu ndi sanyesi n'oru onodu ubochi dika otu n'ime atumatu oru ngo a eji n'aka kemgbe afo ato. Oru ngo a ga-abara Kenya Drought Monitoring
Centre uru n'oru o na aru na mpaghara IGAD. Europe's Organisation of Meteorological Satellites siri na
ngwa olorohuru a ga-aru oru ugboro iriabuo karia nke enwere ugbua bu Meteosat Satellite na aru. Nke ohuru a ga-enwe usoro irinabuo o si enye nkowa kara nke meteosat nwere nani usoro ato. Nke ohuru a

ga-eweputa nkowa doro anya gbasara onodu ubochi di n'ime obodo. Otu mba Europe n'ahu maka oru ogugu onodu ubochi si na, nkowa doro anya nke a ga-ewputa nwere ike inyere oru nchikota njem
ugboelu na nchekwa oru njem mmiri aka buru ibu.
Aturuanya n'oru a akporo New Satellite Network ga-aru oru n''uju n'ime afo 2005. Nke a ga-enye aka n'oru nlekota onodu gburugburu ebe obibi dika ala itogboro ukporo, mgbanwe onodu ubochi na oku.
The Nation

Akwa Ibom Steti di Na Naijiria Na-Eme Nchoputa 3mins. 8secs. Gbasra Mmanu Fesara ebe Ahu
Akwa Ibom Steti govumenti di na mpaaghara Owuwanyanu nke Naijiria, ehiwele komiti mmadu irinabuo nke Okamuta Etie Akpan muru ihe gbasara akuko ime ala mmiri bu onyeisi oche ya, I mee nchoputa
banyere mmanu gbapuru ma fesaa na steti ahu n'onwa Novemba 2000. Komeshona oru nlekota gburugburu
ebe obibi ndi mmadu di n'''aka na steti ahu bu, Obong Isidore Akwan-Ebe, kwuru mgbe O na-agwa ndi nta akuko okwu si "akuko ruru uloru a aka gosiri na mmanu fesara otutu ebe n'ala di n'igbere mmiri na steti a".

O siri na-enyere komiti a izuka isii i ji butere govumenti nchuputa ya. O gbakwunyere na, "Komiti a ga-eji ihe nkowa O nwetara site na ihe Satellite ewunyegasiri ebe di iche-iche maka nlekota onodu gburugburu
ebe obibi di mkpa n'Akwa Ibom weputara aru oru.
Ndi-isi uloru Exxon/ Mobil goroo ukwu na aka ha n'onwa Novemba gara aga mgbe ha kpoghariri ndi nta-akuko gburubguru okesimiri ebe ahu kwuo n'odighi mmanu fesara na steti ahu. Onye komshona a
kowaputara Exxon/ Mobil, Elf na Shell dika uloru ato amara nke oma maka igwu mmanu n'igbere mmiri
nke Akwa Ibom. O siri na-aga-eme ka ohaneze mata mgbe na-adighianya uloru nwee ngwaoru ebe mmanu ahu siri gbapuo ozugbo Komite ahu meechara nchoputa ya.

All African Com.

Akpufele Inyanya N'ugwu Kenya 5mins.
Okanmuta Wangari Maathai na-achikota Greenbelt Movement, akpola oku ka akpupu otutu inyinya site Mt Kenya Forest. Okanmuta Maathai e degarala onyeisi uloru na ahu maka ndi oru obodo bu, Dr. Richard

Leakey akwukwo maka ozuzu anumanu ndi ahu. Nwanyi a siri, anumanu ndi a ga-ebutere onodu ebe obibi di n'ugwu ahu nsogbu n'ihi na, ebe ahu ka mmiri ozuzo si akwoba n'ime osimiri. O siri na-aga 4
4 Page 5 6
5
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
echekwarila ebe ahu n'uzo obula. "Ikpuga anumanu ndi ahu n'ime ohia gosiri n'onodu ala-ikponku na mba
Kenya eruole etu onu apughi ikwu. O siri na, inyinya bu anumanu na-ebi n'ala ebe mgbaraja di".

Nwanyi ahu siri na, unwu na aguu ga-agba mgborogwu na Kenya ma o buru na-echekwaghi ohia, ebe o bu na ha na-adota mmiri-ozuzo nke na-akwado oru ubi n'uzo buru ibu. O kwuru nke a i ji saa akuko ndi
nta-akuko koro banyere mkpuga ndi ozuzo anumanu na-akpuga inyinya ha na mpaghara Gathiuru nke Mt
Kenya Forest ichoo ebe anumanu ndi ahu ga-akpata nri. Dr. Chris Murungaru na-anochite anya Kieni n'ulo nzuko omeiwu Kenya, ebe Gathiuru wunyere mekwara otu udiri mkpesa ahu. Govumenti zahachiri

ngwa-ngwa kwuo na ya na-elebara etu ndi ozuzo anumanu ndi ahu si eme ihe ha anya. Onyeisi ndi uwe-ojii noo na Nyeri bu, Elijah Shamalla gara njem nlete ebe ahu i ji mata ka onodu nchekwa ndu di ebe ahu.
Anuru kepu-kepu n'ogbaghara nwere ike idaputa na-etiti ndi ozuzu anumanu na ndi oru ugbo bi na ngwucha
ohia di ebe ahu.

Okanmuta Maathai zahachiri Omar Sallat ji okwa Deputy District Commissioner nke Laikipia, kwuru na, ndi ozuzu anumanu ahu ji ujo akpupu anumanu ha. Okanmuta Maathai siri, " O kwesiri i maa n'onwere ndi
ozo di njikere izoputa oke ohia ndi ahu n'uzo obula. Mmiri-ozuzo na mkpuru-osisi dara-uko n'ihi mmebi
oke ohia, ya mere ndi Kenya jiri noro n'oke aguu". The Nation

Mgbasaozi Maka Condom Kwesiri I bu Ihe Akowara Nke Oma 7mins. 6secs. Mgbasaozi nye ohaneze maka mbuso oria HIV/ AIDS agha na mba Zambia nwere mkpobi-ukwu mgbe
uloru mgbasaozi n'ikuku mba ahu wepuru nzisaozi niile gbasara condom nke kwesiri ibu ihe govumenti nyere nkowa doro anya iputakwa n'ikuku ozo. Ndi ndu uka si n'otu Christian Council of Zambia, Otu
agadaga otu nke otu uka di iche iche nwere agba so na ya, emele mkpesa putara ighe kwuo, n'ihe igbasara n'ozi na nso-nso-a site n'uloru Zambia National Broadcasting Corporation (ZNBC) gbasara nluso oria
AIDS ogu, enweghi ezi ntuziaka o na-enye ma burukwa ihe ga agba ndi mmadu ume i ga piom-piom-piom.

