Go Back
Communicating for Change

Document Body Page Navigation Panel

Pages 1--14 from ţ˙


Page 1 2
1
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
Mmepe
INYOM NA UMUNTAKIRI
Onodi Umuntakiri Na Etiti Uwa Na Afo 2001 9mins. 26secs. 3
Otu UNICEF kwubara otutu mba Africa dika, obodo kachasi

mebie ohere nile onwere iji wee nhazie ntoola umuntakiri ya.

Kedu Ka O Na Di Mgbe Enweghi Nchekwube 11mins. 22secs. 5
Ncele Kgadima aturu mkporo maka igbu nwa ekwuputala umu uru

obara ileebaghari anya n'ubiam ha na agum akwukwo ndi lnyom.

Inyom Di Kwa Mkpa 10mins. 6
Oke enwere onwe nke umuntakiri nwere udoo jikoro usoro ahu ike
ha na odi mma nke ndi nne.

Umu ihe nzuzo na emegasi ebe umuntakiri no 3mins. 29secs. 10
Otu United Nations High Commission For Refugees na ndi Save the
children Fund Alhance ehiwela amuma inyere umuntakiri ndi nke
eleghara anya izere ndu ebe obibi Na mba Europe.

ORU MGBASA OZI
Ezi Mgbanwoe N'oru Mgbasa Ozi 4mins. 50secs. 8
President of the West African Journalists Association( WAJA) amala
okwa nyere ndi oru nta –akuko ikpachapu anya banyere ezi enyi imetute
odi mma ha na goomenti.

Ndi Nobel Laureates Ekwueala Okwu Banyere Ndi Oru Nta Akuko Inwe 3mins. 16secs. 9
Oke Nwere Onwe
Mmadu abuo ji nturu –ugo, Nobel Laureates, Dalai Lama na Bharat Ratan
Amartya Sen, Agwala ndi otu oru nta akuko inye aka ngbanwe oha na eze ha
na ibenata ufodi echiche ha, maka inye aka jikoo mba nile ibu otu.

USORO AHU IKE
Rawlings buzi onye nkwuchite okwu ndi otu oke Nke ndi nwere onwe 5mins. 39secs. 9
Otu UN nyere aka chiburu mba Ghana bu president Jerry Rawlings nturu ugo
onodi Nkwuchite onu ndi otu oke nke onwe n'ihi mmasi onwere n'ebe usoro ahu ike no.

AKU N'UBA
UNDP Ekwuela Ka Enwe Nwa Ohere Mbelata Ukpa N'ubiam 11mins. 57secs. 4
Mbelata ibiam n'ukpa ga anabata umu mmadu n'usoro nke etiti uwa bu
mkpuru okwu UNDP

Afrika N'ime Otu Kansul Ndi Nche 8mins. 22secs. 10
Nnukwu ububo maka nhazi otuUnited Nations.

OKE NWERE ONWE
Ndi Ebere Ukwu Maobu Aka Enwela Oru, Enyem Aka 11mins. 9secs. 7
Na Sierra Leone
Ndi out oru nke etiti mba uwa, na enye aka enye m oru nyere ndi nile nke
ebere aka ma obu ukwu si mba Sierra leone iji benata ubara udi ndi a na

alooghachi azu n'obodo ha. 1
1 Page 2 3
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
2
Onodi Mba
OGWANOGWA( MENU)
Ihe Iyi Egwu Na Muizenberg 10mins. 27secs. 3
Amuma oru ngo nke mmeputa. The spirit of technology nke mba South Africa
nwere ike mmebi ikuku site na chlorine gas.

CHI EKERE UWA( KLAIMEETI)
Ngbanwe Chi Ekere Uwaga Eri Ijeri Nari Dolla Ato Kwa Afo 6mins. 16secs. 8
Ma agbaghi mbo kwusi umu anwuru nke si na greenhouse aputa, oga ewee ijeri
dolla ibaghide ekpom oku nke etiti mba uwa.

NCHEKWABA ABAALA ENYO FOTO MMEGHARI
Ihe Enyo Mmeghari Ohuu 6mins. 27secs. 9
Elaine Proctor weeputara akporo KIN leebara anya n'umu nghotahie nke di
n'etiti nchekwaba na oke nwere onwe ma nhazie idi n'out nke di n'ime ya na
mba Namibia.

Okwu Ahuru Anya
Ikpem Mkwum Otoo Nyere Umuntakiri Sierra Leone 10mins. 40secs. 11
Ka ububo out panel nke un biara na mmechi banyere agwa ibu
Ola diamond n'usoro iji egbe ekesa etiti mba Liberia.
Kedu uzo ozo?

Ihe E Deturu Ala
Algeria E Nwela Ala Mmiri Ohuu 2mins. 33secs. 12
Algeria edetueala ala mmiri ohuu iri n'usoro onodi dimkpa nke

etiti uwa iji sonye na mmeme ubochi nke mba etiti uwa.

Nwa Oria Mmikpo Ji Aka Agbala Afo Iri Na-abuo 3mins. 6secs. 12
Nwa si south Africa nke oria mmikpo jisi aka ike agbala afo iri
na-abuo bu Nkosi Johnson, ma ka odi ugbua obilitebeghi.

Ngalaba Umuntakiri
Kumbo Na Mhisi 12mins. 7secs. 12
Isi ike Kumbo mere ojiri tufue ndu ya n'ebe Mhisi no, Nkita ohia nkea sitere
na inupu isi ebe nne na nna no.

Okwu Mmechi
Umu mkpuru okwu ufodu si n'aka ndi isi ochichi nke africa adighi echefu-echefu 13
ha na otummkpuru okwu bara uru banyere mma. 2
2 Page 3 4
3
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
Akuko
Onodi Umuntakiri Na Etiti Uwa Na Afo 2001 9mins. 26secs. Ufodu taa ewere otutu mba Africa dika obodo ndi kachasi mebie ohere nile onwere iji wee ghazie ntoolite
umuntakiri ya, site nhiwe umu iwu ndiahu na abaghi uru, Izere umu agha di iche iche ha na izofusi umu aku n'uba onwegasiri. Umu ihe ndia nile bu isi isi okwu nke out United Nations Children's Fund( UNICEF) ji
aka. Akwukwo ozi nke State of the world children 2001deeputara usoro nile etu umu obodo ndia siri gba
mbo ikwado kwa ntoolite umuntakiri ha, bu nke ha kwere nkwa n'ogbako onodi Nzuko Nke Umuntakiri n'etiti uwa nile na afo 1990.