Echiche govumenti abughi otu n'okwu a. Minista oru ahuike di n'aka bu Enoch Kavindele, n' izu-uka gara-aga gwara ndi ndu uka Kriast ka ha kwuo nke bu eziokwu n'okwu gbasara ogo oria AIDS fesarugoro, ma
Minista oru mmuta di n'aka bu, Godfrey Miyanda dunyerele ndi ndu uka ukwu n'okwu a. Onyeisi ochichi
mba Zambia bu, Frederick Chiluba n'afo 1991 kporo Zambia mba okpukperechi ndi otu Kriast na-achi n'ime ya siri na; ya chere na mmadu i ji condom eme mmeko gosiri enwaghi mmuo Chineke na ndu

mmadu. Uloru ZNBC siri na, mkpebi ya mere maka nkagbu mgbasaozi banyere condom bu ikwenye n'ihe ohaneze choro, ebe ndi na-aluso oria AIDS ogu katoro omume a ngwa-ngwa. Masauso Nzima,
onye nchikota oru AIDS na Zambia maka otu uloru di na UK akporo AIDS Alliance siri na, "ndi mmadu
amaghi etu onodu ajoo a oria HIV na AIDS rugoro n'ime mba Zambia". O gbakwunyere na, "condom bu otu n'ime uzo esi egbochi oria AIDS, e cherem na ha kwesiri i mata na agaghi elehara ya anya ma oburu

na-achotaghi usoro ozo ka condom mma".
Ihe ruru Pacenti iriabuo ndi okenye Zambia ka oria HIV ji aka. Dika onuogugu govumenti weputara, ihe
kariri Nari puku mmadu asaa anwuola n'ihi oria AIDS Kemgbe afo 1980 malitere. Ihe kariri Nari-puku umuaka isii na puku iriise aburula umunwangwe n'ihi oria AIDS. Ka odi ugbua, onuogugu umuaka ejiri

oria HIV na AIDS muo noo na-agbata puku iri abuo naise na puku iriato ebe umuaka asaa n'ime umuaka iri amuru n'onodu a anaghi eru afo ise tupu ha nwuo.

Dika omenala siri di, ikparita uka gbasara mmekorita nwoke na umunwanyi n'ogbo-oha bu aru. Nzima siri na, mkpu niile a ana eti n'ihi condom bu na, mgbe etinyere mgbasaozi ahu n'ikuku bu mgbe otutu 5
5 Page 6 7
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
6
mmadu na-ege nti "Oge ndi nne na nna na umuaka ha na-eri nri anyasi". Eleghi anya, oge ahu ezighiezi, ma ama m na-enwere ihe ana akpo ntuziaka ndi nne na nna". Iwu ndi uka kwadoro n'uzo aga esi gbochie oria
AIDS bu, iwepu aka na mmekorita nwoke na nwanyi n'uzo na-ezighi ezi.
Nils Gade, Onyeisi uloru Zambian Society For Family Health kwuru n'oru UN AIDS akporo UNAIDS "ekpebiele na, condom bu uzo kachasi mma eji egbochi AIDS okachasi maka otutu umuamala Zambia

na-amaghi ma ha bu oria-a ma o bu na ha ebughi ya". Integrated Religional Information Network.

Mmegide Umuaka Na Mmekorita Ndi Nwoke Na Ndi Nwayi 10mins. 5secs. Abawanyele Na Zimbabwe
Ulo ikpe Zimbabwe nwetara onuogugu okwu gbasara mmegide umuaka maka mmekorita ndi nwoke na ndi nwanyi kariri puku abuo nke mekutara umuaka di onwa ato Ndisi ochichi na otu di iche-iche kwenyere
n'onuogugu a eweputara adighi ebe oruru ma oli. Mmegide obere umuaka na-abawanye na mba Zimbabwe, onodu mba South Afrika na-ekwekoritaghi ihe kpatara ya na-etu aga esi buso ya agha. Otutu mgbe, O bu
ndi ikwu na ibe na-elekota umuaka ahu anya na-emegide ha n'uzo mmekorita nwoke na nwanyi nke mere ka O sie ike ichoputa mpua. Ebe okacha ewute ndi isiochichi na otu ndi inyom di iche-iche bu onodu nke
mpu a ji abawanye site n'aka ndi mmadu ndi dibia-amusu duruodu ka ha manye obere umuaka mee
mmeko i ji mee ka oria ha na ekweghi ngwota laa. Ndi na akpa agwa ojoo a na ndi dibia amusu kwenyere na, nwoke nwee mmekorita ya na nwata nwanyi na-amaghi nwoke, mkpuruobi ya, ahu ya di ocha, nwere

ogwu o ji agwo ha oria. Mgbe ufodu, ndi na-eme mpu a kwenyere na o ga ewetara ha ihuoma.
Ihe arurumala a na-ebutere umuaka o dakwasiri na ndi nne na nna ha bu ajo ihe. Otutu umuaka amanyere na mmekorita nwoke na nwanyi, sitere na nke a bute oria nsinwanyi di iche-iche tinyere AIDS. Nchoputa

emere gosiri na, uzo asaa n'ime uzo mmekorita aka ike emegidere umuaka iri na Zimbabwe, butere oria
nsinwanyi di iche-iche. N'ime puku mmadu ise na-ebute oria AIDS kwa izuuka na Zimbabwe, otu puku na Nari-ise bu umuaka ihe a na-emekuta kwa izuuka obula. N'ihi ida mba na nchoputa mgbe e jiri aka ike