Carol Bellamy, onye isi oche nke otu umuntakiri n'akwukwo ozi ya, mere ka amata n'isi ego nke etinyere na nzulite umuntakiri na ezi nleekota anya bu itoo ezi mgborogwu usoro ochichi di mma. Akwukwo ozi ya
gara n'ihu ikowa na ezi usoro ahu ike, muta, nri oma, nche-kwa na ezi ileekota anya abughi nani igosi ka odi na obi kama na o bu ezi usoro aku n'uba nwata obula kwesiri inwe site ntoolite ndu ya. Ihe kacha buru
nwute bu na ndi isi ochichi omebe iwu amaghi uru obara n'ime afo ato nke ndu nwata obula – nwata ida mgbenye adighi mma na enweghi ezi agwa. Omere ka odoo anya nwata na nwata, muo na muo na ebu
echiche ezughi oke.
Ogbe Sub-Saharan nke Afrika kachasi buru ibu a, ha na eso obodo ndi ozu n' azu n' etiti ogu nchikota uwa nile. Etiti Afrika bu isi ukpa, ogbaghara, na nje oria mmikpo n' onu ogu bu nke kpuru afo n' ala umu ihe
nrite nkwado umuntakiri.
Mba Afrika kachasi buru onu ogu iri nde ano ndi mmadu nke agha na oke nwere onwe nara onodi, okara n' ime ya bu umuntakiri. Mpaghara kachasi nwe onu ogugu ndi mmadu bu ndi nke bighariri onodi di nde
6.75 oha na eze n' etiti mba Sudan, Angola, Burundi na Angola.
N' ihe banyere mmuta, otu UN Educational Scientific and Cultural Organisation' s (UNESCO) gosiri onu
di percent iri ise na ise no ulo akwukwo primari na Sub-Saharan, iji wee tunyere percent iri asato n' ato enwere na Middle East na North Afrika, iri percent asa na out na South Asia, iri percent itolu na isii n' uma

ise na East Asia na pacific, iri percent asato na itolu n' uma ise na Latin Amerika na Caribbean, na iri percent itolu na otu na Central ha na Eastern Europe ya na Baltic States.

Ma nke ka njo bu nde otutu umuntakiri bu ndi nne na nna ha nwuru n' ihi oria mmikpo, ndi ubiam kwusiri oganihu ha, n' etiti Southern Afrika enwere iri percent umuntakiri gbara afo iri n' ise bu ndi nke nne na nna
hapuru onodi ha bu ihe iyi egwu.
Oburu na ogo umuaka na ndi nne akwuru ka akwukwo ozi a siri deeputa, ebe enwere nde kuru nde ndiom
nke agha ime ulo na ogbaghara meetutegasiri, olilee anya oga n' ihu ka teere aka.

Oburu na agbasoro akwukwo ozi a, mba Afrika nwere otutu ihe oga eme ebe onodi umuntakiri no iji chekwa oga n' ihu anyi.
CFC

Ihe Iyi Egwu Na Muizenberg 10mins. 27secs. Amuma oru ngo mmeputa ogbe ime obodo South Peninsula nke South Afrika na emeputa akporo-" the
spirit of technology" nwere ike imebi ikuku nke Cape Riviera site na chlorine gas, bu otu anuwuru ojoo kachasi egbu nwayo nwayo, mgbe ndi otu Kansul zukoro ha atuputa amuma optic fibre nyere ulo oru njo 3
3 Page 4 5
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
4
nke di na Capricon Oark Muizenberg, ndi ochichi kansul nke obodo mmepere emmepe na otu ndi oru kommittee gburugburu adila na mbu tuputa amuma mbughari igwe oru booster di 350 metres ino oteeaka
ebe enwere ubara ndi mmadu. ndi out abuo a mere ka amata na aga enwe ihe iyi egwu bu ikuku ibuba na oke osimmiri sitere na anwuru hydrogen na nitrogen enwere n`ime ulo oru a ma oburu na ahapu oru `ngo
a iga n`ihu nkea bu nnukwu oku nyere muiozenberg site n`a oku ndi Johammesburg nke aturu anya di out
nari na iri ise wee rue nari abuo n`iri ise ndi ohuru tinyere nkeji onu ulo iri na abuo n`ihu oru nke mbe, ntapu anwuru Chlorine ha hydrogen bu iyoo ndi mmadu, o bu ndi isi ochichi nke Weastern Cape ka odi n`aka

iweputa iwu onodi mbughari ulo oru a ebe otutu ndi muizenberg tumadi ndi ogbe nke Vryground tinyere marina da gama amaghi udi ajoo ikuku no chere ha nwere ohilee anya na ana ewuru ha "Science Park" na
agbanyegi enwere n`ime onwa iri na abuo.
Nani n' ime afo abuo gaara-aga ka onye isi ozuzu aturu umu chineke nke ulo uka Anglican ma buru kwa onye isi oche inuru okwu ubiam nke South Afrika bu Archbishop Njongonkulu Ndungane juru ihe ejiri
ewunye umu ajoo ulo oru ngo mgbe nile ebe umu ogbenye bigasi na amataghi uche ha, n' ituputa umu amuma mmeghari iwu nke nhiwe Capricorn banyere oru nta n' uzu n' umu oru nyocha ajoo ulo oru ngo ndi
otu a mere ka odoo anya na mgbe odi n' ihu tumadi ebe odi mkpa, aga anabata atumatu nke oha na eze na iwaghide oru ngo a nani otu nche-kwa ndu oke ohia na gburu-gburu nke South Afrika.

Putara ihe ime ka odoo anya akwukwo nabata nwunye umu obere ulo oru ngo" Science Park" nwere mbinye aka n' ime akwukwo nnabata nwunye ulo oriri n' onunu ulo ahia na ezumike, site n' udi mgbanwoe
di otu a, oha na eze kwuru na atooala ukpuru nwunye umu ulo oru ngo ojoo di otu a .
Site na –ajoo ikuku chlorine a, nchoputa na –egosi na otutu puku kuru puku n'ime nde mmadu na ekuru ikuku a nwere nsogbu. N'ime iri onodi otu nde, na ebuwe, ahu ojoo na nsogbu ekuru ikuku oma kwa
okara awa. Akwukwo nnupu isi bu otutu umu ihe nwere ike itoghepu anwuru chlorine a di ukwu ma di
ojoo n'ime obodo vrygrond. Ntooghepu anwuru hydrogen n'ulo nchedo ya nwere ike ibu oku ogbugba nwere ike ibu obere nsogbu mmebi ihe.

Oru ndi otu oru mmepe obodo mere ka odo anya na ulo Coptic fibre nwere ntooghepu nwa obere anwuru chlorine, ebe ikuku ndi ozo nwere ike igbari ya. Ndi otu kansul a ehiwela ndi otu okacha-mara ime
nchoputa banyere onodi anwuru chlorine, hydrogen na nitrogen ana eweputa ha na nsogbu enwere ebe nchedo ubara ya no.
Mail and Guardian

UNDP Ekwueala Ka Enwe Nwa Ohere Mbelata Ukpa N'ubiam 11mins. 57sec.
Obu ezi okwu na ekwekoritaala ibeelata oke ukpa n'ubiam dika isi okwu eji aka na nzuko ogbako nke afo puku abuo n'ime afo 2015 idi okara, ma ekwesiri ileeba anya karia onodi aku n'uba iji nabata amuma nke

oha na eze dika osiri meetuta uwa nile bu onu mmiri okwu onye UNDP Administrator bu Mark Malloch Brown. Otu onye n'ime mmadu ise. Ijeri n'uma abuo ndi ikom, lnyom na umuntakiri mmadu bi na ukpa
nke bu out dolla kwa ubochi. Nkea nnukwu nsogbu.
Iri percent abuo n'onu ogu nke etiti mba uwa bu ogbonye di okpukpu iri na ano aturu anya onwu n'umuntakiri karia iri percent abuo ndi ogaranya. Ubiam n'umu oru ya oria ogbaghara enweghi ike ipu n'etiti mba uwa.
Nkea ga emetute ndi mba uwa bara-aba. Enwere mkpochapu umu agha, anya ukwu, iwe n'onuma, mgbasa nje n'oria mmikpo.

Anyi ga na echeta na ubiam kariri enweghi ego na-akpa. Nkea bu inapu oke nwere onwe, umu onodi, enweghi nchekwube mgbe odi n'ihu. Nkea bu okwu onye Administrator a. 4
4 Page 5 6
5
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
Uzo ihe ato ka aga agbado ukwu, Nke gunyere azumahia nhatanha, okwuru ma rutukwa aka na ebe onu ahia manuala riri elu n'ime aho gara-aga, n'umu onu ahia ihe dika coffee, timber na manu aku bekee ji iri
percent ano wee daa bu nke ga enwe nnukwu nsogbu ebe obodo ndi ahu na etoolite-etoolite no. Obodo ndi bara-uba na eme ka odiwanye njoo site na ikpochi onodi ozuma-ahia ha tumadi ebe ngwa ihe oru ubi
n'umu ihe ndi eji ekwe akwa no. Obodo ndi nke na emepe-emepe nwere ohere inwe iri ijeri dolla abuo kwa afo ma oburu na iweepu obere ego n'umu ihe oru ubi. Obodo ndi nke bara-uba, Ekwekoritala iweepu
ubochi umu ihe isi-ike banyere itu mgbere ahia nyere obodo iri ano n'itolu na etoolite-etolite.
Nkea abuo ya, bu na-aga akpachapu anya banyere inwe nnukwu mmasi ebe ego ndi isi Ocha no. Brown
mara okwa, na ego nyepu otu afo ga-ebu nsogbu umu obodo ndi nke dara ogbonye kwesiri ileebaghari anya n'umu aku ime ulo ndiahu onwere, ndi dika mmawaputa okpuru-kpu onu ego nwunye onu ulo obibi

ha na mbawanye umu obere ahia mgbede. Nke ato bu igba umu obodo ndia daara mgbenye iwaghide usoro oru nta n'uzo na ebuwe maka oganihu ha isonye n'etiti mba uwa n'usoro aku n'uba ha. Ozo kwa ya
bu Igba-kwu ume banyere ogwugwo umu oria ndia dika, lba, ukwara nta na oria mmikpo bu nke otutu
obodo nwegoro oganihu banyere ha.

UNDP bu ndi isi na otu UN banyere ubiam ji nwayo atu amuma bu igba bu okwu ndumodu ebe usoro ochichi onye kwue uche ya no, usoro onodi azuma ahia na ozi gbasatara nta n'uzu. Ihe ozo otu UNDP na
gba ndiom ume, nche-kwa gburu-gburu, maka Ichi-kwa onwe ha banyere ibu agha mkpochapu ubiam. Umu
ntule a na ndumodu a tumadi ebe ometulere oha na eze ikwalite onwe di nnukwu mkpa.

Onye nnukwu ode akwukwo nke otuUN, na odi nsoa, hiwere otu nke nwere aka ochie chiburu mba Mexico bu president Zedillo dika onye isi oche, nkea gunye kwara ode akwukwo nchedo ego nke US bu
Rubin dika out onye n'ime otua, ogwara ha ituputa amuma nkwado ego nke metulere etiti onodi nzuko
uwa nile. Ha nwere ike iyi aja n'ukwu n'umu omuma ochie ndi ha nwere iji nweta nzube ha. Brown mere ka odoo anya na ezi oku kwesiri ezi ugwo. Onwere olilee anya n'oburu na ndi uwa enye aka ezi oku ebe

obodo Ndiahu dara mgbenye no, ma gbanwoe umu ufodi ihe dika osiri kwue n'umu nzube ya, na Onwere nche-kwube na olilee anya na-agha banyere mkpochapu ubiam ga bu ihe aga enwe nturu ugo mmeri.
Pan African News Agency

Onweghi Onye Matara Ka O Na Di Mgbe Inweghi Nchekwube 11mins. 22secs. N'oge uhuruchi nke onwe Dizemba afo ano gara-aga, Ncele kgadima kpochidere onwe ya n'ulo mkpochi
na obere ime obosara ala Ga-Maribana, Moletji nke Kietersburg Northern Provinci. Nnukwu nwanyi a di ime gbara iri afo abuo muru nwa n'ebe n'esi nnukwu isi ma juo oke oyi n'ulo mkpochi nke na adighi mma.
Ojeewara. Nwa obere nwa Nwoke a di ndu ka agwochara nwa obere ahu oyi n'ulo ogwu, ma nyefe ya n'aka onye Ezi nlekota anya. Ma nwa obere nne ya ka amara ikpe igbu ochu gosiri ida iwu gbasatara
Nleeghara nwa anya. N'ime onwa Okutoba afo gara-aga kariri afo ato ojiri daa iwua ka Aturu Kgadima mkporo afo ato.

N'ime owa Jenuwari afo 1997, ndi uwe ojii kpoturu ulo ya na Laudium nokeetere Pritoria juo ya ajuju ,okwetere na otufuru nwa ya. Akpochiri emesia ana ya n'aka ebe onu Ego R500 ma gwa ya iputa ihe n'uo
ikpe izuka abuo n'ihu. Omefuru otutu onu ego banyere ugbo ala Taxi iga Pretoria, ma ikpa a banyere afo abuo ya. Ma mgbe eji yigharia ya ikpe a nke ugboro asa n'ime afo 1998, Kgadima kpebiri n'ime Muo ya
na ya agaghi agazi ulo ikpe ozo. Okwetere na ya dara iwu a, ma kedu ihe ka ji nkita onwu bu ihe gbagwojuru
ya anya. Ozo kwa ya bu na odighi aghota ihe nile nke Ekpere n'ikpe, ebe odighi onye nke n'akowara ya. Onye oka iwu ya na –agwa ya okwu site na aka onye ona aruru oru. Ka okwusiri ibia ulo ikpe, ezipuru

ugbo ala ndi uwe oji gara kechie ya. 5
5 Page 6 7
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
6
Mana Kgadima nwere oke n'usoro iwu ochichi obodo banyere ikpe ekpebiri na egbughi oge. Onwe kwara oke ite ime. Nkea bu n'uzo iwepu afo ime nke ona achoghi Act of 1996. Nwanyi obula nwere ikikere iga
n'ulo ogwu nke goomenti nwe ma weepu Kwa afo ime nke onachoogh. Mana otutu oge ndi lnyom anaghi acho igbu oge n'usoro oru ndi a. Ufodu ndi lnyom na amaghi na esi uzo ozo etinye ndu ha n'ihe iyi
egwu. Mana ndi dika Kgadima nwetere onwe ha n'ulo mkporo maka igbu ochu. Otutu umuntakiri ka onwu
ha jeedebere n'ulo ozu nke gomenti.

N'ulo ikpe, onye oka iwu nke gbara aka ebe ochu ya kwuru na Kgadima enweghi muo nne na nna. Mana ihe nke ulo ikpe enweghi ohere nuru bu nleeghara anya, oke ubiam enwghi ohere muta na echiche akwughi
out mere Kgadima jiri choo ka nwa omuru ohuru nwuo. Nne nke ya hapuru ya bu onye owere dika onye
amumua. Ebe ihe kgadima mere na ndu ya nile bu azachisiri ndi mmadu ulo iji wee zuo nwa ya.

Onwere onye nke di iri afo asa na asatro akporo "Ouma" Rosima Josiah di afo asaa, selina di afo iri tinyere umu ya abou .