dinye obere nwa nwanyi n'ime otutu ezinulo ebe mpu a kacha hiee udu na-eme ka umuntakiri ihe a mekutara bute oria ojo a. Otu akporo Child and Law Project Choputara n'otutu mpua na-aputakari ighe mgbe o ga
fechara otu afo ma o buru na, onye o mekutara enweghi ahu aru ma o bu oria site n'aka onye mere ya
ozugbo. Nchoputa ndi ozo e nwetara kowara na ndinye umuaka n'uzo mmegide na-agbasa ebe dum na mba Zimbabwe. Nke a mere ka otutu umuaka ndi nwanyi ebe ahu mata mmekorita ha na ndi nwoke oge

ha ka di afo asato ebe iwu mba Zimbabwe kwadoro nwanyi imata nwoke mgbe O ruru afo irinaisii. Komishon nke President Robert Mugabe hiwere afo abuo gara aga choputara n'otutu umu agbobia na-enwetakari
mmaja n'aka ndi nwoke choro i ji aka ike edinye ha. Ha tuputara iwu gbara okpurukpu i ji
chekwaa ndu umuaka. Komishon a siri na, "udiri akparamagwa ojo ahu na-emetu ya n'obi n'ihi nsogbu chere umuaka ndi a n'ihu ma ha bute oria nsinwanyi na HIV.

Agbanyeghi nchoputa di iche-iche emegoro gbasara i ji anyaike amanye umuaka maka mmeko ha na ndi nwoke nke onuogugu ya na-abawanye obuladi n'ime-ime obodo nke mba ahu, ndi mba ahu amatabeghi
kpom-kwem ihe kpatara mpu a ji etolite. Ama uloikpe na-agba gbasara mpu a ana emegide umuaka na-arutuaka ebe ndi dibia amusu noo ma, ndi dibia mkpa akwukwo na mgborogwu kwetara na mbawanye
omenala ndi-ocha ka ekwesiri ita-uta niile maka onodu ojoo a.
Otu umunwayi na-adota oke ruru onye si na nha uloikpe na-ata ndi mebiri iwu a esighi ike etu okwesiri i mee ka ndi mmadu zere ya bu iwu. Otu a na-atu eromero ka ama onye dara iwu-a ikpe onwu ma o bu pia

nwoke ahu mkpuru-amu. Ntaramahuhu abuo a ka ha chere na ya na mpu ahu ha nhatanha ma zuo oke imee ka ndi ozo wepu aka na-ajo omume ahu.
Pan African News Agency 6
6 Page 7 8
7
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
Seychelles Nature Reserve Aputala Ighe N'uwa Dum 5mins. 5secs.
Cousin Island di na Seyechelles aburula ogige ebe ihe okike noo n'Afrika amara n'uwa dum ka o buchara nke izizi n'Afrika soro mee emume akporo International Biodiversity Observation Year. Akuko rutere

Portlouis siri na, Cousin Island special Reserve ka ahutara dika okachamma i ji maatu etu esi eme ihe ebe mbikorita ndi njem ihe nkiri noo tinyere nhazi oru ebe igbere mmiri na nke ime-mmiri dika edputara ya
ugboro abuo n'ime akwukwo mgbasaozi nke otu mba uwa di iche-iche weputara.
O bu Birdlife Seyechelles na-aru oru ebe ahu echekwara nke oma n'uzo puru iche. Nani ya ka e jiri maatu dika etu edere n'akwukwo ahu bu, Sustainable Development of Tourism compilataion of good practices
site East African na mpahara Westen India Ocean. N'akwukwo onye odee akwukwo ukwu nke WTO bu, Francesco Frangialli degarala Simone de Camarmond, Minista Seychelle tourism and civil Aviation, O
siri, "A mara m nke oma n'akwukwo ahu ga-agbakwunye ugwu nye oru nlekota ndi njem na Seychelle". Akwukwo nke abuo akporo-Marine and Coastal Protected Areas-A Guide for Planners and Managers
bu nke The World Conservation Union weputara. Cousin Island putara ighe nke oma ugboro abuo n'ime akwukwo ohuru a . Nke mbu lebaranya n'oru di ebe ala osimiri gbara okirikiri ka isiokwu ya bu "Cousin
Island-A Sea and Island Reserve Scientifically Managed by an NGO". O kowara oru nchoputa di omimi,
nlekota oru, mmuta, oru nchekwa tinyere ihe ndi ahu ochichi-a ruputara.

Nirmal Jivan Shah, onyeisi uloru Birdlife Seychelles siri n'oganihu Cousin nwere putara ighe n'ahu Seychelles niile, ya mere umuamala Seychelles niile ga anyaisi maka ihe ndia O meju-putara. Shah siri ndi mmadu
nwere echiehe di iche-iche gbasara okwu obula, kama uzo bu kpoo esi achoputa oganihu na iheoma
aruputara bu site na ntule na nnabata nke otu di iche-iche n'uwa amara nke oma nwere ebe okwu ahu di. Ogbakwunyere "anyi agaghi akwusi ebe a kama, anyi ga-agbakwu mbo ichoputa onodu ohuru zuruoke

maka Cousin na-ebe ozo di iche –iche". All African com.

Mmanu Ngini Ejirgoro ruo Oru Na-ebutere Ebe Mepere emepe Nsogbu 6mins. 7secs.
Mmanu ndi ahu ejiri ruchaa oru si n'ime Ngini puta na-ebutere onodu gburugburu ebe obibi nsogbu ugbua na mba Zambia. Mgbe gara-aga uloru British Petroleum Zambia Plc na-azurughari mmanu ndi ahu ejigoro

ruo oru ma rugharia ya n'uloru ya di n'obodo Kitwe. Mmechi emechiri uloru ahu mere ka ndi nruzi ugboala na uloru nruputa ngwa ahia di iche-iche malitezie iwufu mmanu ha jiri ruchaa oru etu ha chere
n'okachara ha mma ma mgbe ufodu mmanu ndi ahu na-awunye n'ime ebe mmiri onunu si agbaputa.
Jewitt Masinja-Odee akwukwo ukwu nke uloru Ministry of Environment and National Resources si, "ekwesiri ilebara okwu gbasara mmanu e jigoro ruo ihe anya puruiche, n'ihi onodu gburugburu ebe obibi
o na-emetosi na nsogbu nke o na-ebutere ala, mmiri na ikuku ndu". Onodu a mere ka, uloru Institute of Waste Management di na South Afrika ngalaba nke Zambia mee ogbako omumuihe na nso-nso a wee
lebara oru mkpofu mmanu Njini ejigoro ruchaa oru anya puruiche na mkparita uka ha. Ndi ozo biara ogbako omumuihe ahu bu, ndi uloru nruzi ugboala na ndi uloahia mmanu. Ebumnuche ejiri mee ogbako
ahu bu, nleba anya ebe onodu mmanu si n'uloru ebe ana aruzi ugboala agbaputa na mmanu eji akwo-ugboala wusara n'ala ebe uloahia mmanu noo dika o si emekuta gburugburu abe obibi.

Ka emechichara BP Zambia Oil Refining Plant di na Kitwe na mbufe uloru a na Zimbawe, ndi oruzi ugbola na uloahia mmanu amaghi ihe ozo ha puru ime ma o bughi iwufu mmanu ndi ejichara ruo oru ohia na
uzo. Ebe ufodu, mmanu a na-awunye ebe esi enweta mmiri onunu ebe ana ekpofu ihe ruru unyi ma o bu n'ala ubi na obosara ala gbara uloru ha agbataobi. Ihe nke a na-eweta bu mgbaru nyuputara ma buru ebe
azu na anunta jiri mere eba obibi. 7
7 Page 8 9
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
8
Uloru a na ngalaba ndi di na South Afrika, Namibia, Zimbabwe na Botswana jikotara aka ugbua na mbo i ji tuputa usoro ga-akwado nruzighari mmanu ndi ahu ejigoro ruchaa oru etu o ga-abakwa uru ozo. E
enwere olileanya n'usoro kwuchim ga ebenata mbusa umuihe ruru unyi nakwa mmeto gburugburu ebe obibi site na mbusa mmanu Njini ga adi.
Pan African News Agency.
Oke Unwu Ga Adikwa Ozo N'ihi Agha Nke Igurube Na-Ebu. 5mins. Ka Tanzania sichara n'oke uko erimeri puta, mba ahu noo na nsogbu ozo nke oke uko erimeri n'ihi agha
nke igurube akporo "Army worm" na-ebuso ya. Govumenti agbala ama kwuo n'uzo ala ise n'ime ala
iriabuo di na Tanzania ka igurube ojoo ahu ribisiri ihe akuru n'ubi ebe mpahara obodo isii ozo ga-anokwa na nsogbu a mgbe na-adighi anya. Akuku obodo ise nji-nji a jiri bu Dodoma, Aru sha, Mbeya, Iringa na

Singida ebe akuko koro n'onu apughi ikocha etu umu egu a si amuba n'ike n'ike. Obodo ato ndia bu, Arusha, Kilimanjaro na Tanga gbara mphara ugwu Kenya agbataobi. Ana atukwa egwu na ha ga-efesa
ruo Kenya. Atukwara anya na ndi nke noo na Mbeya nwere ike Ifebanye Malawi na Zambia mba gbara
ya agbataobi.

Uloru n'ahu maka oru ugbo na nchekwa erimeri e nwebeghi ike ikwu kpom-kwem ogo ihe mebiri ebe ahu di. Aturuanya n'otutu mkpuru osisi akuru n'ubi ruru puku hectare asaa, Nari asaa, na iri asato lara n'iyi
n'ime obodo ise ahu. Govumenti Tanzania n'akwado irio otu UN Food and Agriculture Organisation di na
Rome aririo ego di otu Nde dola i ji buso ukpala ndi ahu agha. Tanzania n'ahusikwu anya n'otu oge a n'aka igurube ndia na-acha obara-abara, oke na nnunnu nke ndisi kwuru na o nwere ike ibutere Tanzania

oke uko nri ma o buru na egbochighi ya ngwa-ngwa.
Maazi Sergei Mutahiwa, onye oru ngalaba nchekwa ihe akuru n'ubi, doro mba obula gbara obodo ndia
ukpala ojoo ahu na-emebisi ihe akuru n'ubi agbataobi aka na nti ka ha di njikere ibuso ajoo ukpala ndi ahu agha n'ihi na ha na-ejeghari ebe di iche-iche site n'onodu ubochi na ebe ikuku bulara ha.

The East African

Uche Onye
I ha Nhatanha Na-Etiti Ndi Nwoke Na Ndi Nwanyi Di Mma 17mins. 6secs.
Maka Usoro Ochichi Onye Kwuo Uche Ya
Kemgbe 1985, ndi mmadu anaghi egosi mmasi obula n'okwu ntuliaka nhoputa ndi ochichi na mba

Zimbabwe. Igwe mmadu putara na mmemme nke afo gara aga ejiri hoputa ndi ochichi, nyere ndi haziri oru ahu oke onu. Ka emume nhoputa ndi ochichi gachara n'afo 1980, anuri nke nwere onwe biaziri nyuo ka
oku ebe ohere enyere umuamala ahu i ji tuo votu buziri ihe eji n'aka. Ndi mmadu ahukwaghi mkpa o di ha
itu votu. Umunwanyi sokwara omume a. N'ihi n'onuogugu ndi nwanyi kariri nke ndi nwoke, ya mere ndi na-ado okwa ochichi ji ehinye isi ebe ha noo n'oge ntuliaka nhaputa ndi ochichi. Ma ana ewekwa ndi

nwanyi dika ndi di mkpa gbasara nhoputa ndi ochichi? Ka enyere ha nani oru ibu abu mgbe ana achuru ndi nwoke nta votu? Ha ga-ano n'ikwe ukwe na isekpuruala n'odu ugboelu Harare International Airport, yiri
uwe esere isi di otu onye? Ezie, oge eruole mgbe aga akwanyere ndi nwanyi ugwu ruru ha dika ndi esi
n'aka ha ahoputa ndi isi ochichi. Otu ndoro ndoro ochichi ha agaghi acho votu ndi nwanyi?