N'ulo ikpe onye oka iwunke kwulitere onu ya, kwuru ka elee anya na onye ya agaghi akwukwo bu nke nwere ike ibutere ihe mgbu di ukwuu.
Ma Magistrate egeghi ya nti. Imatara nke oma na nwa amuru ohuu enweghi ike ipu n'ime onu ahu ma iwuru ahu apia dika onweghi ihe mernu. Kedu uzo ojoo ka nke inwu onwu bu ihe ogwara Kgadima. Ma
ihe kachasi meetute ndi mmadu bu na onabatara mmehie ya ma gosiputa kwa ya n'ihu ya. Mana mgbe ndi oru enyem aka Obodo kporo ya ka okuru kwa nwa mgbe aka na ekpe ya ikpe ojuru aju. Onweghi onye
ma ka o na di mgbe ego adighi, enweghi nchekwube, dika odi'm ugbua bu nke ezi okwu okwuru n'Onuma. Nkea abughi ezi aha ya.
Mail and Guardian.

Inyiom Di-kwa Mkpa 10mins. Oke umuntakiri agaghi ezu oke maoburu n'usoro ahu ike nke na odi mma ha abughi ihe akpachapum anya.
Inyiom n'ime ndu ha n'uzo nile di iche iche na gbambo nkwalite odi mma n'usoro muta, ozuzo obere azumahia n'umu uzo ndi ozo di iche iche dika enye m aka ebe ndi agburu na etolite – etolite no. Inyiom ndi
nke no na nria-nria, aguu, mkpagbu ha na nkeechapu nwere ikikere izulite umu ha n'uzo di ogoo. Ogbako nke etiti uwa n'ime afo 1990 nabatara udoo mmekorita ahu nke di n'etiti nne na nwa. Ekwuru mkpa odi
inwe oke nhatanha n'umu ihe eji atu ndu mmanu bu mmepe nke ekwekoritara n'afo 1979, bu mgbe ndi out nnukwu ogbako nke UN jiri kpochapu nkeewa n'etiti nwoke na nwanyi.

Ka mgbe afo 1990, uru obara iweta na mmechi umu ngwa oru ndiahu mghidere Inyiom dika oke agburu maka mmepe na udo ka no na aputa ihe n'ogbako UN declaration, n'umu ogbako ndi enwegasiri dika oke
nwere onwe na Vienna na afo 1993, Ogbako agum onu isi nke cario afo 1994, Nzuko ogbako Beijing afo 1995 na nsota ya na New York afo 2000. Na agbanyegi umu ihe ndia nle nke UNICEF, UNFPA n'ulo
oba ego nke etiti mba na UNDP na eme kwa afo aka nwere umu ihe iyi egwu na egosi na aka nwere
nkeewa n'etiti usoro ahu ike na nche kwa ndi nne. Oburu na ndi nne enweghi ohere ikeete oke, ozuzu umu aka ga bu ihe siri ike. Nwata obula ga-adi ndu, new muta ma oburu na nne ya gbasiri ike ma new muta. Ezi

onodu imu nwa, nri oma na muta di nnukwu mkpa maka odi mma ndi nine, nke ga enye aka nzulite umu aka ha n'uzo di ogoo mgbe ha ka di obere.

Obu ihe joogburu onwe ya, na agbanyegi umu ohe ndia nile nke ejiri kwado mmepe obodo n'etiti mba Uwa, ndi isi ochichi, ndi Omebe iwu, ndi Mmepe obodo gbachiri nkiti ka oburu out uzo ka ego si aputa.
Nkea na egosi ibi ezi ndu nwata kwesiri imalite nke oma n'ime ndu ya. Enweghi nkeewa nke di n'etiti nne 6
6 Page 7 8
7
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
na nwa. Onodu umu aka nke etiti mba Uwa n'ime afo 2001 gbadoro ukwu na agbata afo mgbe amuru wee rue afo ato. O di mkpa akwukwo ozi a leeba anya n'odi mma nke ndi nne maka Nzulite umuntakiri.
Atumatu isi ochichi obula ga bu itinye n'usor iwu ha amuma usoro muta makaa umu nwanyi ka ha new ike ileekota onwe ha anya mgbe ha di ime. Umu Nwoke kwesiri ijee ozuzu banyere etu esi eleekota nwanyi di
ime anya tinyere nwa nke oga amu. Abia na onodu umu aka nke ndi nne ha gaara mkporo, Gomenti
kwesiri ileekota ndi nne nke di ime wee ga mkporo ha na ndi nne nke umu ha ka di obere daara iwu metutere Obodo. Ha kwesiri igba mbo hu na nne na nna agaghi mkporo. Igba ndi nne ume bu nkwalite

onodu obibi ndu umuntakiri. All African. com.

Na Sierra-leone Ndi Ebere Ukwu Ma Obu 11mins. 9secs. Enwela Enyem Aka Oru.
Ndi nile bu ndi nke ejiri agha meghide ochichi wee bee otu aka ma obu ukwu si mba Sierra-Leone ka ndi otu oru nke etiti mba Uwa na enye onodu oru nhazi otutu ndi si mba Guinea alooghachi azu. Mmadu ato bu
nwoke abuo na otu nwanyi na aru oru ha na ndi otu International Organisation for Migration [IOM] inye
aka nhazi umu nlooghachi azu umu afo Sierra-Leone si Freetown bu isi obodo.

Otu onye n'ime ha bu Mohammed Bah gbara iri afo abuo n'ise malitere oru n'onwa gara-aga. Bah si koidu ime obodo kono bu ebe oruburu oru dika omezi isi. N'onwa Eperelu nke afo 1998 ndu ya gbanwere

mgbe ndi agha meghide ochichi gbupuru ya otu aka. Ogwara Chanzy ndu ya. Atara ya ahuhu n'ihi na ya akwadoghi ha. Ndia dika ndi isi na ezughi oke mana ekeele diri Chineke na ndu foro m. Ka nkea meechara
agaliri m gaa ime obodo akporo Yengema bu ebe dibia bekee n'ahu maka ndi agha West African
Peacekeeping Force [ECOMOG] gworo M umu onya. Ebe a ka M siri gba oso ndu gba jee Kono ma noro na Waterloo Camp. Bu ebe ndi oso ndu nke si Freetown gba jeere. N'abali isii nke onwa Jenuwari

afo 1999, ndi agha meghide ochichi buru agha bute n'isi obodo a, bu ebe ano gbagbue nna m n'agha. Otutu onwa ka Mohammed Bah no na acho oru ma odiri ya mf ma otu. Irio aririo nwere nwa obere ohere,
ebe ndi dika anyi bu ndi nke ajuru-aju. O bu ihe itu n'anya mgbe agwara m na ngga enwete oru. O bu ihe
itu n'anya, iba uru ma nye kwara ime obodo aka. Site n'onu ego otu Puku Leones nke putarra Dolla asa nke US na enweta kwa ubochi enwere ike ileeko Umunne m ario ndi nwoke na nwanyi anya.

N'ime okara onwa Jenuwari, IOM Freetown enyela karatu Bangura oru. Nne umu ato gbara iri afo n'ise na azu ahia na Kamaguay, obodo di otu nari n'iri itolu ebe Freetown no. N'abali isii nke onwa Seputemba
afo 1998 ka ozutere mgbube aka ya. Ndi oru Red Cross nke ime obodo kpojeere na Freetown, ma di ya laghachiri azu na Kamaguay ibute ufodu ibu ha jiri biri. Nkea ahu bu anya ikpeazu ohuru di ya. Nani ihe
foro Karatu bu umu ato omuru. N'ime onwa Jenuwari afo 1999, ndi agha mmeghide ochichi buru agha na Freetown, Karatu gbara oso ndu si Sierra-Leone gbafee Guinea. Mana olooghachiri azu na obodo ya
ghasara-aghasa. Onwetere onwe ya na obodo Murray bu ebe ndi ebere ahu no. Ndu ebe ahu bu ihe kuru afo n'ala. Ike gwuru ya. Osiri ike ileekota umu ndi omuru.