Dika ndi nhoputa ndi ochichi, ndi nwanyi ga asa anya ha mmiri imata etu otu ndoro ndoro ochichi obula di n'atumatu o nwere maka onodu ndi nwoke na ndi nwanyi. O bu ihe doroanya ma burukwa ihe e nweghi
mgbochi i mata etu n'otu ndoro-ndoro ochichi nogoro otutu oge ga-enwekwa akuko gbasara nlehara
anya ebe ndi nwanyi noo otutu oge n'okwu ichunta votu ya. Nke bu eziokwu na Zimbabwe bu na, ndi 8
8 Page 9 10
9
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
nwanyi ya niile tozuru oke itu votu putachaa tunyere nani otu otu ndoro-ndoro ochichi votu ha, otu nke ahu agaghi acho obuladi otu nwoke itunyere ya votu tupu o merie. Nkea putara na-agaghi e nwe usoro iwu
nyere onyeisi ala ikike i horo iri mmadu ato ndi nwoke no n'ulo nzuko omeiwu. Ihe nwute amara nke oma na Zimbabwe bu n'usoro nhiwe otu ndoro-ndoro ochichi mere ka ndi nwanyi hara i puta ighe nke oma
n'okwu ndoro-ndoro ochichi dika ndi nwoke na mba ahu.
Okwu Kacha mkpa na Zimbabwe bu na, ndoro ndoro ochichi adighi adabara ndi nwanyi ebe ahu. Gi bia
n'uwa dum, e were ndoro-ndoro ochichi dika ihe ruru unyi ma burukwa ihe echekwara maka ndi nwoke. Nwanyi na-akwanyere onwe ya ugwu ekwesighi itinye aka n'okwu ndoro-ndoro ochichi. Oge nwoke ma

o bu nwanyi kpebiri iru oru ohaneze, onye ahu adila njikere igba onwe ya n'anwu ma, lere ebe ndi ya na ha n'ado okwa ochichi ji ya eme ihe nkiri nye ohaneze.

E kwuole na ndi nwanyi ibanye ndoro-ndoro ochichi ga-eme ka eziokwu diwanyekwuo na ya ma nwekwa ike nleba anya n'okwu di iche iche bara ohaneze uru kama nke bara nani otu onye uru. Na Zimbabwe, ajo
ihe di n'ichunta votu putara ighe n'uzo puru iche. Ahutara nke a site n'ogbaghara okwu ndoro-ndoro ochichi dara ebe dum na mba ahu. Kepu-Kepu anuru na-akowa n'otu ndoro-ndoro ochichi noo n'okwa
ochichi jikpara ndi luru agha amara nke oma na-anoghi n'otu ndoro-ndoro ochichi ha ahu. Ajo ihe a gosiputara onodu ebe ahu dika nke ndi ike kete o rie. Nke bu eziokwu gosiri na umunwanyi ndi ahu amara
aha ha n'otu nke na-abughi ya na-achi ka elekwasri anya mmegbu. Onodu a n'ado ndi nwanyi ahu aka na
nti ka ha wepu aka n'okwu ndoro-ndoro ochichi. Ndi nwanyi a enweghi ikike n'okwu ndoro-ndoro ochichi ebe o bu na ha noo n'ogo nta n'ime otu ndoro-ndoro ochichi ana achi-achi.

Dika m siri chee, usoro ozo eji eme ka ndi nwanyi daa mba n'ido okwa ochichi bu site n'usoro omenala. Akpachapuru anya mgbe ufodu ma o bu site na-amaghi ama megide ndi nwanyi, ebe ahuru ndi nwanyi,
dika ndi nwere oghere mmeri. A ga amatarila ihe niile gbasara ndu nwanyi ahu: O luola di ka o lubeghi? O buru na o lubeghi di, gini kpatara ya? O gbaala alukwaghim ka o gbabeghi? O muola umu, ndi nwoke
olee ka o mutarala nwa? A naghi aju ndu nwoke n'acho okwa ochichi ajuju ndi a. A na-anabata o buladi ebe nwoke ndoro-ndoro ochichi ji nwanyi abuo ma o bu nke ato. Ejikwa nke a enye nwoke ahu nsopuru.
E ji onodu nwanyi mere okwu ndoro-ndoro ochichi, anaghi eche mbo o ga agba, i ji lekota nsogbu chere oha obodo o na-elekota anya aka mgba.

Ebe ana eme ihe etu okwsiri, ikpa oke adighi. Ezie, ufodu ndi nwanyi choro inoo n'okwa ndoro-ndoro ochichi anaghi enwe ike gafee nhoputa n'ogo otu ndoro-ndoro ochichi ha n'ihi nghotaghe banyere ndi
nwanyi.
Site n'ihe m choputara oge ana atu votu, a matara m etu o siri di oke onu ahia ichunta votu. Na Zimbabwe, ana elekwasi otutu ego ufodu ndi na-ado okwa ochichi n'emefu site etu otu ndoro-ndoro ochichi ha siri

nwedebe ego. Na-ezi onodu na mba Zimbabwe, nwamala Zimbabwe obula nwere oghere itinye mmuta ya, ego ma o bu ihe o nwere i ji nyere otu ndoro-ndoro ochichi masiri ya aka. O dighiri otu ndoro-ndoro
ochichi obula mfe i nweta ego ma o buru na o nweghi uzo kwudosiri ike o si akpata ego n'usoro iwu otu
ndoro-ndoro ochichi. Obuladi n'otu ndoro-ndoro ochichi nwere ego, aputaghi na ndi nwanyi n'acho okwa ochichi n'ime otu ahu, ga-anata ego nhata-nha ka ndi nwoke. Nke a mere o jiri di mkpa na ndi

nwanyi ga-egosiputa onwe ha n'onodu putara ighe n'ime otu ndoro-ndoro ochichi ha noo.
Ochichi nwere ezi atumatu iha nhatanha na-etiti ndi nwoke na ndi nwanyi tinyere ezi usoro ochichi onye
kwuo uche ya e nweghi ihe yiri ya. Govumenti nwere nani otu nwanyi minista n'ochichi ya buru ndi nwanyi ihe oke onu. O bu oru diri govumenti ikwalite onodu iha nhatanha na-etiti nwoke na nwanyi tinyere

ndikota n'otu na-etiti ndi nwoke na nwanyi n'ime usoro ochichi onye kwuo uche ya kwuru onwe ya. Abridged Opinion of Yuonne Malhunye in the Zimbabwe Independent 9
9 Page 10 11
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
10
Nkwekorita
Our People O: Ego Enyere maka I Nwe Ezinhota 6mins.
Ndi nwanyi ano na-ede edemede akwukwo anatala onyinye mbu akporo "Our People O! Ego E nyere maka Ezinhota" O bu ego e nwetara site n'akwukwo "Our People O!" nke Alka Raza Nwamala India

amara nke oma dika onye ntakuko n'uwa dum ma bururkwa oriaku onye nochiteburu anya ochichi mba US na Naijiria Susan Twaddell i ji mee emume nke otu United Nations ji echeta afo ndi okenye n'uwa
dum. O chetaghachiri ndu na akuko gbasara ufodu ndi okenye Naijiria malite na ndi bu akwaakwuru
n'oru ntakuko ruo na ndi nwanyi n'aku egwu odinala. Dika Dr. Akwasi Aidoo, onye obia ukwu na-emume ahu, ma burukwa Regional Director nke Ford Foundation siri kwuo, Onyinye ahu bu, "emume e

jiri jikota ndi ntorobia na ndi okenye Naijiria ndi gbara mbo ikwa nka karia oru nka, ndi nwere mmasi na mmepe bu igba na, umunwanyi nwere oguguisi maka edemede akwukwo, ndi nwere mmasi n'iko akuko
gbasara ndi Naijiria". O bu Ford Foundation nyere ego mbuzo maka akwukwo a.
Daniele Landry onye nochite anya United Nations Population Agency si na, "ndi obia mba uwa di iche-iche na-amatakari ihe na-eme na gburugburu ebe ha noo dika obia karia ndi nwe obodo ahu. Onye na-acho

mgbe dum imata ihe edere n'uzo eziokwu gbasara ndi mmadu n'ime obodo ha na-egburu onwe ya oge-Akwukwo ahu gosiri ihe ndi bu mmadu efu na ndi oke-ozu meputara na Naijiria"

A horo ndi enyere oghere i nochite anya mpaghara ama-ama nke mba ahu. Nneka Osakwe noo na
Mahadum Nnamdi Azikiwe di n'Awka na mpaghara Owuwanyanwu Naijiria. O turugo abuba ugo n'otutu nzere mmuta nke mba di iche-iche ma bururkwa onye ndotara umuaka oke ruru ha. Site n'aka onye

edemded abu mbem na nkenke akuko bu, Binta Muhammed ka e siri nweta mbo di iche-iche ndi ugwu Naijiria gbara. Florence Inokweje bu nwanyi Middlebelt ahorola maka edemere abu mbem, egwuregwu,
akuko mgbeochie na nkwalite mmuo umuntorobia. Oriaku Kemi Wale Olaitan, onye na-eme ihe egwuregwu,
edemede nusipepa na mmeputa ihe ana agbasa n'ikuku site na Redio ma burukwa onye ana unu ohu ya nke oma n'okwu gbasra umunwanyi Afrika nochitere anya mpahara odidanyawu Naijiria. E nyere onye

obula n'ime ha otu Nari-puku Naira i ji nye aka na mbo niile ha n'agba tinyere mbiputa akwukwo ha dere etu oga egosiputa ezi onodu mmekorita n'okwu akunuba.
CFC
DRC Weputara Udiri akpu Ohuru di iche-iche 3mins. 5secs. Uloru National Institute for Agriculture Study and Research nke mba Democratic Republic of Congo e
weputala udiri akpu ohuru di Nari abuo nke eleghagoro n'uloru International Tropical Agriculture Institue nke Ibadan, Naijiria. Udiri akpu ndi a di iche-iche ga-anabata onodu ubochi ime obodo n'uzo kachamma.
A ga-aruputaghari ma kesara ya ndi oru ugbo di n'ime obodo. N'ihi nke a, uloru ahu siri na-amalitele
nlegha udiri abuo n'ime mba Mvwazi na Mbakana di na ngwucha obodo Kinshasa. Site na enyem-aka nke uloru ahu ka eji hiwe ozuzu nke mbu ebe Mbakana Agricultural Centre for Integrated Development

kwadoro nke abuo bu ebe akogoro oguru-akpu di ndu ekejitere otu nari puku n'onuogugu. M weputa na nlegha udiri akpu ohuru a di n'usoro govumenti Congo ji agba mbo ikpochapu umu ahuhu na-egbu akpu.
Nri akpu bu erimeri ndi Congo kacha eri. Ihe kariri uzo asaa ma e kee mmadu niile di na Congo uzo iri jiri
nri akpu mere erimeri kachaa ibe ya mma. Onodu a ka di na Bundundu na Lower Congo Province tinyere ndi bi n'obodo ukwu nke Kishasa. Otu UN Food and Agriculture Organisation na-ehiwe mbo niile a aja

n'ukwu. Ebumnuche maka oru ngo a bu i gbatipu aka n'atumatu a, i ji bulite onodu ga –eweta oganihu n'oru nchekwa erimeri.
Pan African News Agency. 10
10 Page 11 12
11
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
Oge akaraka
Ikike Okpomoku Nwere Mmeghari Ma Kwudosikwa Ike 4mins. 5secs. Di Oke Mkpa N'oge Puku Afo a

Ihe akporo Green environmentally friendly energy dika okpomoku site n'anyanwu, ikuku na ikike mkwoghari bu otu n'ime okwu dikaricha mkpa chere umu mmadu aka mgba n'ihu n'ime puku afo ohuru a bu ihe
onyeisi uloru nke UNEP Klaus Toepfer gwara ndi biara nzuko emere maka mmeghari ikike okpomoku na mba Paris. Ihe a akporo "Green Energy ga-adirila na-echiche oru mmepe ma o buru na, mmaja nke
mgbanwe onodu ubochi, na mkpa mgbochi ubiam na oria n'ime mba ndi na emepe emere e nwee ike
nlebara anya. "Mmepe ga-adigide, ma o bughi i megide umuaka gi putara ihe dika imee ka obodo ukwu anyi niile na-abawanye ruo oru dika ebe kwesiri obibi ino ruo oru; i huu na amanyeghi ndi kacha daa

ogbenye n'uwa amanye ka ha gbuda osisi bara uru ji mere nku eji esi nri ma o bu i nweta okpomoku" Ekwuputara echiche ndi a na nzuko nke G-8 Task Force on Renewable energy emere na onwa Januwari,
ebe ndi Minista si ufodu mba Afrika iri zukoro n'isi uloru UNEP di na Nairobi i mee nkwekorita n'onodu
aga eji okpomoku na-adigide mee ihe. Ndi Minista a ga-ebugara Commission on Sustainable Development mkpebi ha dum na nzuko ya ga-adi n'onwa Eperelu. Okwu ndumodu Toepfer kwuru ga esoje nke