Na mbido afo, Karatu nuru n'onu ndi oru mgbata oso ndu na ndi IOM na ew ndi mmadu n'onodu oru iru oru n'odu ugbo mmiri. Na mba eneghi olilee anya inirete onodu oru ebe ahu. Ma out enyim na-aru oru na
Red Cross gbara m ume itinye akwukwo. E jeere m, o wee buru ihe itu na anya na IOM were m. Oru m wee buru ihu na ezin'ulo obula nke looghachiri azu di na out ebe edoobere ha ka ha si na ugbo mmiri ritue.
Isi mbu na obi Karatu oge ugbua bu inye umuntakiri ya ezi muta. Onwere mmasi nke ukwu ihu na enyere onodu oru di out a. Obu nwanyi mbu ndi out mba Uwa were n'onodi oru ebere ahu.

N'ime okara onwa gara-aga, obodo Murray na ezee nari Mmadu ato n'iri ato ebe ha chedoro onwe ha na ezi n'ulo ha. Ndi nile nke agha mmeghide a metutere ka no alooghachi azu na obere na obere.
IOM 7
7 Page 8 9
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
8
Mgbanwoe Chi-ekere Uwa Ga Eri Nari Ijeri 6mins. 16secs.
Dolla Ato Kwa Afo
Akwukwo ozi nke anyi ji aka na ekwu na ekpom oku nke etiti mba uwa ga eri ijeri kuru ijeri dollas ma

oburu na agbaghi mbo igbochi anwuru Carbon dioxide n'umu anwuru ndi ozo nke nwere ikikere "Green House" aputa. Akwukwo ozi nke si n'aka ndi n'shorans nke out UN banyere amuma gburu-gburu [UNEP]
na ekwu na otutu umu ihe ndi nke na ala n'iyi n'ihi umu ikuku muo obosara ala dika etu ihe siri kwuru, na
emebi oku azu, oru ubi na mmiri onunu ga eri onu ego di Nari ijeri ato na ano dolla n'uma abuo kwa afo.

N'ufodu umu Steetis di nta dika Maldives, Marshall Islands na Federated Steetis nke Micronesia, akwukwo ozi a jikoro mgbanwoe chi ekene uwa ga enwe ike n'ime afo 2050 ga akari iri percent nke Gross Domestic
Product [GDP]. Na ntunye okwu ya Klaus Teopfer ji okwa Executive Director nke UNEP kwuru na obu
mgba ka aga amalite oru. Anyi ga agba mbo ihu na ebelatara amuma nke ga esi na Greenhouse puta. Mbelata aka ezughi oke. Uwa ebinyela aka n'ime akwukwo imata olee mmadu ga etinye, mgbanwoe chi-ekere

uwa maka otutu afo umu ulo oru ngo ndi nke na ezipu umu anwuru nyere obodo ndi nke na etoolite etoolite.

Toepfer mere ka amata na ozi nke si n'aka Inter Governmental Panel banyere chi-ekere uwa [IPCC] nwere nkwado UNEP na World Meteorological Organisation ekwueala okwu bayere nkea. Onodu nzukop
a nwere Puku nde Puku ndi oru Sayensi si n'etiti mba uwa kwenyere na temperature nke uwa nwere ike iri ebe 1.4 na 5.8 degrees Centigrade n'oga n'ihu afo otu nari.

Anyi kwesiri izoosi ike maka oru nta n'uzu maka ikwado onwe anyi maka mgbanwoe onodu ogoo Osimmiri mmiri ozuzo na ekpom oku nke etiti bu onu mmiri okwu Toepfer. Okwuru na odi nnukwu mkpa obodo nile
imalite okwu mgbanwoe na ebe okwesiri na Hague n'ime afo 2000, ka umu obodo new ike igba ukwu mbu izoo ma belata nzipu umu anwuru.
Pan African News Agency

Ezi Mgbanwoe N'oru Mgbasa Ozi 4mins. 50secs. Kabral Blay-Amihere bu onye ndi oru nta akuko nke odida anyanwu Africa [WAJA] amala okwa nyere
ndi oru nta akuko ikpachapu anya banyere ezi enyi nke di n'etiti gomenti ha na ha. Okwuru na ebe ndi oru nta akuko kwadoro mgbanwoe, na onweghi ahihia nke ga ekpuchi ha bu ndi nta akuko mgbe isi ochichi
daara mba imejuputa ebum na obi. O bu n'ihe nguputa nke isi okwu ya bu "Ezi mgbanwoe n'oru mgbasa ozi" ka ono kwue nkea, bu Nzuko onodi ndi out oru nta akuko nke Ghana [GJA] hiwere isi na Accra, o
bu ebe ahu ka aghoputara mmadu asa bu ndi isi ino na oche rue afo abuo odi n'ihu.
Gomenti kwesiri imata na ochichi nke enyere ha abughi oku nwata na agba ngada anya. Onye isi oche nke
otu ndi oru [WAJA] kpokuru ndi oru nta akuko ka ha ghara ibu mma ihu abuo kama ezi onye nche obodo. Oyoro ndi oru nta akuko nke mba Ghana ikwado kwa ochichi President Kufuor. Okwuru ka okagbue

ufodu umu iwu ndiahu di ana ma nabata Freetown of Information Act.
Oriaku Gifty Affenyi – Dadzie bu onye isi oche GTA kwuru na oha na eze na amata ikikere ndi oru nta akuko bu nke ga enyere ha aka iri elu oji n'onodu oru ha. Okwuru na ha ga ikee nkwuchaa banyere inwe

afo ojuju ma gba mbo irusi oru ha ike mgbe nile, site na ijide ogoo oru ha. Oriaku Gifty Affenyi-Daazie
kwuru na GJA ga ehiwe otu ndi oru nche maka idaa iwu oru ha.

GJA so n'ime otu ano ndi oru nta akuko nke odida anyanwu Africa nwere nkwado onu ego nke si mba Europe aha otu International Federation of Journalists.

Accra Mail. 8
8 Page 9 10
9
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
Ndi Nobel Laureates Ekwuela Okwu Banyere 3mins. 16secs.
Ndi Oru Nta Akuko Inwere Oke Nwere Onwe
Mmadu abuo ji abuba ugo Nobel Laureates bu Tibetan Spiritual Leader Dalai na Bharat Ratan Amartya

Sen, agwala ndi oru nta akuko iji mkpisi aka oru nke nwere onwe hazie umu echi-che ndi mmadu nwere na uwa kwesiri ibu otu. Mmadu abuo a, kwuru okwu n'onodi oke Nzuko nke iri ise etiti mba uwa nwere ha
International Press Institute [IPI] nwere.
Dalai Lama kwuru na uwa akwurula nke onwe ya ebe echi-che ndi mmadu ka no na agba ochie. Okwuru na ndi oru nta akuko kwesiri iji oke nwere onwe ha wee weeta udo n'etiti umu mmadu. Mazi Sen, kwuru
na oke nwere onwe nke ndi oru nta akuko dika anwunta ifeeba n'ime ulo mmadu . Oke nwere onwe nyere ohere onye obula ikwu uche ya. N'usoro ochichi onye kwue uche ya nkea na egbochi uriwu.

Dalai Lama kwuru na muta enweghi ike igbasa ma enweghi oke nwere onwe nke ndi oru nta akuko. Ndi oru nta akuko nwere ikikere ime nyocha, ndi isi ulo uka, ndi isi otu ndoro-ndoro ochichi ma tinyere ndi
nturu ugo nobel Laureates. The Independent [Baujul].

Rawlings Buzi Onye Nkwuchite Okwu Ndi Otu Oke Nke Ndi Nwere Onwe 5mins. 39secs. Sharon Capeling-Alakija, ji okwa Executive Co-ordinator nke out UN Volunteers [UNV] ekwueala na
emere aka ochie chiburu Mba Ghana bu President Jerry Rawlings onye gbara okpuru kpu n'etiti otu UN maka oke ndi nwere onwe n'ihi amuma nke onwere ebe onodu a no. Ozo kwa bu na anyi choro onye
mara ekwu okwu ma gbasie ike dika Rawlings igwa ndi mmadu udi agwa ha ga atufu ma o bu leeghara anya maka izere onwe ha n'oria Iba na na Nje oria Mmikpo bu onu mmiri okwu nke ndi otu UN na Accra.
Ozo kwa ya bu na Rawlings igosiputa uche ya banyere oria iba mgbe o no na oche ochichi nke mba Ghana.

Ugbua onwere ohere iru oru a bu nzube Capeling Alakija. Okwuru na nkea abughi onodi oru n'etiti otu UN mana o bu ohere Rawlings ibu agha ebe oria iba n'umu Nje n'oria Mmikpo no n'usoro sara mbara.
Dika onodi ntu ala siri kwuru anyi nwere olilee anya ya ibu agha mkpochapu umu uzo oria abuo ndia bu Iba n'oria mmikpo. Alakija kwuru na Rawlings ga ebu usoro amuma ndi otu oke nwere onwe a, n'etiti Afrika
ha na etiti mba uwa n'usoro amuma UNAIDS.
Okwuru na omalitere oru na mkpuru abali ise nke onwa Februwari ma ga n'ihu irughide ya wee rue ngwucha afo a bu mgbe onwere ike inabata iru kwa ya ozo. Site n'onodu a, oga agwa ndi otu nta akuko
nke mba uwa okwu ha na ufodi ime obodo etu enwere ike iji wee kpochapu oria iba n'oria mmikpo. Pan African News Agency.

Nchekwaba Abaala Enyo Foto Mmeghari 6mins. 27secs.
Anyi ijikooo oganihu nke mmadu n'ime nche ndu oke oria bu nzube onye Film director amuru na mba South Africa bu Elarine Protctor n'ihi ngosi eyno foto ya akporo "Kin". Isi okwu ya bu ileeru anya ala

n'etiti umu ihe nche na oke nwere onwe nke ndi ime obodo ma nye aka nghazie ya diak osiri kwuru na Nambia. Akuko a bu maka Anna, nwa no na uju ndu nche-kwa umu ndu oke oria bu n'ime obodo nke
Nambia. Ha na nwanne ya nwoke bu Marius, Anna buru agha iche kwa umu enyi ala na anuwa mmiri na
olulu mmiri ya kwa abali. Enyi ala a bu umu nne na nna nyere Anna na Marius karia ndi Himba nke bi na ogbe a ako oru ugbo. Onye ozs bu Mmadu bu onye oru nke si mba Amerika na oru na obodo a. Site na

njide nke ejidere otu onye Himba na egbuwe umu anu ndia, obibi ndu Anna gbanwore. Nkea nyere ya nnukwu nsogbu ighota nke oma. 9
9 Page 10 11
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
10
Dika Proctor siri deeputa n'akwukwo y, Anna nwere ihunanya ebe onye obia no bu nke nyere ya aka imata otutu ihe -"Kiri"-dika uzo mmezi. Usoro nke obodo ji nwayo na ihe mgbu aga.
Proctor choro ka ihe ngosi a new ihu mere ojiri wee na eji umu afo obodo ahu eme ya, nke gunyere ndi Himba igosiputa onwe ha. O bu site na ibi ndu ha ka Kiri jiri new mgborogwu.
Ihe ngosi enyo a, gwara ogwa aka otu ndoro ndoro ochichi nke gosiputara umu ihe mgbagwoju anya hiwere isi na mba South Afrika oge ugbua. Ngwucha na atu uche. Kiri na egosi na mmadu kwesiri ibi
n'udo ha na umu chi-ekere uwa na udo n'onu, ozo kwa ya bu ibi n'a udo ha na mmadu ibe ya. IPS.

N'azu Umuntakiri 3mins. 29secs. Ndi otu nnochite anya nke United Nations High Commission for Refugees ha na Save the Children Fund
Alliance weeputala akwukwo usoro amuma ha bu nke leebara anya n'ihe gbasalara umuntakiri bu ndi nke ebi-hapuru ebichapu choro izere ndu na mba Europe. Akwukwo a nyochasiri onodi ndi otu mba iri n'ise
nke EU na Norway ma tuputa amuma usoro nke metutere mba Europe na obodo ndi ozo. Usoro amuma a chedoro umuntakiri na ndi ntorobia gbara afo iri na asato wee gbadata bigasi n'etiti obodo ndiahu na
abughi ebe amuma ha ndi nke na enweghi nne na nna ma obu ndi n'leekota anya, ozo kwa ya wee buru ndi nke gbapuru na obodo ha izere meghide, nnapu oke nwere onwe, ogboo ogu ha na enweghi ezi nche kwa,
itu ahia mgbere mmekoo nke nwoke na nwanyi ma obu oke ubiam.
Dika ndi out UNHCR siri kwue, umuntakiri ndia ebihapuru ebihapu na choo izeere ndu enweghi usoro iwu
nke chekwara ha maobu ezi nleekota anya. N'etiti onodu mba Europe, okwu a enweghi ezi usoro omebe iwu maobu iwu, ebe usoro oka iwu banyere nke a, bu nnukwu nsogbu. Nke a mere akwukwo amuma a jiri

choo mmepe na mgbasoro umu ezi usoro iwu n'etiti mba Europe ha etiti obodo ndi ozo. The Courier

Ohere Onodi Mba Afrika N'etit Kansul Ndi Otu Nche 8mins. 22secs. O bu ezi okwu na enwere onodi nzuko bu nke leebara anya n'ihe banyere ubioam n'etiti mba uwa nile, n'a
abali isii wee rue abali asato nke onwa itolu n'ime afo 2000, ma ohere ububo meghari otu United Nations inabata mgbanwoe no na aga n'ihu n'etiti uwa gbasoro ihe nke aturu anya n'etiti obodo nile. N'inabate
mba Turalu, onye nke otu nari, iri asato n'itolu okwesiri imeghari umu mkpebi oru aka nke Lakhdar Brahimi jibu okwa minista banye ako nke mba Algerie tuputara otu UN. Akwukwo ozi a bu nke ndi isi
ochichi obodo di iche-che nabatara nyere ohere nruta uka mgbati kwu onodi otu Kansul ndi nche bu nke
na ahu ihe banyere okwu udo.