UNEP ga ekwu n'ogbako agba iriabuo n'otu nke kansulu na achikota UNEP nke Minista di iche-iche si gburugburu uwa ga-ezukota na Nairobi malite n'abali ise ruo abali itolu nke onwa Feburuwari. Okwu
gbasara okpomoku nwere mmeghari ma zukwa oke ga eso n'isi okwu kansulu a ga-atule. Pan African News Agency

Ala Durommiri-Uwa Nke Aga Achoputa 9mins. Ndi izizi gbara mbo weta ndi nnochite anya mba irinasato n'ime obere obodo nke Ramsar, Iran, n'igbere
mmiri Caspian sea na ngwucha oge oyi otutu nke onwa Jenuwari ga-anyaisi maka ihe ha mejuputara ugbua na mgbe gara-aga. Ogbako emere maka Wetland biara na ngwucha na nzuko emere na abali abuo nke
onwa Feburuwari. Site taa ruo iri afo ato, mkpebi a aburula ihe bara uru nke onuogugu uloru di otu Nari,
iri abuona ato ji aru oru i ji hu na ha chekwara ma jiri ala ndi ahu doro-mmiri mere ihe n'uzo ziri ezi. Mpeji akwukwo olemole a, nwere nani isi akuko irinabuo edere na ya nke edeputara mkpebi emere n'ogbako

Ramsar agbaala mbo i kewaputa nchekwa zuru uwa dum nke otu n'ime ebe mbikorita na-emeputa ihe kachaa ibe ya n'uwa.

Ogbako maka ala doro mmiri nke afo ndi gara-aga gosiputara na o gafeele okwu gbasara usoro iwu nke mba di iche-iche n'uwa, otu ndi dunyere ya ukwu di n'ulo oru govumenti, ndi mmadu bi n'ime oha obodo
nke mba uwa na uloru ndi ahu na-abughi nke govumenti zuru uwa, otu di iche-iche ehiwere n'ime –ime obodo tinyere ndisi ngalaba uloru ndi ahu kwuru onwe ha.

O bu n'ogbe a ka ikike na mma nke ogbako ahu emere gbasara Aladoro mmiri gbadoro ukwu. Nke a bu ihe puru iche kwesiri mkpachapuru anya n'inye ugwu na nsopuru iwu nke govumenti obula tuputara.

Onuogugu mba di otu nari, iriabuo na ato, ebe ehiwere Wetlands of International Importance di otu puku,
iriano na abuo foro obere ihe ka o garuo nari puku square Kilomita asato gburugburu ebe ahu, Otutu mba nwere atumatu oru Wetland o tinyere n'oru, ihe bara uru n'oru tekeleuzu n'usoro ngwa oru emeputara

n'oge ogbako ahu bu nke otu di iche iche n'ogbako ahu nabatara. Nke a bu agbamume putara ighe nke ogbako Ramsar taa.

Anyi agaghi afunye aka n'ukwu. Otutu ebe Ramsar di noo na nsogbu, onugugu ndi nke na – enweghi ezi atumatu nhazi oru buru ibu. Ufodu atumatu mba nwere maka oru wetland bu n'onu nkiti ka ana ekwu ha.
Uloru Ramsar di n'ime ufodu mba juru oyi n'oru mmejuputa atumatu uloru govumenti ndiozo nke mere ha anaghi akwudosike n'oru Wetland di n'ala ahu. 11
11 Page 12 13
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
12
Iji lebara adighike a anya, anyi kwesiri I kpobatakwu ndi mmadu na ngalaba ulora ndi ozo n'oru Ramsar. Anyi kwesiri igbakwu mbo iji nyere ndi mmadu aka choputa uru nke Wetland bara n'oru o na aru, ka anyi
wee nwee ike nwetakwuo ndi ga adunyere anyi ukwu oge aga eme nhoputa ndi ochichi na mkpebi okwu
gbasara oru nlekota ihe okike nye anyi n'efu. Nke a bu ebumnuche nke emume World Wetland Day 2001 nke isiokwu ya bu, "Wetlands World – a World to discover". Abali abuo nke onwa Februwari, 2001

bu ubochi ndi mmadu ga – achoputa uru na oru nke Wetland. Site na nke a, ihe ka mkpa anyi ga atukota ga – abu ihe eji elekota onodu ahuike nke ebe obibi gburuguru uwa, ebe bu nani ulo anyi nwere.
Delmar Blasco. Secretary General, Ramsar.

Ngalaba Umuaka
Dinta 17mins.
N'isi ututu, Jamina soro nna ya ga iweta anu. Ha soro nnunu na – emeputa anu wee baa ohia. Jamina wee tie "Achoro m ihu enyi. Nna nna m i chere na anyi ga – ahu?" Agadinwoke ahu wee si "I ga – enwe

isioma. Anyi anaghi ahu otutu ugbua o bughi kemgbe ndi dinta biara.
Jamina wee welie anya ya elu ndi dinta;, A ga m abu dinta. Jamina nomiri ndi ochunta. O gbagbue oke ehi
ma soro nzo ukwu ya banye n'ohia, o chuwa igwe umu agu. O wee tugharia azu icho nna nna ya. Mana o gamieleri ime ohia nke mere na o nwekwaghi ebe a huru nna nna ya na nnunu ahu na – amita anu. O kporo

mana ebe niile daara juu. Jamina wee nu uzu nke si n'ime ime ikuku. Akwa na obiojuo juputere ya obi. O jidere ume ya wee gee nti. Jamma leliri anya elu. Udele juputere ebe niile n'oke anwu nke ehihe ahu na
gburu ya niile. O huru ihe egwu Ndi muru ya agwala ya ri "A galasoso gi n'imeohia" Mana uzu o nuru di
ojoo nke ukwu nke na o nweghi ihe o ga-eme karia isoro na-aga. O gara ime ime…… rue mgbe o putara ebe ihe di. Ebe ahu, o huru obere aligara enyi ka o na-agbali na nkiti ikpote nne ya.