Africa ichoo onodi n'etiti ime out a, ndi isi nke nkeji uwa a nwere olilee anya mbawanye onodi ya ebe UN no, enweghi nruta okwu banyere inweta enyem, aka a. N'ime afo 1945, bu mgbe ekeeputara otu UN, uzo

ato n'ime ndi otu a, enweghi ochichi nwere onwe ebe onu ogugu agum onu isi nke mba etiti mba uwa di ijeri abuo n'uma isi. Ma ubochi taaa odi ijeri isii. Nani nkeji Afrika di nari nde asa onu ogugu mmadu ma di kwa
obodo iri ise na ato n'ime out mba out nari iri asato n'itolu no n'ime UN. Ihe kariri ajuju uzo ato ana
akpawa ububo ya n'etiti ime otu a gbasatara mba Africa. Ufodu huru agwa eji enwe mkpebi umu okwu ndi a igbanwoe n'usoro ohuru maka inwe ezi onodi. Kedu etu na onye nke oburu na ewere amuma ya ga

bu? Ajuju a ka nkeji mba Africa mere ka amata enweghi nsogbu. Nkea onwere ike ibu na out mba Africa nke putara ihe n'onodi Nzuko nke out OAU n'ime onwa Julai ga anabata otutu umu ihe metutere mba
Africa n'etiti mba uwa nile?.
Ndi isi obodo di iche-iche kpara ububo nkwado onu ego, ulo oru nke ndi agha n'umu usoro amuma digasi
iche-iche nyere out Uninwe ike iru oru ha nke oma tumadi n'ihe banyere okwu udo no. E nwere otutu onodi nzuko di iche-iche tinyere mekorita ahu nwanne na nwanne n'etiti ndi isi ochichi obodo n'umu okwu 10
10 Page 11 12
11
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
tara akpu, ichoo uzo okwu udo n'umu nsogbu ndi a. Ka onodi nzuko a na abia n'isi mmechi, out okpuru-kpu ajuju no na onu onye obula, ma umu ezi amuma ndi a bu ndi nke anabatara n'onodi nzuko nke Millenium
a ma aga emejuputa kwa ya? Etu obula osi di, obu ezi okwu n'udi onodi nzuko di out a, umu mkpebi nile n'enwe usoro okwu ndoro-ndoro ndi nke na emebe ya.
The Courier

Okwu Ahuru Anya
Ikpe Nkwum Otoo Nyere Umuntakiri Sierra Leone 10mins. 40secs. Ndi out panel nke mere nyocha usoro aka oru nke mba Liberia gbasatara iji ola Diamond n'udi umu egbe
etisasi etiti odida anyanwu nke Africa ewetala umu nchoputa ha n'isi mmechi. Charles Taylor nke mba
Liberia bu ebe isi umu ihe iyi egwu asi. Umu nchoputa nile a bu nke si n'aka ndi out onodi umuntakiri na emetute na obi ha na oha na eze si mba Sierra Leone gbara na anwu dika onyinye keresimesi. Out a choro

ka amachie njem nile gbasatara ugbo elu ha Njem udi obula n'oge ochichi Liberia ugbu a. Ka am achie mbubata ola diamond isi mba Liberia ka amachie mgbere ahia umu osisi. Nkea ka ekwenyere ga eme ka
ozi a weeta na mmechi ndi nile nke bu ndi oshi Liberia ji okwu ndoro-ndoro ochichi eme mpu kwachie.
Nchoputa n'umu atumatu nile a nke otu panel a choputa ra nyere aka ikwuwa otoo usoro ntisa nile nke Charles Taylor nwere nkwado obodo Libya, Cote D'Ivoire, Burkina Faso na ndi isi abaa okpu nke etiti
mba uwa imalite ntisasi etiti odida anyanyu nke Africa n'usoro izoo okwu ndorondoro ochichi .o buru na awaghidere udi amuma a afo iri garaaga iri puku umuntakiri bu ndi nke si mba Liberia , Sierra leone ya na
Guinea gara ino ndu. Ma ekwenyere na oge agabeghi mmalite ikpughepu ihu muo n' uzo ochichi onye kwue uche ya.

Anyi keleere adi otu Panel a nke oma . N'ime afo iri nke gara-aga ,ka onodi usoro okwu aku n'uba nile nke mba Liberia na Sierra-Leone kpuru afo n'ala. Ndi oru ubi nile gbara oso ndu hapu ime obodo ha izere
ndu ebe amaa akwu ha erimeri . Oriaku Sadako Ogata bu onye High Kommission nke UHNCR na apuapu, achoputala na oburu na amawa putaghi onodi isi na ihe mberede akwukwo nke onwe, nsogbu
n'agha ga abawanye. Ezi okwu no ime ya bu ikeewaputa onodi kariri olilee anya nke isi ochichi oge ugbua, ebe otutu ha ka ha zoo ndi ha na abughi udi ha bu na uche bu nro njoo. Nkea mere ndi oha na eze nke etiti
mba uwa na agbanyegi ndaghachi azu ya bu otu uoz nnukwu olilee anya.
Ndi nile nke na ekwu okwu meghidere iwu osu, mana etinye okwu agba ochie na n' umu iwu ndia ga emetute umu ogbenye, kwesiri ileeba anya ebe Liberia na Taylor no na agbanyegi umu aku n'uba nke
onwere na obodo a. Emmechieala otu ulo ogwu enwere. Ndi dibia bekee iri abuo n'ise enwere nani ano enwere tupu azoo ochichi. Umu oru nke gomenti na enyewa alooghachila azu n'onodi odibu na mbu mgbe
ndi isi ocha no n'ochichi. Ulo oru okwu ego enweghi ugbo ala, n'ihi ya onweghi ike ikwu ugwo onwa nyere ndi oru nile nke na anoghi n'isi obodo bu Monrovia. Ndi oru nke no n'ise obodo na enwe akwukwo ego
cheque ha ma ego anoghi n'ulo oba ego. N'ikpe azu umu akwukwo ego cheque a ka ndi otu obu oru ha igbanwoe ego na anara na ibe na ego omuru nwa buru ibu.

Umu ihe ndia nile na emezu na nwoke nuru iyi iji US dolla mere ezi onu ego nke mba Liberia, kwere umuntakiri nkwa igwe computer na otu na otu ma oku Latric ono ma onoghi, mmiri maobu oche n'ulo
akwukwo tinyere umu ihe ndi ozo. Ozo kwa bu iju umuntakiri Sierra-Leone, ihe bu afufu, kedu afufu kariri inapu nwa afo ise aka n'ukwu n'aha nruzi obodo –Taylor RUF kwere nkwa. Nchoputa na umu nkpebi
nke otu Panel bu nke emejuputara nwere ike inye umuntakiri Sierra-Leone ohere ichi ochi. Anyi leere anya ma nwe nchekwube n'umu ihe nchoputa ndia na etinyere ya. Onu na egbu anyi ka mmanya.
Abridged Editorial from The Perspective 11
11 Page 12 13
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
12
Ihe E Deturu Ala
Algeria E Nwela Ala Mmiri Ohuu 2mins. 33secs. Mba Algeria edeebala ala mmiri ndi ohuu di iri, n'onodi usoro mkpa dika igbasoro emume ala di mma nke
etiti uwa nile na afo a, otutu ebe n'etiti ala unwu ndia, ndida obodo gunyere Iheri Valley [ILLUZI Region] Gueltates Swamps nke Isskarassene [Tamanraset] na Chott Merouane, Oued Khrout [EL-Oued], Ould
Oasises tinyere Tamentile na Sid Ahmed Timmi [Adrar] Ugbua Algeria nwere ala mmiri iri na ato bu ndi
nke toozuru ogoo onodi etiti mba uwa malite na Puku hecter ise wee rue otu nde, nari asato n'iri isii obosara ala hecters, ma obu eweere tinyere obosara ala nke mba US dika etu ndi otu ego nche kwa ndu

oke ohia nke etiti uwa siri chee.
Emmume ubochi ala mmiri nke etiti mba uwa nile emere na Algerias nwere nturu ugo asambodo ala mmiri
ohuu iri bu ndi nke enwere na Algeria. AllAfrican. com

Nwata Nwoke Nke Oria Mmikpo Ji Aka Ojoo Agbala Afo Iri Na-abuo. 3mins. 6secs. Obere nwa South Afrika bu Nkosi Johnson agbaala afo iri na –abuo nkea bu ihe oru. Nwa obere nwata
Nwoke gbaru muo otutu nde mmdu n'etiti mba uwa, no na utee nrianria na Johnnesburg na enweghi oganihu n'ahu. Amuru Nkosi ha na HIV positive kubere n'ime onwa Dizemba n'ihi nje n'oria mmikpo nke
metutere uburu ha na oria ofufe.
Ihe dika nari mmdu abuo bu ndi nke oria mmikpo a mere enweghi nne na nna n'otutu ndi ozo bu nje n'aria
mmikpo zukoro oku oriri na onunu Johnson Nkosi na Melpark Primari skuul di na Merille bu ebe oturu akwukwo standard four n'ime afo gara – aga.

O bu n' otu ulo akwukwo a n'ime afo 1997 ka nwata nwoke a putara ihe mbu n'ihu oha n'eze bu mgbe nne na nna gbara mbo ikwusi ya mbanye ulo akwukwo n'ihi nje n'oria mmikpo a.
Ihe eji echetakari Johnson Nkosi bu ikwuru n'ihu oha mmadu bu nnukwu ogbako kachasinu banyere oria mmikpo na Durban n'ime afo gara-aga, wee kpokue onye isi ochichi nke mba south
Africa bu president Ihabo Mbeki inabata ka ndiom di ime na-anu ogwu AZT na enye aka ebeeleta nje oria mmikpo a.
Africa online

Ngalaba Umuntakiri
Kumbo na Mhisi 12mins. 7secs. Onwere otu nwoke ha na nwunye ya biri otutu afo n'otu ime obodo tinyere nwa ya nwoke bu Kumbo. Otu
mgbe nne na nna kpebiri ibighari n'ime obodo ozo, n'ihi na ha ebiela be ha otutu oge. Ha na nwa ha kpara
ububo a, ma obu ihe itu n'anya mgbe nwa anabataghi nkea. Unu jiri choo ihapu omaracha ulo a.

Ma gee nti nwa m bu okwu nne ya, anyi nwere ike iru onu ulo ozo dika nke a. Mbanu bu osisa nwata a, oburugodi na unu apuo, agam ano ebe a. Ma nne na nna ekpebieala ipu. Ike agwula ha ibi n'ulo ochie ha
wee choo ipu. Enwa ha nwoke kpebiri nke onwe ya. Ha nile kwenyere igbakee, ebe nne na nna buru ibu
ha jeewe ime obodo ohuru, ma Kumbo biri nani ya n'okpu ulo ochie. 12
12 Page 13 14
13
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
Ulo oru ohuru nne na nna ya eteghi aka ebe nne ya loghachiri n'ulo ochie wee malite gwawa Kumbo okwusi oh! agaghim ahapu ka aguu gbue nani otu mkpuru nwa m, n'ihi na m puru, agam na ebutere gi erimeri

kwa ubochi. l ga amata n'obu m na abia mgbe inuru m na aguu egwu a. Ni-vi-yi Kumbo
Ni-vi-yiKumbo O bu Kumbo?

Nkea bu nkwekorita ha abuo nne ya wee looghachie azu inye Kumbo erimeri kwa-ubochi. Otu ubochi Mhisi bu nkita ohia no ezu ike na out akuku ohia, huru ihe na emenu ma nu –kwa egwu a. Okwuru n'ime
muo ya Ah-ha ihem ga eme bu imu egwu a, nwata nwoke a –aburu nkem, iji wee mee ihe masiri m. A mam ihe m ga eji ezi nri oma a weemee. Mgbe nne Kumbo laara, Mhisi gaara n'ulo ahu wee guo out egwu a.
Ni-vi-yi Kumbo Ni-vi-yi Kumbo
O bu Kumbo?
Ka nwa a dina n'elu akwa ya, n'ime ulo omatara na nkea abughi olu nne ya. Ozo kwa ya bu na nne ya ka butere ya erimeri ubochi ma afo juru ya. O noro nwayo wee ruo mgbe ike gwuru Mhisi o wee puo.

Echi ya, otu ihe a mere, nwata nwoke wee tie mkpu ka onye efe, na ina egbu oge, onye osoro gi ya
buru. Amatara m na ibughi nne m, agaghi ekwe ka ibata ime ulo. Mhisi gba-kpuru ime ohia wee chee-echiche, iji wee mata uzo oga esi aba n'ime ulo a. Echi ya orutere tupu nne Kumbo abia, ma jiri ezi egwu

dika onwere ike. Ni-vi-yi Kumbo
Ni-vi-yi Kumbo
O bu Kumbo?

Na oge ugbua Kumbo na-atu anya nne ya, ebe aguu jisi ya ike. Na ikwu ezi okwu na enweghi ndidi aguu iri ihe, oche fuela nwa anu ohia no ka mgbe abali ato acho uzo ibata ime ulo. Ojiri oso bilie ma mmepe

uzo. Mhisi wee jide ya na-aka kpuputa ya ezi.
Oh, nkita ohia na nnukwu egwu. Kedu ebe anyi n'ejee. A nam eche nne m iweterem Erimeri. O ga no ebe a mgbe n'adighi anya.

Enyela nsogbu Kumbo bu ihe Mhisi zara ya, o bu nne gi zitere m. O bu ya zitere m ka m bia kpota gi.
Nkea mere Kumbo jiri no nwayo, Mhisi wee kporo ya wee baa obosara uzo no n'ime ohia. Tupu Kumbo
na –achoputa ihe na eme ya, Mhisi gburu ma ire ya. Chei Kumbo .ochere na nwata ka nne na nna mara ihe ma nupu isi na mkpebi okwu ha.

Shangani Folktales

Okwu Mmechi
Ufodu umu okpuru-kpu okwu na-adighi nchefu:
Banyere Mmepe
Enweghi mmepe nnochitere anya nnukwu ihe iyi egwu nyere udo. Ihe mbu bu ikpochapu ubiam, amaghi ihe umu oria ha na iweeputa umu mbu na obi onye obula idi ire bu nke hiwere isi oke nghatangha n'etiti ndi

lkom na Ndiom. Sam Nujoma
President of Namibia n'onodi Nzuko nke Millenium. 13
13 Page 14
March 2001 (Igbo) CHANGE Radio Vol. 11 No. 26
14
Banyere etiti mba uwa Ichoo ijide ohere nke etiti uwa, ebe iji otu mgbe anabata umu ihe, anyi ga-amuru ichi ochichi nke
oma ya na idi n'otu.
Kofi Anan
Secretary General of the UN of the Millennium Summit.
Banyere mmuta Muta abughi uzo igbanaha ukpa obodo kama ibuso ya agha.
Julius Nyerere.
Late President of Tanzania

Ma cheeta... Mma na esiwe n'ime muo, si kwa na muo ahu ike ha na ahu zuru oke.
Nawal El Sadaawai
Author, The Hidden Face of Eve. 14

Page Navigation Panel

1 2 3 4 5 6 7 8 9
10 11 12 13 14

 

© 2002 Communicating for Change. All Rights Reserved
Developed by George Mbuagbaw