Ndi dinta abialari, dika Jamina, ujo na obi nkoropu jidere ya. O takanyere ya si 'E bela akwa obere nwa. Jamina weturu isi ya ka o gee nti. E laghi anya ihe ndi ozo o nuru adighi anya. Mana ihe o nuru bu uzu
umuahuhu na-eme n'anwu. O matara na nwa ehi ahu agaghi adi n'ike nke aka ya o choro igbali kporo ya laa, eleghi anya ha nwere ihu ndi mu ya n'uzo. Mana egwu ji nwa ehi ahu.

O wee gwa ya n'ume ala 'a bughi m dinta. O gwagidere obere ehi a okwu ogologo oge rue mgbe obi lodatara ya o wee were ogwe ahu ya n'echi ya n'ahu. Jamina kulori ma weputu ukwu ya ugboro ole na
ole.
Nwa ehi na-esote n'ike ogwugwu n'oke anwu ahu. Ozugbo, mmiri ozuzo bidoro ma mee ka ebe niile juo oyi nke mere ka nwa ehi nwetatu ike iga ebe ha na-aga. Mgbe ufodu ha atuhie ukwu ma na-agbalikwa.
Ha na agakwa n' agbanyeghi oke mmiri ozuzo ahu. Ka eligwe dikwara ocha, obi toro nwa ehi ahu uto
n'otuanyahu, Jamina chekwaa na o nuru uzu umu ehi. Mama oge o gere nti ihe o nuru bu uzu ikuku n'eme n'ahihia. N'ogologo oge, nwa ehi ahu enweghi ike ga kwa ije. Mama o gbaliri na-aga na nkiti n'iwe.

Nna nna ya gwaburu ya si "o buru na I fuo uzo soro ndi na-achi ehi na ehihe. Ha ga-eduru gi rute na mmiri. Be anyi di n'akuku nke ozo". O tere aka tupu Jamina na nwa ehi ahu ahu otutu zebra ndi na-acho uzo
igafeta n'elu ala. Ha na umuamumanu ndi a aguru mmiri ji soro wee gaa njem n'oke ehihe. Ha ruru na mmiri mgbe anwu na agbadata n'urukputu eligwe mama o nwere anya ndi zoro ezo n'ele ha nke mere na
Jamina chere na ihe ojoo ga-eme. O siri, nwatakiri o dighi mma igafe ebe a, mama anyi ga agabakwa'. Ka Jamina tughariri, o di ya ka o huru umu ehi n'ime ikuku. 12
12 Page 13 14
13
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
O juru anya ya ma gbalia ile anya ma ihe o huru bu soso osisi akachia nke n'efe kpakakpata n'anwu. Jamina na nwa ehi a amalitekwa njem ozo, mama obere oge, nwa ehi ahu ewelataba ukwu.

Jamina ario ya si "O foro obere, mana ike njem agwula ya. Ka ya na Jamina na-eche, o chetara nne ya. A sikwannoo na o ga enwe ike akpo ya. Obere oge ndi mmadu a na-echekasi ahu, obere oge ha achowa
achomacho. Nwa ehi ahu emee uzu. O huru ya aka n'ahu nwayo o nweghi nne o ga-akpo.
Jamina adokpuru nwa ehi 'Gee nti. Ha na-anugasi olu. O chere si ndi muru m mama uyogo ndi ahu o huru ebe di anya abughi nne na nna ya.

N'otu ntabianya ahu, ya agbalia ikudata ume. Ugbu a Jamina chere na ya bu otu n'ime ndi a na-acho inweta. O kpere ekpere ka nwa ehi a ghari ime uzu. Mama nwa ehi a ghari ime uzu. Mama nwa ehi a
matara n'ihe ojoo choro ime, o wee noro juu ka okute rue mgbe nke a gabigara. Ka oke abali dara, akwa na mkpu umuanu na ahuhu na-aga n'abali mere ka akpata oyi wuo Jamina. O kpudewere nwa ehi ahu nso
jisie ya ike n'ujo ka o nuru mkpu ihe dika o na-acho ihe o ga-eri n'ebe adighi anya
Ka Jamina na-eche ka ejide ya, o chetara okwu nna nna ya gwara ya ozo. O buru na I noro n'ihe odachi,
obi adakwalaghi mba. Ya mere, Jamina gere okwu ndi muru ya. O mechiri anya ya ma chee maka ha. Kama ihe o huru bu umu ehi. O na atughari obi maka igwe umuanumanu nke o huru n'ogologo oge gara

aga. Nnukwu mpi ehi nna nna ya huru oge o di na ntakiri. Iyogo umu ehi gbara agba na-agaghari dika umu mmuo n'elu ala.

O na-anu nnukwu ntamu nke ha na eme n'ebe adighi anya. Oge o mepere anya ya ihe o huru bu umuehi na gburugburu niile dika o ga-akpo ha n'uwa. Ujo atughi Jamina. O kwuru si, kporo nwatakiri a, ledo ya
anya.
N'isi ututu, nne Jamina ahu ya ebe o na-ehi ura n'ime ahihia. Jamina siri, a na m enomi ichu nta wee fuo.
O nosoro nne ya ka ha na-ala tupu ha eruo ulo. Ka ha na-eru ime obodo o kwuuru onwe ya na ntakiri olu si. A gaghim abu dinta'

Paul Gerarty n'akwukwo o kporo 'The Hunter'

Okwu Mgbake
Were "onu ji" mee emume ihe imutara n'Afrika site n'ilu ndi-a-na-enweghi nchefu.
Gbasara Amamihe Ohia na-aso nkata epukwala ero.
Ethiopia
Anaghi ano n'ihiede akagbu nkapia. Uganda 13
13 Page 14
February 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 25
14
Make Ndidi Anaghi eji ukwu abuo awufe ogwe.
Equitorial Guinea
Onye nwere Ndidi na-eri azu ukpoo Zimbabwe
More African proverbs

Okwu banyere nchekwaba
Onye kuru osisi huru mmadu ibe ya n'anya karia onwe ya. Thomas Fuller
1723
Ncheta...
Mkpuruobi dika osisi, o na-eto ebe o choro Zimbabwe
African Proverbs. 14

Page Navigation Panel

1 2 3 4 5 6 7 8 9
10 11 12 13 14

 

© 2002 Communicating for Change. All Rights Reserved
Developed by George Mbuagbaw